Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Nyere Nwa Gị Aka Ka Ọ Kpachara Anya n’Ịntanet

Nyere Nwa Gị Aka Ka Ọ Kpachara Anya n’Ịntanet

IHE NA-ECHEGBU GỊ

Ndị nta akụkọ na-ekwukarị na e nwere ndị na-eji Ịntanet akpa arụ. Ụfọdụ n’ime ndị ahụ na-ezigara ndị ọzọ ozi na-emenye ha ụjọ, ma ọ bụ rata ndị ha na ha ga-enwe mmekọahụ. Ha na-egwukwa ndị mmadụ wayo. N’ihi ya, ọ bụrụ na obi erughị gị ala na nwa gị na-aga n’Ịntanet, ụta adịghị gị.

Ma, i nwere ike inyere nwa gị aka ka ọ kpachara anya n’Ịntanet. Ka anyị buru ụzọ kwuo ihe i kwesịrị ịma gbasara Ịntanet.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ụmụaka na-eji ekwentị aga n’Ịntanet. Ọ dị mma ma ọ bụrụ na kọmputa unu dị n’ebe ọ ga-abụ onye mepee ya, mmadụ niile ana-ahụ ihe onye ahụ na-eme. Ma, ọ bụrụ na nwa gị nwere ekwentị e ji aga Ịntanet, ọ ga na-aga ya mgbe ọ bụla ọ chọrọ, ma ị̀ nọ ya ma ị nọghị ya.

Na ndị mmadụ na-enwe ihe mberede ụgbọala apụtaghị na ịnya ụgbọala adịghị mma. Otú ahụ ka ọ dị ịga n’Ịntanet. Ọ bụghị na ọ dịghị mma, kama nwa gị kwesịrị ịkpachara anya otú ahụ onye na-anya ụgbọala kwesịrị ịkpachara anya

Ụfọdụ ụmụaka na-anọte aka n’Ịntanet. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu kwuru, sị: “Anaghị m ejideli onwe m. Ọ na-abụ m gbanye kọmputa ka m jiri nkeji ise gụọ iimel m, mụ esizi ya lelewe fim ruo ọtụtụ awa.”

Ụmụaka nwere ike tinye ihe ha na-ekwesịghị itinye n’Ịntanet. Ndị ajọ mmadụ na-eji foto ụmụaka na-etinye n’Ịntanet na ihe ndị ọzọ ha na-edenye amata ma ebe ha bi ma ebe ha na-aga akwụkwọ ma mgbe mmadụ na-agaghị anọ n’ụlọ ha.

Ụfọdụ ụmụaka amaghị nsogbu ihe ha tinyere n’Ịntanet nwere ike ịkpatara ha. Ihe ọ bụla e tinyere n’Ịntanet anaghị apụ apụ. E nwere ike ịhụ ihe na-adịghị mma mmadụ dere ma ọ bụ foto na-adịghị mma onye ahụ tinyere mgbe ọtụtụ afọ gachara. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ mgbe onye chọrọ iwe mmadụ n’ọrụ na-achọ ịmata ụdị onye ọ chọrọ iwe n’ọrụ bụ, ka ọ ga-ahụ ihe ndị na-adịghị mma onye ahụ tinyere n’Ịntanet.

N’agbanyeghị ihe ndị a niile, cheta na mmadụ ịga n’Ịntanet abụghị ihe ọjọọ. Kama, nsogbu na-apụta ma ọ bụrụ na onye na-aga ya akpacharaghị anya.

 IHE I NWERE IKE IME

Kụziere nwa gị ihe ndị ka mkpa nakwa otú ọ ga-esi jiri oge ya na-eme ihe bara uru. Onye na-eto eto kwesịrị ịmụta na ya kwesịrị ibu ụzọ na-eme ihe ndị ka mkpa. Ọ bụ otu n’ime ihe ndị ga-enyere ya aka ịghọ mmadụ. Nwatakịrị na ndị ezinụlọ ha ịkparịta ụka, ịrụ ihe e nyere ha rụọ n’ụlọ akwụkwọ na ịrụ ọrụ dị n’ụlọ dị mkpa karịa igbu oge n’Ịntanet. Ọ bụrụ na nwa gị na-anọte aka n’Ịntanet, gwa ya mgbe ọ ga-eji na-aga ya na mgbe ọ ga-eji na-apụta. I nwekwara ike itinye ihe ga na-echetara ya na oge o kwesịrị imechi ya eruola.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Filipaị 1:10.

Kụziere nwa gị ka ọ na-echebara foto na ihe ọ na-ede echiche tupu o zipụ ha. Kụziere ya na tupu o zipụ ihe ọ bụla, ya jụọ onwe ya, sị: M dee ihe a, è nwere onye ọ ga-emebi obi? Onye hụ foto a m chọrọ itinye, olee ụdị onye ọ ga-asị na m bụ? M̀ ga-achọ ka papa m na mama m na ndị ọzọ torola eto hụ foto a ma ọ bụ ihe a m dere? Olee ụdị onye ha ga-asị na m bụ ma ha hụ ya? Olee ụdị anya m ga na-ele onye tinyere ụdị foto a ma ọ bụ dee ụdị ihe a?—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 10:23.

Kụziere nwa gị ihe mere ọ ga-eji na-akpachara anya. E nweghị otú ị ga-esi na-ahụ ihe niile nwa gị na-eme kwa ụbọchị. Ma, ọrụ gị abụghị ịna-agwa ya ihe ọ ga-eme na ihe ọ na-agaghị eme kama ọ bụ ka i nyere ya aka ‘ịzụ ikike nghọta ya azụ’ ka ọ ‘mata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.’ (Ndị Hibru 5:14) N’ihi ya, kama ịna-enye ya iwu ma ọ bụ na-agwa ya ahụhụ ị ga-ata ya ma o nupụrụ gị isi, nyere ya aka ka o jiri aka ya mata ihe dị mma na ihe na-adịghị mma. Olee ụdị mmadụ ọ chọrọ ịbụ? Olee ụdị àgwà ọ chọrọ ka e jiri mara ya? Nyere ya aka ka ọ mụta ịna-eme ihe dị mma, ya sọgodị ya ya bụrụ na gị na ya anọghị.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 3:21.

“Ụmụaka ma gbasara nkà na ụzụ ma ndị mụrụ ha ma gbasara otú ihe si aga ná ndụ”

Onye na-achọ ihe n’Ịntanet dị ka onye na-anya ụgbọala. N’agbanyeghị na onye ahụ ma anya ụgbọala, o kwesịrị ịkpachara anya. Ị̀ hụlanụ ihe mere ndị nne na nna ji kwesị inyere ụmụ ha aka? Ọ bụ ya mere otu nwoke ihe gbasara Ịntanet doro anya, aha ya bụ Parry Aftab, ji kwuo, sị: “Ụmụaka ma gbasara nkà na ụzụ ma ndị mụrụ ha ma gbasara otú ihe si aga ná ndụ.”