Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Ụmụaka Inwe Ekwentị Bụ́ Ọkpọka—Nke Mbụ: Nwa M Ò Kwesịrị Inwe Ekwentị Bụ́ Ọkpọka?

Ụmụaka Inwe Ekwentị Bụ́ Ọkpọka—Nke Mbụ: Nwa M Ò Kwesịrị Inwe Ekwentị Bụ́ Ọkpọka?

 Ọtụtụ ụmụaka nwere ekwentị bụ́ ọkpọka, a ọtụtụ n’ime ha na-ejikwa ekwentị ha abanye n’Ịntanet mgbe naanị ha nọ. Olee nsogbu dị n’ịhapụ nwa gị ka o nwee ekwentị bụ́ ọkpọka? Oleekwa uru ọ bara? Awa ole ka ha kwesịrị iji na-apị ekwentị n’ụbọchị?

 Ihe i kwesịrị ịma

 Uru Ụmụaka Inwe Ụdị Ekwentị A Bara

  •   Iji ya ama otú ụmụaka mere, obi iru ndị mụrụ ụmụ ala. Bethany, bụ́ nne nwere ụmụ abụọ na-eto eto kwuru, sị: “Ụwa anyị bi n’ime ya jọrọ njọ, n’ihi ya, ụmụaka kwesịrị inwe otú ha ga-esi na-agwa ndị mụrụ ha ihe ọ bụla merenụ.”

     Otu nne aha ya bụ Catherine kwukwara, sị: “Ụfọdụ ekwentị na-enwe ihe nwere ike inyere gị aka ịmata ebe nwa gị nọ. Ọ bụrụ na ọ na-anya ụgbọala, ihe ahụ nwedịrị ike inyere gị aka ịma otú ọ na-eferu n’ọsọ.”

  •   Ha ga na-eji ya eme ihe gbasara ụlọ akwụkwọ ha. Otu nne aha ya bụ Marie sịrị: “A na-ezitere ụmụaka ihe omume ha ga-anọ n’ụlọ mee n’ekwentị ma ọ bụ n’ozi iimel, ha na ndị nkụzi ha nwekwara ike isi n’ekwentị ma ọ bụ si n’ozi iimel na-ekwurịta okwu.”

 Nsogbu Dị n’Ụmụaka Inwe Ụdị Ekwentị A

  •   Ọ na-eri nnukwu oge. Ndị na-eto eto na-ejikarị ọtụtụ awa n’ụbọchị apị ekwentị ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị nne na nna, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na awa ole ha na-eji apị ekwentị ha n’ụbọchị na awa ole ha na ụmụ ha ji anọrị ma kwurịta okwu hà. Otu onye na-enye ndụmọdụ kwuru, sị: “Ọtụtụ ezinụlọ dịzi ka ebe ndị mmadụ bịara nnọkọ ma e nweghị onye na-agwa ibe ya okwu n’ihi na anya onye nke ọ bụla dị n’ekwentị ya.” b

  •   Iji ya ele ndị gba ọtọ. E nwere ndị chọpụtara na n’ọnwa ọ bụla, ihe karịrị ọkara n’ime ndị niile nọ n’afọ iri na ụma na-achọta ma lee ndị gba ọtọ. Ọ bụghị ihe ijuanya n’ihi na ekwentị emeela ka ile ndị gba ọtọ dị ezigbo mfe. Otu nna aha ya bụ William, onye nwere ụmụ abụọ na-eto eto kwuru, sị: “Ịhapụ nwatakịrị ka o nwee ekwentị bụ́ ọkpọka dị ka inye nwatakịrị ahụ ihe ọ ga-eji na-ele ndị gba ọtọ ebe ọ bụla ọ nọ.”

  •   Iji ya akpọrọ ihe gabiga oké. Ọtụtụ ndị anaghị eji ekwentị ha egwu egwu. O fuo, ha na-asị na ahụ́ na-agbakasị ha, na obi na-ajọ ha njọ, ma ọ bụdị na ha adaala ọrịa. Ụfọdụ ndị nne na nna na-ekwu na ụmụ ha na-emere ha ọnụ ọjọọ mgbe ọ bụla ha na-apị ekwentị ha. Carmen sịrị: “Mgbe ụfọdụ, m chọọ ịgwa nwa m okwu, ọ na-agbarụ ihu ma ọ bụ tamuwa ntamu n’ihi na ọ chọghị ihe ga-akwụsị ya ịpị ekwentị ya.”

  •   Nsogbu ndị ọzọ dị na ya. Nsogbu ndị ọzọ dị n’inwe ekwentị bụ́ ọkpọka bụ na e ji ya achọ mmadụ okwu ma ọ bụ akparị mmadụ n’Ịntanet, e jikwa ya eziga ihe iberiibe. Onye nwere ekwentị bụ́ ọkpọka nwekwara ike ịrịa ọrịa ụfọdụ n’ihi na ọ naghị anọ otú dị mma apị ekwentị ya ma ọ bụkwanụ n’ihi na ịpị ekwentị ya anaghị ekwe ya hie ụra nke ọma. Ụfọdụ ndị na-eto eto na-eji ihe dị n’ekwentị ha mmadụ na-agaghị enyo enyo zoo ihe ndị na-adịghị mma ha na-ele ka ndị mụrụ ha ghara ịhụ ya.

