Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 69

Gebriel Eleta Meri

Gebriel Eleta Meri

Elizabet nwere otu onye ikwu bi n’obodo Nazaret nke dị na Galili. Aha ya bụ Meri. E nwere otu nwa okorobịa kwere ya nkwa na ya ga-alụ ya. A na-akpọ ya Josef, onye ọkwá nkà. Mgbe Elizabet dị ime ọnwa isii, mmụọ ozi Gebriel bịakwutere Meri. Ọ gwara ya, sị: ‘Ndeewo Meri. Jehova emerela gị ihe ọma.’ Ma, ọ ghọtaghị ihe ihe a Gebriel kwuru pụtara. O gwaziri ya, sị: ‘Ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke, ma gụọ ya Jizọs. Ọ ga-abụ Eze. Alaeze ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.’

Meri gwara ya, sị: ‘Ma, amaghị m nwoke. Olee otú m ga-esi mụọ nwa?’ Gebriel sịrị ya: ‘E nweghị ihe Jehova na-agaghị emeli. Mmụọ nsọ ga-abịakwasị gị, gị atụrụ ime mụọ nwa nwoke. Elizabet, onye ikwu gị dịkwa ime.’ Meri agwazie ya, sị: ‘Abụ m ohu Jehova. Ka ihe a i kwuru meere m dị ka i kwuru.’

Mgbe mmụọ ozi ahụ lawara, Meri gawara n’otu obodo dị n’ugwu ka ọ hụ Elizabet. Mgbe o rutere, kelee Elizabet, nwa Elizabet bu n’afọ wụliri elu. Elizabet jupụtara na mmụọ nsọ ma kwuo, sị: ‘Meri, Jehova agọziela gị. Ihe ọma meere m na nne Onyenwe m bịara n’ụlọ m.’ Meri gwara ya, sị: ‘Eji m obi m niile na-eto Jehova.’ Meri na Elizabet nọrọ ọnwa atọ tupu ya alaghachi Nazaret.

Mgbe Josef matara na Meri dị ime, ọ chọrọ ịgwa ya na ọ gaghị alụzi ya n’ihi na o chere na ọ bụ nwoke ọzọ tụwara ya ime. Ma, otu mmụọ ozi gwara ya okwu ná nrọ, sị: ‘Atụla ụjọ ịlụ Meri. O nweghị ihe ọjọọ o mere.’ Ọ bụ ya mere Josef ji lụọ Meri ma kpọrọ ya laa n’ụlọ ya.

“Jehova emewo ihe niile masịrị ya n’eluigwe na n’ụwa.”—Abụ Ọma 135:6