Joshụa 9:1-27

  • Ndị Gibiọn gosiri na ha ma ihe, gaa ha na ndị Izrel emee udo (1-15)

  • E mechara mata na ndị Gibiọn ghọrọ aghụghọ (16-21)

  • Ndị Gibiọn ga na-akpatara ndị Izrel nkụ, na-esetakwara ha mmiri (22-27)

9  Ndị eze niile bi n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan,+ na ndị nke bi n’ebe bụ́ ugwu ugwu, na ndị nke bi na Shefila,* na ndị nke bi n’akụkụ Oké Osimiri Mediterenian*+ nakwa ndị nke obodo ha na Lebanọn cherịtara ihu, nụrụ ihe ahụ merenụ. Ndị eze ndị a bụ: eze ndị Het, eze ndị Amọraịt, eze ndị Kenan, eze ndị Perizaịt, eze ndị Haịvaịt, na eze ndị Jebus.+  Mgbe ha nụrụ ya, ha gbakọrọ aka ka ha lụso Joshụa na ndị Izrel agha.+  Ndị Gibiọn+ nụkwara ihe Joshụa mere Jeriko+ na E-aị.+  N’ihi ya, ha kpara àgwà ndị ma ihe. Ha weere ihe oriri, tinye ya ná nkịrịka akpa, chịrịkwa karama akpụkpọ mmanya ndị merela ochie, ndị gbawara agbawa a dụkọtara adụkọta, dọkwasị ha n’elu jakị ha.  Ha yikwa akpụkpọ ụkwụ ndị merela ochie a dụkọtara adụkọta, nakwa nkịrịka uwe. Achịcha niile ha ji bụkwa achịcha kpọrọ nkụ, ha gbarikwara agbari.  Ha wee gakwuru Joshụa ebe ya na ndị Izrel mara ụlọikwuu na Gilgal+ ma gwa ha, sị: “Anyị si ebe dị anya bịa. Biko, ka anyị na unu gbaa ndụ.”  Ma, ndị Izrel gwara ndị Haịvaịt*+ ndị ahụ, sị: “O nwere ike ịbụ na unu bi anyị nso. Oleezi otú anyị na unu ga-esi agba ndụ?”+  Ha asị Joshụa: “Anyị bụ ndị ohu gị.” Joshụa asị ha: “Ùnu bụ ole ndị? Oleekwa ebe unu si bịa?”  Ha asị ya: “Ndị ohu gị si ebe dị ezigbo anya bịa+ n’ihi aha Jehova bụ́ Chineke gị, maka na anyị anụla akụkọ ya, nụkwa ihe niile o mere n’Ijipt.+ 10  Anyị anụkwala ihe niile o mere eze abụọ ndị Amọraịt, ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ Osimiri Jọdan. Eze abụọ ahụ bụ Saịhọn+ eze Heshbọn na Ọg+ eze Beshan, onye nọ n’Ashtarọt. 11  Ọ bụ ya mere ndị okenye anyị na ndị niile bi n’ala anyị ji gwa anyị, sị, ‘Werenụ ihe unu ga-eri na njem a ma gakwuru ha. Sịkwanụ ha: “Anyị bụ ndị ohu unu.+ Biko, ka anyị na unu gbaa ndụ.” ’+ 12  Achịcha a anyị ji ka dị ọkụ mgbe anyị si n’ụlọ anyị were ya ka anyị bịa hụ unu ebe a. Ma ugbu a, ọ kpọọla nkụ, gbarisiekwa.+ 13  Karama akpụkpọ mmanya ndị a dịkwa ọhụrụ mgbe anyị gbajuru ha, ma ugbu a, ha agbawaala.+ Uwe anyị na akpụkpọ ụkwụ anyị ndị a akachaala n’ihi na ebe anyị si bịa dị ezigbo anya.” 14  Ndị Izrel weere ụfọdụ n’ime ihe oriri ha ka ha chọpụta ma hà dị otú ndị ahụ kwuru. Ma, ha ajụghị Jehova ase.+ 15  Ndị ahụ na Joshụa wee mee udo,+ gbaakwa ndụ ka ọ hapụ ha ndụ. Ndị isi nzukọ ahụ ṅụkwaara ha iyi.+ 16  Mgbe ụbọchị atọ gachara, ka ha na ha gbachara ndụ, ndị Izrel nụrụ na ha bi ha nso, bụrụkwa ndị agbata obi ha. 17  Ndị Izrel wee gawa n’obodo ndị ahụ n’ụbọchị nke atọ. Obodo ndị ahụ bụ Gibiọn,+ Kefaịra, Bierọt, na Kiriat-jierim.+ 18  Ma, ndị Izrel alụsoghị ha agha, n’ihi na ndị isi ha ji aha Jehova bụ́ Chineke Izrel ṅụọrọ ha iyi.+ Ha niile wee malite ịkatọ* ndị isi ha. 19  Ndị isi ahụ niile agwa ha, sị: “Ebe ọ bụ na anyị ejirila aha Jehova bụ́ Chineke Izrel ṅụọrọ ha iyi, anyị ekwesịghị ịkpa ha aka. 20  Ihe a ka anyị ga-eme: Anyị ga-ahapụ ha ndụ n’ihi iyi anyị ṅụụrụ ha, ka Chineke ghara iwesa anyị iwe.”+ 21  N’ihi nkwa ndị isi ahụ kwere ndị Gibiọn, ha gwakwara ndị Izrel, sị: “Hapụnụ ha ka ha dịrị ndụ. Ma, ọ bụ ha ga na-akpatara nzukọ a niile nkụ, na-esetakwara ha mmiri.” 22  Joshụa kpọziri ndị Gibiọn, sị ha: “Gịnị mere unu ji ghọọ anyị aghụghọ, sị, ‘Anyị si ebe dị ezigbo anya bịa,’ ebe anyị na unu gbara agbata obi?+ 23  Ana m abụ unu ọnụ na si ugbu a gawa,+ unu ga-agbagide ohu ruo mgbe ebighị ebi, na-akpata nkụ, na-esetakwa mmiri maka ụlọ Chineke m.” 24  Ha asị Joshụa: “Ọ bụ n’ihi na a gwara ndị ohu gị hoo haa na Jehova bụ́ Chineke gị nyere Mosis ohu ya iwu ka o nye unu ala a niile, laakwa ndị niile bi na ya n’iyi.+ Anyị tụrụ ụjọ na unu ga-egbu anyị.*+ Ọ bụkwa ya mere anyị ji mee ihe a.+ 25  Ugbu a, anyị nọ gị n’aka. Mee anyị ihe ọ bụla i chere dị mma ma zie ezie.” 26  Joshụa mekwara ihe dị mma ma zie ezie. Ọ napụtara ha n’aka ndị Izrel, ha egbughịkwa ha. 27  Ma n’ụbọchị ahụ, Joshụa gwara ha na ha ga na-akpata nkụ, na-esetakwa mmiri maka ndị Izrel niile+ nakwa maka ebe ịchụàjà Jehova, n’ebe ọ bụla Chineke họọrọ.+ Ọ bụkwa ihe a ka ha na-eme ruo taa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Oké Osimiri ahụ.”
Ma ọ bụ “n’ebe ugwu.”
N’oge ahụ, ọ bụ ndị Haịvaịt bi na Gibiọn.
Ma ọ bụ “ịtamu ntamu n’ihi.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi anyị.”