Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU TETA! A

Gịnị Ka Ihe Ịgara Mmadụ Nke Ọma Pụtara?

Gịnị Ka Ihe Ịgara Mmadụ Nke Ọma Pụtara?

OBI anaghị adị onye ihe na-anaghị agara nke ọma mma. Ma, e nwere ihe dị njọ karịa ihe agaraghị mmadụ nke ọma? Ọ bụ mmadụ iche na ihe na-agaziri ya mgbe ihe na-anaghị agaziri ya. Onye ma na ihe anaghị agaziri ya ga na-agba mbọ ka ọ mara otú ihe ga-esi gaziwere ya. Ọ ga-amụta ihe n’ihe ndị ọ na-emetaghị, mụtakwa otú ọ ga-esi mezie ha.

Ma, mmadụ iche na ihe na-agaziri ya mgbe ihe na-anaghị agaziri ya adịghị mma. Ụdị onye a ga na-eche na ihe niile dị mma ma ihe ana-emebi. Mgbe ọ ga-eji chọpụta nke bụ́ eziokwu, ihe emebichaala.

Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe Jizọs jụrụ, sị: “Olee uru ọ ga-abara mmadụ ma ọ bụrụ na o rite ụwa dum n’uru ma tụfuo mkpụrụ obi ya?” (Matiu 16:26) Ihe a o kwuru na-akọwa ụdị ọnọdụ ọjọọ ndị ji ndụ ha niile achụ ego nọ. Otu ọkachamara kwuru na mmadụ ịna-eche naanị banyere mgbe ọzọ a ga-ebugo ya n’ọkwá ma ọ bụ otú ọ ga-esi kpatakwuo nnukwu ego anaghị eme ka obi dị mmadụ mma. O kwukwara na ọ bụghị ego ole mmadụ nwere ka o kwesịrị iji na-ekpebi ma ihe ọ̀ na-agara ya nke ọma nakwa na ime otú ahụ anaghị eweta obi ụtọ.

Ọtụtụ ndị kwetara ihe a. N’otu nnyocha e mere n’Amerịka, naanị mmadụ ole na ole kwuru na inwe ego dị ezigbo mkpa. Ọtụtụ ndị ọzọ kwuru na ihe ndị ka mkpa bụ ahụ́ ike, mmadụ na ndị ọzọ ịdị ná mma na mmadụ inwe ọrụ na-eme ya obi ụtọ.

O doro anya na ndị mmadụ ma mgbe ihe na-agaziri mmadụ na mgbe ihe na-anaghị agaziri mmadụ. Ma, otú ọtụtụ ndị si eme anaghị egosi na ha ma ihe ihe ịgaziri mmadụ pụtara.