Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU TETA! A | ÀNỌ M NDỤ EME GỊNỊ?

Enyemaka Dị

Enyemaka Dị

“Na-atụkwasịnụ [Chineke] nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 PITA 5:7.

Mmadụ nwere ike chee na o nweghị ihe ya nọ ndụ eme ma ọ bụrụ na obi ya na-agwa ya na o nweghị ihe ọ ga-emeli ka nsogbu ya bie. Ka anyị kwuo ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka mgbe anyị nọ na nsogbu.

Ekpere. Ihe mere anyị ji kwesị ikpe ekpere abụghị ka anyị chefuo nsogbu bịaara anyị. Ọ bụghịkwa mgbe anyị na-amaghịzi ihe ọzọ anyị ga-eme ka anyị kwesịrị ikpe ekpere. Kama, ekpere bụ otú anyị si agwa Nna anyị hụrụ anyị n’anya otú obi dị anyị. Jehova chọrọ ka anyị na-agwa ya ihe dị anyị n’obi. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.” —Abụ Ọma 55:22.

Ọ ga-adị mma ka i kpee ekpere taa. Si n’ala ala obi gị gwa Chineke otú obi dị gị, kpọọkwa aha ya bụ́ Jehova ma i kpewe ekpere. (Abụ Ọma 62:8) Jehova chọrọ ka ị bụrụ enyi ya. (Aịzaya 55:6; Jems 2:23) Cheta na n’agbanyeghị ebe ị nọ, i nwere ike ikpe ekpere gwa Chineke ihe dị gị n’obi mgbe ọ bụla ọ sọrọ gị.

N’Amerịka, e nwere otu ụlọ ọrụ na-enyere ndị chọrọ igbu onwe ha aka ka ha ghara igbu onwe ha. Ụlọ ọrụ ahụ kwuru na nchọpụta ha mere gosiri na ọtụtụ n’ime ndị gburu onwe ha bụ ndị isi na-akpakọghị ọnụ. Ma, a chọpụtaghị ihe bụ́ nsogbu ha n’oge, e nyekwaghị ha ọgwụ gaara enyere ha aka.

Ndị hụrụ gị n’anya. Ndị ikwu gị na ndị enyi gị hụrụ gị n’anya. O nwekwara ike ịbụ na ha agwala gị na ihe gbasara gị na-emetụ ha n’obi. E nwekwara ndị ọzọ hụrụ gị n’anya ma ị hụtụbeghị ha. Dị ka ihe atụ, mgbe ụfọdụ Ndịàmà Jehova gaa izi ndị mmadụ ozi ọma, ha na-ahụ ndị ike ụwa gwụrụla ma ọ bụkwanụ ndị nke chọdịrị igbu onwe ha. Otú a Ndịàmà Jehova si aga ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ na-eme ka ha nwee ike ịna-enyere ụdị ndị ahụ aka. Jizọs hụrụ ndị mmadụ n’anya. Ndịàmà Jehova na-emekwa ka ya. Ha hụrụ mmadụ ibe ha n’anya, hụkwa gịnwa n’anya. —Jọn 13:35.

Ndị dọkịta. Oge ụfọdụ, ihe na-eme ka mmadụ chọọ igbu onwe ya nwere ike ịbụ na isi akpakọchaghị onye ahụ ọnụ n’ihi na obi na-ajọkarị ya njọ. Ihere ekwesịghị ịna-eme gị ma ọ bụrụ na obi na-adị na-ajọ gị njọ n’ihi na onye ọ bụla nwere ihe ya na ya na-alụ. Ụfọdụ ndị ekwuola na ọ bụrụ na obi na-adakarị mmadụ mbà ma ọ bụ na obi na-ajọkarị ya njọ na o nwere ike ịbụ ọrịa ka onye ahụ na-arịa. Onye ọ bụla nwere ike ịrịa ọrịa a. Ma, a na-agwọ ya agwọ. *

IHE Ị GA-EBURU N’UCHE: Ọkọ kọwa anụmanụ, ọ gakwuru osisi ma ọkọ kọwa mmadụ, ọ gakwuru mmadụ ibe ya. N’ihi ya, ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka ka ihe dịrị gị mma.

IHE I NWERE IKE IME: Gakwuru dọkịta ma nke a na-akọ n’ihe gbasara obi ịda mmadụ mbà ka o nyere gị aka.

^ para. 8 Ọ bụrụ na igbu onwe gị na-abatakarị gị n’obi, gbaa mbọ gaa hụ dọkịta bụ́ ọkachamara n’ihe gbasara obi ịda mmadụ mbà ka ọ gwa gị ihe ị ga-eme.