Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NKEBI NKE 3

Mgbe Iwe Na-ewe Anyị n’Ihi na Anyị ‘Nwere Ihe Mere Anyị Ga-eji Mee Mkpesa’

Mgbe Iwe Na-ewe Anyị n’Ihi na Anyị ‘Nwere Ihe Mere Anyị Ga-eji Mee Mkpesa’

Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Linda kwuru, sị: “Otu nwanna nwaanyị nọ́ n’ọgbakọ anyị boro m ebubo na m zuuru ego ya. Ndị ọzọ nọ́ n’ọgbakọ anyị nụrụ ya, ụfọdụ dụnyekwaara ya ukwu. Mgbe e mechara, nwanna nwaanyị a bịara gwa m na ya amatala na ọ bụghị mụnwa zuuru ego ya. Ọ bụ eziokwu na ọ rịọrọ m mgbaghara, ma n’obi m, echeghị m na m ga-agbagharali ya n’ihi otú o si mechuo m ihu.”

ỤDỊ ihe a mere Linda ò metụla gị? Ihe ahụ e mere ya were ya ezigbo iwe. Ọ dị mwute na o nweela ụfọdụ ndị ụmụnna ha kpasuru iwe, ha ejiri maka ya lawa azụ n’ofufe Jehova. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gịnwa?

Ò Nwere Onye Ga-enweli Ike “Ikewapụ Anyị n’Ịhụnanya Chineke”?

Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike isiri anyị ike ịgbaghara nwanna anyị mejọrọ anyị. A sịdị kwuwe, Ndị Kraịst niile kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya. (Jọn 13:34, 35) Ọ na-akacha ewute anyị ma ọ bụrụ nwanna anyị mejọrọ anyị.—Abụ Ọma 55:12.

Baịbụl kwuru na e nwere mgbe nwanna nwere ike ime nwanna ibe ya ihe ọ “ga-eji mee mkpesa.” (Ndị Kọlọsi 3:13) E mee anyị ụdị ihe ahụ, ọ naghị adị mfe ịma ihe anyị kwesịrị ime. Ma, olee ihe nwere ike inyere anyị aka? Ka anyị leba anya n’ihe atọ Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka:

Nna anyị nke eluigwe maara ihe niile. Jehova na-ahụ ihe niile na-emenụ. Ọ na-ahụ mmegbu ọ bụla a na-emegbu anyị, na-ahụkwa nsogbu mmegbu ndị ahụ na-akpatara anyị. (Ndị Hibru 4:13) Ahụhụ anyị na-ata na-ewute ya. (Aịzaya 63:9) Jehova anaghị ekwe ka ‘nsogbu ma ọ bụ mkpagbu’ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ, ma ọ bụdị ohu ya ọzọ, ‘kewapụ anyị n’ịhụnanya ya.’ (Ndị Rom 8:35, 38, 39) Anyịnwa ekwesịghịkwa ikwe ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla kewapụ anyị n’ebe Jehova nọ.

Ịgbaghara mmejọ abụghị ịkwado ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na anyị agbaghara ndị mejọrọ anyị, ọ pụtaghị na anyị na-akwado ihe ọjọọ ahụ ha mere anyị ma ọ bụkwanụ na anyị na-ekwu na ihe ahụ ha mere adịchaghị njọ. Jehova anaghị akwado mmehie. Ma, cheta na ọ hụ ihe mere ọ ga-eji gbaghara onye mere mmehie, ọ na-agbaghara onye ahụ. (Abụ Ọma 103:12, 13; Habakọk 1:13) Mgbe Jehova na-agwa anyị ka anyị na-agbaghara ndị ọzọ, ọ pụtara na ọ na-agwa anyị ka anyị na-eṅomi ya. Jehova anaghị “anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 103:9; Matiu 6:14.

Anyị kwụsị iburu ndị ọzọ iwe n’obi, ọ ga-abara anyị uru. Olee otú ọ ga-esi baara anyị uru? Chebaragodị ihe atụ a echiche. Were ya na iji obere okwute n’aka ma gbatịa aka gị. Ebe ọ bụ na okwute ahụ adịchaghị arụ, ọ ga-adịrị gị mfe ijide ya ruo obere oge. Ma, ọ bụrụkwanụ na a sị gị jide ya ruo ogologo oge? Olee mgbe ị ga-ejiru ya ike agwụ gị? Ọ̀ bụ nkeji ole na ole, otu awa, ka ọ̀ bụ karịa? Nke bụ́ eziokwu bụ na aka ga-eji gị. Ma, ọ pụtaghị na okwute ahụ ebukwuola ibu. Kama, ka ị na-ejidekwu ya, ka ọ na-anyịkwu gị arụ n’aka. Otú ahụ ka ọ dịkwa ibu ihe mmadụ mere anyị n’obi. Ka anyị na-ebu ya n’obi, ka ọ na-anyịkwu anyị arụ, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ihe ahụ e mere anyị bụ obere ihe. Ọ bụ ya mere Jehova ji na-agba anyị ume ka anyị ghara ịna-ebu iwe n’obi. N’eziokwu, anyị kwụsị iburu mmadụ iwe n’obi, ọ ga-abara anyị uru.—Ilu 11:17.

Anyị kwụsị iburu ndị ọzọ iwe n’obi, ọ ga-abara anyị uru

“Ọ Dị M Nnọọ Ka Ọ̀ Bụ Jehova Ji Ọnụ Ya Na-Agwa M Ihe Ndị Ahụ”

Gịnị nyeere Linda anyị kwuru okwu ya ná mmalite aka ịkwụsị iburu nwanna ahụ mejọrọ ya iwe n’obi? Otu n’ime ihe ndị nyeere ya aka bụ na o chere echiche gbasara ihe ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru mere anyị kwesịrị iji na-agbaghara ndị ọzọ. (Abụ Ọma 130:3, 4) Otu nke kacha ruo ya n’obi bụ nke kwuru ihe gosiri na ọ bụrụ na anyị agbaghara ndị ọzọ, Jehova ga-agbagharakwa anyị. (Ndị Efesọs 4:32–5:2) Ihe ndị ahụ ọ gụrụ ruru ya n’obi. Ọ sịrị: “Ọ dị m nnọọ ka ọ̀ bụ Jehova ji ọnụ ya na-agwa m ihe ndị ahụ.”

Linda mechara kwụsị iburu nwanna nwaanyị ahụ iwe n’obi. O ji obi ya niile gbaghara ya, ha abụrụkwala ezigbo enyi ugbu a. Linda amalitekwala jiri obi ụtọ na-ejere Jehova ozi. Ka obi sie gị ike na Jehova chọkwara inyere gị aka ime ụdị ihe a Linda mere.