     Otu nna aha ya bụ Daniel, onye nwere otu nwa agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma sịrị: “Mmadụ inwe ekwentị bụ́ ọkpọka na-emepere ya ụzọ ịhụ ihe niile dị n’Ịntanet, ma ndị dị mma ma ndị na-adịghị mma.”

 Ajụjụ ndị i kwesịrị ịjụ onwe gị

  •   ‘Ekwentị bụ́ ọkpọka ọ̀ dị nwa m mkpa?

     Baịbụl kwuru, sị: “Onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.” (Ilu 14:15) N’ihi ihe a Baịbụl kwuru, jụọ onwe gị, sị:

     ‘Nwa m ò kwesịrị inwe ekwentị bụ́ ọkpọka maka na m ga-eji ya na-ama otú o mere ma ọ bụ maka uru ndị ọzọ? M̀ chebarala uru niile nakwa nsogbu niile dị na ya echiche? Ọ̀ ga-aka mma ka o nwee ụdị ekwentị ọzọ na-abụghị ọkpọka?’

     Otu nna aha ya bụ Todd kwuru, sị: “E nwere ụdị obere ekwentị ndị ọzọ ụmụaka nwere ike inwe. Gị na nwa gị nwere ike iji nke ọ bụla n’ime ha na-ezirịta ozi ma ọ bụ na-ekwurịta okwu. Ha dịkwa ezigbo ọnụ ala karịa ekwentị ndị bụ́ ọkpọka.”

  •   ‘Nwa m ọ̀ ga-emeli ihe dị na ya?’

     Baịbụl kwuru, sị: “Obi onye ma ihe na-eduga ya n’ezigbo ụzọ.” (Ekliziastis 10:2) N’ihi ihe a Baịbụl kwuru, jụọ onwe gị, sị:

     ‘Olee ihe mere obi ji sie m ike na m ga-atụkwasili nwa m obi? Olee otú mụ na ya si ekwurịta okwu ugbu a, ya bụ, ànyị na-ekwurịta okwu nke ọma? Nwa m ọ̀ na-ekwu eziokwu mgbe niile, dị ka ihe atụ, è nwere ụfọdụ ndị enyi ya ọ na-ezochiri m? Ọ hụ tiivi, kọmputa ma ọ bụ ngwá elektrọniks ndị ọzọ, ọ̀ na-ejide onwe ya?’ Otu nne aha ya bụ Serena sịrị: “Ekwentị bụ́ ọkpọka bara ezigbo uru ma ọ na-akpata ọtụtụ nsogbu. Chee echiche nke ọma iji chọpụta ma nwa gị ọ̀ ga-emeli ihe dị n’inwe ekwentị bụ́ ọkpọka.”

  •   ‘M̀ ga-emeli ihe dị na ya?’

     Baịbụl kwuru, sị: “Zụọ nwata ka o soro ụzọ o kwesịrị iso.” (Ilu 22:6) N’ihi ihe a Baịbụl kwuru, jụọ onwe gị, sị:

     ‘M̀ ma ihe ndị dị n’ekwentị nwa m nke ọma otú m ga-ejili ha akụziri ya ihe ndị nwere ike itinye ya ná nsogbu ka o nwee ike gbaara ha ọsọ? M̀ ma otú e si apịba ekwentị ahụ ebe ọ na-abụghị ihe niile ka ọ ga-ejili ya eme? Olee otú m ga-esi nyere ya aka ịma ihe ndị o kwesịrị iji ekwentị ahụ na-eme na ihe ndị ọ na-ekwesịghị iji ya na-eme?’ Daniel anyị kpọrọ aha na mbụ sịrị: “Ọtụtụ ndị nne na nna na-azụtara ụmụ ha ekwentị bụ́ ọkpọka ma gawara ụwa ha.”

 Nke bụ́ eziokwu: Ihe ga-eme ka ụmụaka jiri ekwentị bụ́ ọkpọka mee ihe bara uru bụ ịkụziri ha ihe ndị ha kwesịrị iji ya eme. Akwụkwọ bụ́ Indistractable kwuru, sị: “Ihe ndị e nwere ike iji ekwentị ndị bụ́ ọkpọka eme karịrị akarị, n’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ anya na ọ bụ naanị ihe bara uru ka ụmụ anyị ga-eji ha na-eme, karịchaa ma ọ bụrụ na ndị mụrụ ha achọghị ịma ihe ha ji ha na-eme.”

a N’isiokwu a, “ekwentị bụ́ ọkpọka” e kwuru gbasara ya bụ ekwentị e ji aga n’Ịntanet.

b O kwuru ihe a n’akwụkwọ bụ́ Disconnected, nke Thomas Kersting dere.