Rut 2:1-23

  • Rut gara ịtụtụ oko ọka ndị a hapụrụ ahapụ n’ubi Boaz (1-3)

  • Rut na Boaz hụrụ (4-16)

  • Rut kọọrọ Naomi ihe ọma Boaz meere ya (17-23)

2  E nwere onye ikwu di Naomi bara ezigbo ọgaranya. Aha ya bụ Boaz.+ Ya na Elimelek si n’otu ezinụlọ.  Rut, nwaanyị Moab, sịrị Naomi: “Biko, ka m gaa n’ubi. M hụ onye ihe m masịrị, m ga na-eso ya n’azụ na-atụtụ oko ọka bali ndị a hapụrụ ahapụ.”+ Naomi asị ya: “Gawa, nwa m.”  O wee gawa n’ubi, malitekwa ịtụtụ oko ọka bali ndị na-ewe ihe ubi hapụrụ. Ọ dabakwara na ọ banyere n’ubi Boaz,+ onye ya na Elimelek+ si n’otu ezinụlọ.  Boaz si Betlehem bịa n’ubi ya mgbe ahụ, ma sị ndị ahụ na-ewe ihe ubi: “Jehova nọnyere unu.” Ha asị ya: “Jehova gọziekwa gị.”  Boaz wee jụọ nwa okorobịa, bụ́ onyeisi ndị na-ewe ihe ubi, sị: “Olee ezinụlọ nwa agbọghọ a si?”  Nwa okorobịa ahụ, bụ́ onyeisi ndị na-ewe ihe ubi, asị: “Nwa agbọghọ a bụ nwaanyị Moab.+ O so Naomi si Moab lọta.+  Ọ sịrị, ‘Biko, ka m na-atụtụ+ oko* ọka bali e gbuturu egbutu ndị na-ewe ihe ubi hapụrụ.’ Ọ nọkwa na-arụ ọrụ kemgbe ụtụtụ ọ bịara ruo ugbu a ọ batara na ndò ka o zurutụ ike.”  Boaz gwaziri Rut, sị: “Gee ntị nwa m. Agala n’ubi onye ọzọ ịtụtụ oko ọka bali. Agakwala ebe ọzọ. Nọrọ ụmụ agbọghọ m nso.+  Anya gị dịrị n’ubi ha na-egbu ọka bali, na-esokwa ha. Agwala m ụmụ okorobịa a ka ha ghara imetụ gị aka.* Mmiri gụwa gị, gaa n’ite mmiri ụmụ okorobịa a gbanyere mmiri kuru mmiri ṅụọ.” 10  Rut wee gbuo ikpere n’ala, kpọọ isiala, sị ya: “Gịnị mere ihe m ji masị gị? Gịnịkwa mere anya gị ji ruo ebe m nọ, ebe m bụ onye mba ọzọ?”+ 11  Boaz asị ya: “A kọọrọla m ihe niile i meere nne di gị mgbe di gị nwụchara, nakwa otú i si hapụ nna gị na nne gị na ala ndị ikwu gị wee bịakwute ndị ị na-amabughị.+ 12  Ka Jehova kwụọ gị ụgwọ ihe ọma ndị i mere.+ Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel, onye ị gbabara n’okpuru nku ya, kwụọ gị ụgwọ ọrụ zuru ezu.”*+ 13  Rut wee sị: “Ka ihe m masị gị, onyenwe m, n’ihi na ị kasiela m obi. I kwuokwala okwu mesiri ohu gị obi ike,* n’agbanyeghị na esoghị m ná ndị na-ejere gị ozi.” 14  Boaz gwara ya n’oge ha na-eri nri, sị: “Bịa ebe a, were achịcha taa, surukwa achịcha gị n’ime mmanya.” Rut wee nọdụ ọdụ n’akụkụ ndị ahụ na-ewe ihe ubi, Boaz enye ya ụfọdụ ọka bali e ghere eghe.* Rut rijuru afọ, rifọkwa. 15  Mgbe o biliri ịga tụtụọ oko ọka bali ndị a hapụrụ ahapụ,+ Boaz gwara ụmụ okorobịa ya, sị: “Hapụnụ ya ka ọ na-atụtụkwa oko* ọka bali ndị unu gbuturu egbutu. Unu enyekwala ya nsogbu.+ 16  Hụkwanụ na unu dọpụtaara ya oko ọka ụfọdụ n’ùkwù ọka bali, hapụkwanụ ha ka ọ tụtụkọrọ ha. Unu agwakwala ya ihe ọ bụla ga-eme ka ọ kwụsị ịtụtụ ha.” 17  O wee na-atụtụ oko ọka bali n’ubi ruo mgbede.+ Mgbe o tichara ihe ọ tụtụkọtara, o ruru ihe dị ka otu efa* ọka bali. 18  O wee buru ya banye n’obodo. Nne di ya hụkwara ihe ọ tụtụkọtara. Rut wepụtakwara nri ahụ o rifọrọ+ mgbe o rijuchara afọ ma nye ya. 19  Nne di ya asị ya: “Olee ebe ị gara tụtụọ ọka bali taa? Oleekwa ebe ị rụrụ ọrụ? Ka onye anya ya ruru n’ebe ị nọ bụrụ onye a gọziri agọzi.”+ O wee gwa nne di ya onye ọ rụrụ ọrụ n’ubi ya. Ọ sịrị ya: “Aha onye m rụrụ ọrụ n’ubi ya taa bụ Boaz.” 20  Naomi wee sị nwunye nwa ya: “Ka Jehova, onye na-akwụsịtụbeghị ịhụ ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ n’anya,* gọzie ya.”+ Naomi sịkwara ya: “Nwoke ahụ bụ onye ikwu anyị.+ Ọ bụ otu n’ime ndị ga-agbara ihe anyị.”*+ 21  Rut nwaanyị Moab wee sị: “Ọ sịkwara m, ‘Na-eso ụmụ ọrụ m ruo mgbe ha wechara ihe ubi m niile.’”+ 22  Naomi gwaziri Rut nwunye nwa ya, sị: “Nwa m, ọ ka mma ka i soro ụmụ agbọghọ ya kama a ga-enyewe gị nsogbu n’ubi onye ọzọ.” 23  Rut wee na-eso ụmụ agbọghọ Boaz. Ọ nọkwa na-atụtụ oko ọka a hapụrụ n’ubi ruo mgbe owuwe ihe ubi ọka bali+ na owuwe ihe ubi ọka wit gwụchara. Ya na nne di ya bikwa.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “ùkwù.”
Ma ọ bụ “inye gị nsogbu.”
Ma ọ bụ “ụgwọ ọrụ zuru okè.”
Na Hibru, “ị gwala obi m okwu.”
Ma ọ bụ “ọka a ṅara n’ọkụ.”
O nwere ike ịbụ, “ùkwù.”
Efa bụ ihe e ji atụ̀ ihe. Otu efa bụ ihe dị ka lita 22. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “igosi ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “otu n’ime ndị ikwu anyị nwere ikike ịgbara ihe anyị.”