TETA! Mee 2014 | Ànọ M Ndụ Eme Gịnị?—Ihe Atọ Mere Anyị Ga-eji Nọrọ Ndụ

Igbu onwe gị ọ̀ batatụla gị n’obi ka è nwere onye ị ma chọtụrụla igbu onwe ya? Ọ bụrụ na ị mata ihe mere ị ga-eji nọrọ ndụ, i nwere ike ịgbanwe echiche gị.

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Gụọ banyere ala ọma jijiji mere na Spen, ndị Chaịna na-aga elegharị anya, ndị na-ese sịga na Japan, otú e si machie wọtapruf na Mọrịtenia na ihe ndị ọzọ.

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA

Ihe Ị Ga-eme ma A Dụọ Gị Ọdụ

Olee otú mba a baara gị ya ewee gị iwe nwere ike isi baara gị uru?

ISIOKWU TETA! A

Ànọ M Ndụ Eme Gịnị?

Gịnị mere mmadụ ga-eji na-ekwu na ọnwụ kaara ya mma?

ISIOKWU TETA! A

Ihe Nwere Ike Ịgbanwe

Ọ bụrụgodị na ị gaghị emeli ka nsogbu gị bie, e nwere ihe ị ga-agbanweli.

ISIOKWU TETA! A

Enyemaka Dị

E nwere ihe atọ ga-enyere gị aka ịna-edi nsogbu gị.

ISIOKWU TETA! A

Olileanya Dị

Olileanya ga-enyere gị aka idi nsogbu bịara gị.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ego

Ego ọ̀ bụ mgbọrọgwụ ihe ọjọọ?

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA

Ị Hụwa Ihe Ị Na-atụghị Anya Ya n’Ebe Di Gị Nọ

Ike di gị ma ọ bụ nwunye gị ọ̀ gwụla gị? E nwere ihe ise nwere ike inyere unu aka.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ịkpa Ókè Agbụrụ

È nwere agbụrụ ka ibe ya? È nwere mgbe a ga-akwụsị ịkpa ókè agbụrụ?

È KERE YA EKE?

Ahụ́ Agwọ

Gịnị mere ahụ́ agwọ ji esi ike ka o nwee ike iji ya arị elu osisi bụ ogwu ogwu, jirikwa ya gwuo ọnụ n’ala?

Ihe Ndị Ọzọ Anyị Nwere

Papa Gị na Mama Gị Hà Chọrọ Ịgba Alụkwaghịm?

Olee ihe ga-eme ka ị ghara ibuwere papa gị na mama gị iwe n’obi?

Ihe Ndị Na-eto Eto Kwuru Gbasara Otú Mmadụ Dị

Gịnị mere o ji esiri ndị na-eto eto ike ịnabata otú ahụ́ ha dị? Gịnị ga-enyere ha aka?

Mgbe Mozis Na-eto n’Ijipt

Gịnị mere nne Mozis ji gaa dowe Mozis n’Osimiri Naịl? Jiri ihe a matakwuo banyere Mozis, ndị ezinụlọ ya, na ada Fero.