Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISI NKE 101

A Kpọọrọ Pọl Gaa Rom

A Kpọọrọ Pọl Gaa Rom

Mgbe Pọl gachara ebe dị iche iche kwusaa ozi ọma na nke ugboro atọ ya, ọ gara Jeruselem. Mgbe o ruru, e jidere ya ma tụọ ya mkpọrọ. N’otu abalị, ọ hụrụ ọhụụ. N’ọhụụ ahụ, Jizọs gwara ya, sị: ‘Ị ga-aga Rom zie ozi ọma.’ E si Jeruselem kpọga ya Sesaria. Pọl nọrọ afọ abụọ n’ụlọ mkpọrọ n’ebe ahụ. Mgbe Pọl na-azara ọnụ ya n’ihu Gọvanọ Festọs, ọ gwara ya, sị: ‘Achọrọ m ka Siza kpee m ikpe na Rom.’ Festọs gwara ya, sị: ‘Ebe ị chọrọ ka Siza kpee gị ikpe; ị ga-agakwuru Siza.’ E tinyere Pọl n’ụgbọ mmiri na-aga Rom. Ụmụnna abụọ aha ha bụ Luk na Arịstakọs sokwa ya gaa.

Mgbe ha nọ n’ụgbọ mmiri na-aga, oké ifufe malitere ife. O fegidere ruo ọtụtụ ụbọchị. Ndị niile nọ n’ụgbọ ahụ chere na ha ga-anwụ. Ma Pọl gwara ha, sị: ‘Otu mmụọ ozi gwara m ná nrọ, sị: “Atụla egwu, Pọl. Ị ga-eru Rom, o nweghịkwa ihe ga-eme onye ọ bụla nọ n’ụgbọ a.” Nweenụ obi ike. Anyị agaghị anwụ.’

Oké ifufe ahụ fegidere ruo abalị iri na anọ. Mgbe ha rutewere ebe ala dị n’agwaetiti Mọlta, ụgbọ ha tọrọ n’ájá ma kụrisịa. Ma, narị mmadụ abụọ na iri asaa na isii nọ n’ụgbọ ahụ pụtara n’enweghị ihe mere ha. Ụfọdụ gwuuru mmiri pụta, ndị ọzọ ejide ibé osisi ụgbọ ahụ aka, mmiri eburu ha pụta n’elu ala. Ndị Mọlta kwanyeere ha ọkụ ka ahụ́ kporo ha ọkụ, lekọtakwa ha nke ọma.

Mgbe ọnwa atọ gachara, ndị agha kpọ Pọl hà kpọọrọ ya banye n’ụgbọ mmiri ọzọ gawa Rom. Mgbe o rutere Rom, ụmụnna nọ ebe ahụ bịara hụ ya. Mgbe ọ hụrụ ha, o kelere Jehova, obi esiekwa ya ike. Ọ bụ eziokwu na e ji Pọl eji, a hapụrụ ya ka ọ nọrọ n’ụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya, onye agha ana-eche ya nche. Ọ nọrọ ebe ahụ afọ abụọ. Ndị mmadụ na-abịakwa ahụ ya, ya ana-ezi ha ozi ọma gbasara Alaeze Chineke, nakwa gbasara Jizọs. Pọl nọkwa ebe ahụ degara ọgbakọ dị iche iche dị n’Eshia Maịnọ nakwa na Judia akwụkwọ ozi. N’eziokwu, Jehova ji Pọl mee ka ozi ọma ruo ná mba dị iche iche.

“N’ụzọ niile, anyị na-eme ka a mata anyị dị ka ndị ozi Chineke, site n’ịtachi obi n’ọtụtụ ihe, ya bụ, site n’ịtachi obi ná mkpagbu, ịtachi obi ná mkpa, ịtachi obi n’ihe isi ike.”—2 Ndị Kọrịnt 6:4