Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 È KERE YA EKE?

Ọnyà Ududo

Ọnyà Ududo

UDUDO a e sere ebe a na-anọ n’ụlọ. Ọ na-akpa ọnyà n’ahụ́ ájá, si n’elu ruo n’ala. Ebe elu ya na-esi ezigbo ike. Ebe ala ya anaghị esi ike. Ihe ebe elu ahụ jidere anaghị enwe ike ịgbapụ. Ma, ebe ala ya jide ihe, ọnyà ahụ na-adọbi segoo ihe ahụ elu. Olee otú ududo si akpa ọnyà ya, ebe elu sie ike ebe ala agaghị esi ike?

Ọnyà ududo: ebe siri ezigbo ike

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: Ududo chọọ ịkpado ọnyà ya n’ahụ́ ájá ma ọ bụ n’uko ụlọ, o nwere ihe na-anya anya ọ na-eji akpa ya. Ihe ahụ ga-eme ka o sie ezigbo ike ka ọ ga-abụ ihe ọ bụla na-efe efe gafee ebe ahụ, ya ejide ya. Ndị ọkachamara nọ n’otu mahadum dị n’Amerịka chọpụtara na ihe ududo ji akpa ebe ahụ na-adị n’ala dị iche na ihe o ji akpa ebe nke elu. Ọ na-akpa ebe nke ala otú ọ ga-adịrị ya mfe ịdọbi ka o nwee ike isere ihe ọnyà ahụ jidere gbagoo elu.

Ọnyà ududo: ebe na-esighị ike

E kwuru na ndị ọkachamara ahụ amalitela ilere ihe ahụ ududo ji akpa ọnyà ya anya na-arụ ihe na-anya anya nke ga-esi ezigbo ike ka ọnyà ududo. Ndị ọkà mmụta sayensị nwekwara nchekwube na ihe ahụ ga-enyere ha aka ịrụta bandeeji ga-esi ezigbo ike nakwa ihe ha ga-eji na-agba ọkpụkpụ.

Gịnị ka i chere? Ì chere na ududo nọkatara jiri aka ya na-akpa ọnyà ya otú ọ ga-esi ike n’elu ma ghara isi ike n’ala? Ka ì chere na e nwere onye kere ya?