Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE BAỊBỤL KWURU

Ịgba Chaa Chaa

Ịgba Chaa Chaa

Ụfọdụ ndị na-ewere ịgba chaa chaa ka ihe egwuregwu, ebe ndị ọzọ na-ewere ya ka ihe jọgburu onwe ya.

Ịgba chaa chaa ọ̀ bụ ihe ọjọọ?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ọtụtụ ndị na-ekwu na ịgba chaa chaa abụghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụhaala na iwu obodo kwadoro ya. E nwere ụdị ịgba chaa chaa ụfọdụ iwu obodo na-akwado. Dị ka ihe atụ, gọọmenti obodo ụfọdụ nwere ebe ndị mmadụ na-aga agba lọtrị. Ha na-eji ya enweta ego ha ji eme ihe ndị ga-abara ndị obodo ha uru.

IHE BAỊBỤL KWURU

O nweghị ebe Baịbụl kwuru hoo haa na ịgba chaa chaa dị njọ. Ma, o kwuru ihe ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịmata otú Chineke si ele ya anya.

Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘lezie anya ka anyị ghara inwe ụdị anyaukwu ọ bụla.’ (Luk 12:15) Ma, onye na-agba chaa chaa bụ onye anyaukwu n’ihi na ihe o ji agba ya bụ ka o rie ego ndị ọzọ. Ndị nwere ebe a na-agba chaa chaa na-agwa ndị mmadụ na ha ga-erite nnukwu ego. Ma, ha anaghị agwa ha na e nwere ike iri ego ha n’ihi na ha ma na ihe mere ndị mmadụ ji agba ya bụ na ha chọrọ inweta nnukwu ego. Ịgba chaa chaa anaghị eme ka mmadụ kwụsị ịdị anyaukwu, kama, ọ na-eme ka mmadụ chọwa inweta ego ọ na-ataghị ahụhụ ya.

Ihe ọzọ bụ na ndị na-agba chaa chaa na-achọ ọdịmma onwe ha naanị n’ihi na ha na-achọ iri ego ndị ọzọ. Ma, Baịbụl gwara onye ọ bụla ka ọ “na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.” (1 Ndị Kọrịnt 10:24) Otu n’ime Iwu Iri ahụ Chineke nyere ụmụ Izrel bụ: “Agụụ . . . ihe ọ bụla bụ́ nke mmadụ ibe gị, agụla gị.” (Ọpụpụ 20:17) Ihe onye na-agba chaa chaa na-eche mgbe ọ na-eche ego ọ ga-erite bụ otú ọ ga-esi eri ego ndị ọzọ.

Baịbụl gwakwara anyị ka anyị ghara iche na e nwere chi a na-akpọ chi ihu ọma na-eme ka mmadụ rite ego. N’oge ochie, ụfọdụ ndị Izrel hapụrụ Chineke ma “na-edozi tebụl maka chi Ihu Ọma.” Ihe ahụ ha mere ọ̀ dị Chineke mma n’obi? Mba. Ọ gwara ha, sị: “Unu nọ na-eme ihe jọrọ njọ n’anya m, ọ bụkwa ihe na-adịghị m mma ka unu họọrọ ime.”—Aịzaya 65:11, 12.

N’obodo ụfọdụ, ndị ọchịchị na-eji ego ha nwetara n’ịgba chaa chaa akwado agụmakwụkwọ, emepe obodo, ma ọ bụkwanụ eme ihe ndị ọzọ ga-abara ndị obodo ha uru. Ma, ọ pụtaghị na otú e si nweta ego ahụ dị mma n’ihi na ọ na-eme ka ndị mmadụ dị anyaukwu, na-achọ ọdịmma onwe ha naanị, na-achọkwa otú ha ga-esi nweta ego ha na-ataraghị ahụhụ.

“Agụụ . . . ihe ọ bụla bụ́ nke mmadụ ibe gị, agụla gị.”Ọpụpụ 20:17.

Olee nsogbu ịgba chaa chaa na-akpatara ndị na-agba ya?

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na “ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha, ndị na-emerụkwa ahụ́, ndị na-emekwa ka mmadụ mikpuo ná mbibi na ịla n’iyi.” (1 Timoti 6:9) Ọ bụ anyaukwu mere ndị mmadụ ji agba chaa chaa. Anyaukwu jọgburu onwe ya. Ọ bụ ya mere o ji soro n’àgwà ndị Baịbụl gwara anyị ka anyị zere.—Ndị Efesọs 5:3.

Onye na-agba chaa chaa na-achọ inweta ego ọ na-ataraghị ahụhụ n’ihi na ọ hụrụ ego n’anya, bụ́kwanụ ihe Baịbụl kwuru na ọ “bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile.” Onye mkpa ya niile bụ inwe ego ga na-echegbu onwe ya, na-achọ otú ọ ga-esi enwe ya. Ihe a ọ na-eme gosiri na ọ tụkwasịghị Chineke obi. Baịbụl kwuru na ndị hụrụ ego n’anya ‘na-eji ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.’—1 Timoti 6:10.

Onye anyaukwu anaghị enwe afọ ojuju. Ego o nwere anaghịkwa atụ ya n’anya. Ọ naghịkwa enwe obi ụtọ. Baịbụl kwuru na “ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ.”—Ekliziastis 5:10.

Ịgba chaa chaa na-eri ọtụtụ ndị na-agba ya ahụ́ nke na ịkwụsị ya anaghị ekwe ha. Nchọpụta e mere gosiri na ịgba chaa chaa eriela ọtụtụ nde ndị Amerịka ahụ́. Ụdị ihe a na-emekwa n’ọtụtụ ebe.

Baịbụl kwuru, sị: “A na-eji anyaukwu enweta ihe nketa ná mmalite, ma ọdịnihu ya agaghị abụ nke a gọziri agọzi.” (Ilu 20:21) Ndị ịgba chaa chaa riri ahụ́ na-ejikarị ụgwọ, ego anaghịkwa adị ha n’aka. A na-achụ ọtụtụ n’ime ha n’ọrụ, ha na di ha, nwunye ha ma ọ bụ ndị enyi ha na-etisakarịkwa. Ọ bụrụ na mmadụ emee ihe Baịbụl kwuru, onye ahụ ga na-enwe obi ụtọ. Ọ gaghị enwe nsogbu ịgba chaa chaa na-akpata.

“Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha, ndị na-emerụkwa ahụ́, ndị na-emekwa ka mmadụ mikpuo ná mbibi na ịla n’iyi.”1 Timoti 6:9.