Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Ndịda Eshia

Ụlọ ọrụ na-elekọta ụmụ anụ bi n’ọhịa kwuru na malite n’afọ 1997 ruo afọ 2011, a hụrụ ọtụtụ osisi ọhụrụ na ọtụtụ ụmụ anụmanụ ọhụrụ n’ebe ndịda Eshia. A hụkwara otu ụdị ajụala anya ya na-acha ọbara ọbara. Ebe a hụrụ ihe ndị a dị nso na Kambodia, Laụs, Mianmaa, Taịland, Vietnam, na Chaịna. N’afọ 2011, a hụrụ ụdị osisi iri asatọ na abụọ, ụdị anụ na-akpụ akpụ iri abụọ na otu, ụdị azụ̀ iri na atọ na ụdị ụmụ anụmanụ ndị ọzọ dị iri.

Yurop

Otu akwụkwọ akụkọ a na-ebi na Rọshịa kwuru na a na-eji ndị mmadụ atụ mgbere n’ọtụtụ ebe na Yurop. Ụfọdụ n’ime ndị ahụ bụ akwụna ka ha ga-aga gbawa, ndị ọzọ ga-agbawa ohu. E nwekwara ndị nke a na-egbu ka e wee ree akụkụ ahụ́ ha. Ndị ndị omekome a na-enwetakarị bụ ndị dara ogbenye, ndị na-enweghị ọrụ nakwa ụmụ nwaanyị.

Niu Ziland

E nwere ndị mere nchọpụta gbasara ụmụaka ndị na-elekarị tiivi. Ha kwuru na ụmụaka ndị ahụ na-akpakarị àgwà ọjọọ ma ha tolitewe. Ihe a ha kwuru kwadoro ihe otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ụmụaka n’Amerịka kwuru. Ha sịrị na ụmụaka ekwesịghị ịna-ele tiivi karịa otu awa ma ọ bụ awa abụọ kwa ụbọchị.

Alaska

Ọtụtụ n’ime obodo ndị dị n’Alaska dị n’ikpere mmiri. Ọ bụ ya mere idei mmiri ji akpa ha aka ọjọọ. Nchọpụta e mere gosiri na ihe kacha eme ka ihe ka njọ bụ okpomọkụ. Otú ebe ahụ sizi ekpo ọkụ ugbu a na-eme ka aịs gaara egbochi idei mmiri na-agbaze, bụ́kwanụ ihe na-eme ka idei mmiri na-akpa mkpamkpa n’udu mmiri.

Ụwa niile

Kemgbe ụwa, ihe ndị na-enye ọkụ na-emetọ ikuku maka anwụrụ ọkụ ha na-akwụ. Ma n’oge na-adịbeghị anya, a malitere iji ihe ndị na-agaghị na-emetọ ikuku enye ọkụ, ihe ndị dị ka oké ifufe ma ọ bụ anyanwụ. N’agbanyeghị mbọ a niile a na-agba, otu nwaanyị aha ya bụ Maria van der Hoeven kwuru na ihe na-ebenụ ka na-ebekwa maka na ihe ndị ahụ na-emetọkwa ikuku.