Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Ihe Mere Mkpụrụ Osisi Pollia Berry Ji Acha Anụnụ Anụnụ | È kere Ya Eke?

Ihe Mere Mkpụrụ Osisi Pollia Berry Ji Acha Anụnụ Anụnụ | È kere Ya Eke?

POLLIA BERRY bụ mkpụrụ osisi na-acha anụnụ anụnụ dị n’Afrịka. Anụnụ anụnụ ya rọrọ arọ karịa nke mkpụrụ osisi ọ bụla ọzọ. Ma, o nweghị ihe dị na mkpụrụ osisi a mere o ji na-acha otú a. Gịnịzi mere o ji maa mma dị egwu otú ahụ?

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: Mkpo mkpụrụ osisi a nwere ọtụtụ ụmụ irighiri eriri dị ogologo ogologo. A haziri ha ka ha dịrị mbadamba. Otú ukwu nke ọ bụla na ukwu nke nọ ya n’okpuru si nọrọ dịtụ iche, nke mere ka ha dịrị gburugburu n’ile anya. Eriri ndị a n’onwe ha, a naghị acha anụnụ anụnụ, kama, ọ bụ otú ahụ nke ọ bụla si nọrọ otú dịtụ iche n’ibe ya mere ka ha na-acha anụnụ anụnụ. Ọ bụ otú eriri ndị ahụ si nọrọ ná mkpo mkpụrụ osisi a mere ka ha nwee ụcha ndị mara mma, na-agbanwe agbanwe. Otú i si nọrọ na-ele ha na-ekpebi ụdị ụcha ị ga-ahụ. Ụfọdụ n’ime ha ga na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, pink pink, ma ọ bụ odo odo. Ọ bụkwara na i leruo ha anya nke ọma, ị ga-achọpụta na ụcha ha a rọchaghị arọ otú i chere.

Ebe ọ bụ na ihe mere mkpụrụ osisi a ji na-acha anụnụ anụnụ esighị n’ime ya, ụcha ya na-adịgide ruo ogologo oge. O nweedịla ndị nke e wetara kemgbe ọtụtụ narị afọ ụcha ha ka dị ka nke mịpụtara ọhụrụ. Mkpụrụ osisi a bụ sọ mkpụrụ mkpụrụ, o nweghị ihe a ga-erite na ya. Ma, ndị na-eme nchọpụta sịrị na ọ na-adọta ụmụ nnụnụ ndị nọ ya gburugburu, ha a na-abịa n’ebe ọ nọ.

Ndị sayensị kweere na ihe mere mkpụrụ osisi Pollia Berry ji na-acha anụnụ anụnụ nwere ike inyere ha aka imepụta ink e ji esiji ihe na-agaghị na-achanwụ achanwụ nakwa akwụkwọ ndị na-agaghị ekwe ka ebipụta adịgboroja ha.

Gịnị Ka I Chere? Otú a mkpụrụ osisi a si na-acha anụnụ anụnụ na-egbuke egbuke, ò nọkatara dịrị ka è nwere onye kere ya otú ahụ?