Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Jenesis 1:1​—‘Na mbụ, Chineke Kere Eluigwe na Ụwa’

Jenesis 1:1​—‘Na mbụ, Chineke Kere Eluigwe na Ụwa’

 “Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa”​—Jenesis 1:​1, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Na mbu Chineke kere elu-igwe na uwa.”​—Jenesis 1:1, Bible Nsọ nke Union Version.

Ihe Jenesis 1:1 Pụtara

 Amaokwu mbụ a dị na Baịbụl mere ka eziokwu abụọ dị ezigbo mkpa doo anya. Nke mbụ bụ na “eluigwe na ụwa” nwere mmalite, nke abụọ abụrụ na ọ bụ Chineke kere ha.​—Mkpughe 4:11.

 Baịbụl agwaghị anyị mgbe Chineke kere eluigwe na ụwa ma ọ bụkwanụ otú o si kee ha. Ma, ọ gwara anyị na o ji ‘ike ya dị egwu na ume ya na-enweghị atụ kee ha.​—Aịzaya 40:26.

 Okwu Hibru a sụgharịrị “kere” si na ngwaa Hibru a na-eji akọwa ihe ọ bụ naanị Chineke nwere ike ime. a Ọ bụ naanị Jehova b Chineke ka a kpọrọ Onye Okike na Baịbụl.​—Aịzaya 42:5; 45:18.

Ihe Ndị Gbara Jenesis 1:1 Gburugburu

 Na Jenesis 1:​1, a malitere ịkọ banyere ihe dị iche iche e kere eke. Ọ bụ ihe a ka a kọrọ banyere ya na Jenesis isi nke 1 na isi nke 2. Malite na Jenesis 1:1 ruo 2:​4, Baịbụl kwuru ná nkenke otú Chineke si kee ụwa na ihe ndị dị ndụ dị n’ime ya, ma nwoke ma nwaanyị mbụ o kere. Mgbe Baịbụl kwutụchara banyere ihe ndị a ná nkenke, ọ kọwakwuziri otú e si kee nwoke na nwaanyị ahụ.​—Jenesis 2:​7-25.

 Akwụkwọ Jenesis kwuru na Chineke ji “ụbọchị” isii kee ihe dị iche iche o kere. Ụbọchị ndị ahụ abụghị ụbọchị nkịtị na-ewe awa iri abụọ na anọ, kama ụbọchị nke ọ bụla bụ oge a na-ekwughị otú ọ hà. N’eziokwu, “ụbọchị” nwere ike ịpụta oge karịrị awa iri abụọ na anọ. Ihe e kwuru na Jenesis 2:4 gosiri na ihe a bụ eziokwu. N’ebe ahụ, e ji okwu bụ́ “oge” na “ụbọchị” kọwaa oge o were Chineke ikecha ihe niile malite n’ụbọchị nke mbụ ruo n’ụbọchị nke isii. Otú e si kwuo ya yiri ka à ga-asị na ọ bụ n’otu “ụbọchị” ka Chineke kere ihe niile ahụ.

Ihe Ndị Na-abụghị Eziokwu Gbasara Jenesis 1:1

 Ụgha: Chineke kere eluigwe na ụwa puku afọ ole na ole gara aga.

 Eziokwu: Baịbụl agwaghị anyị hoo haa mgbe e kere eluigwe na ụwa. Ihe e kwuru na Jenesis 1:1 anaghị emegide ihe ndị ọkà mmụta sayensị kweere taa, nke bụ́ na ụwa anyị a anọọla ọtụtụ ijeri afọ. c

 Ụgha: Jenesis 1:1 gosiri na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu n’ihi na otú e si dee okwu Hibru a sụgharịrị “Chineke” n’amaokwu a na-egosi na ndị a na-ekwu maka ha karịrị otu onye.

 Eziokwu: Okwu Hibru a sụgharịrị “Chineke” bụ ‘Elo·himʹ. E dekwara ya ka à ga-asị na ọ naghị ekwu gbasara otu onye. Ma, ihe ọ na-ekwu abụghị gbasara ọnụ ọgụgụ. Kama, e ji otú ahụ e si dee ya na-akọwa na onye a na-ekwu maka ya dị ebube ma ọ bụ dị ike. Akwụkwọ bụ́ The New Catholic Encyclopedia kwuru na ngwaa ya na ‘Elo·himʹ, dị na Jenesis 1:1, na-esokarị aga na-egosi na ọ bụ otu onye ka a na-ekwu maka ya. N’ihi ya, otú ahụ e si dee ya ka à na-ekwu gbasara ọtụtụ ndị anaghị ekwu maka ọnụ ọgụgụ kama ọ na-ekwu maka ịdị ebube.”​—Second Edition, Mpịakọta nke 6, peeji nke 272.

Gụọ Jenesis isi 1 na ihe ndị e dere n’ala ala peeji nakwa ihe ndị e dere n’etiti peeji ya.

a E nwere ihe Baịbụl bụ́ HCSB Study Bible kwuru gbasara okwu a bụ́ “kere.” Ọ sịrị na ‘o nwetụbeghị mgbe e ji ngwaa Hibru bụ́ bara’ e dere n’amaokwu a, nke pụtara “ike ihe,” kọwaa ihe mmadụ na-eme. N’ihi ya, bara’ na-ekwu gbasara ihe ọ bụ naanị Chineke ga-emeli.’​— Peeji nke 7.

b Ezigbo aha Chineke bụ Jehova.​—Abụ Ọma 83:18.

c E nwere ihe akwụkwọ bụ́ The Expositor’s Bible Commentary kwuru gbasara okwu Hibru a sụgharịrị “na mbụ” ma ọ bụ “ná mmalite.” Ọ sịrị na okwu ahụ egosighị oge ihe a na-ekwu maka ya were.”​—Revised Edition, Mpịakọta nke I, peeji nke 51.