Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Halfpoint Images/Moment via Getty Images

NA-ECHENỤ NCHE!

Otu Nnukwu Onye Ọrụ Ahụ́ Ike Ekwuola na Ịntanet Nwere Ike Ịkpa Ndị Na-eto Eto Aka Ọjọọ​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Otu Nnukwu Onye Ọrụ Ahụ́ Ike Ekwuola na Ịntanet Nwere Ike Ịkpa Ndị Na-eto Eto Aka Ọjọọ​—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 N’abalị 23 n’ọnwa Mee afọ 2023, otu nnukwu onye ọrụ ahụ́ ike n’Amerịka gwara ọhaneze na ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet na-akpa ọtụtụ ndị na-eto eto aka ọjọọ.

  •   Ndị ọrụ ahụ́ ike n’Amerịka kwuru n’afọ 2023, sị: “Ọ bụ eziokwu na ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet nwere ike ịbara ụfọdụ ụmụaka na ndị na-eto eto uru, e nwere ọtụtụ ihe na-egosi na o nwekwara ike ịkpatara ha nsogbu ndị nwere ike ịkpa ụbụrụ ha ma ọ bụ ahụ́ ike ha aka ọjọọ.”

 Ndị ọrụ ahụ́ ike ahụ kwuru ụfọdụ ihe ndị a chọpụtarala mere na ihe a abụghị obere okwu.

  •   Ndị na-eto eto ndị nọ n’agbata afọ iri na abụọ na iri na ise, “ndị na-anọ ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet ihe karịrị awa atọ kwa ụbọchị nwere ike inwe nsogbu uche akpakọghị ọnụ karịa ndị ọzọ, ha nwere ike ịda mbà n’obi, na-echegbukwa onwe ha.”

  •   Ndị dị afọ iri na anọ “nọtee aka n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet, ọ na-eme ka ha ghara ịna-ehi ụra nke ọma, a ga na-achọ ha okwu n’Ịntanet, otú ha dị ga na-eme ha obi ọjọọ, ha ga na-eche na ha abaghị uru, obi ana-adakwa ha mbà. Ihe a niile na-akakwa eme ụmụ nwaanyị karịa ụmụ nwoke.”

 Olee otú ndị nne na nna ga-esi chebe ụmụ ha? Baịbụl kwuru ihe ha nwere ike ime.

Ihe ndị nne na nna nwere ike ime

 Na-elebara ụmụ gị anya. Ndị nne na nna, chebaranụ nsogbu ndị Ịntanet nwere ike ịkpatara ụmụ unu echiche, unu ekpebizie ma ùnu ga-ahapụ ha ka ha na-aga n’ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet.

 I kpebie na ị ga-ahapụ nwa gị ka ọ na-aga n’Ịntanet, na-echeta nsogbu ndị o nwere ike ịkpatara ya, na-elebakwa anya n’ihe ndị ọ na-eme ebe ahụ. Olee otú ị ga-esi eme ya?

 Ekwela ka nwa gị banye ebe na-ekwesịghị ekwesị. Kụziere nwa gị otú ọ ga-esi na-amata ebe ndị ọ na-ekwesịghị ịga n’Ịntanet na otú ọ ga-esi zere ha.

  •   Ihe Baịbụl kwuru: “Unu ekwula okwu ka ndị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha niile ma ọ bụ anyaukwu na-amasị. . . . Unu emekwala omume na-eme ihere ma ọ bụ kwuo okwu nzuzu ma ọ bụ okwu njakịrị rụrụ arụ.”​—Ndị Efesọs 5:3, 4.

  •   Ị chọọ ịhụ aro ndị ga-enyere gị aka ime ihe a, gụọ isiokwu bụ́: “Teaching Your Teenager Social Media Safety.”

 Tie iwu. Dị ka ihe atụ, gwa nwa gị oge ọ ga na-aga ebe a na-akparịta ụka n’Ịntanet na awa ole ọ ga-anọ ebe ahụ.