ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Julaị 2016

Ihe dị́ n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Ọgọst 29 ruo Septemba 25, 2016.

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Gana

E nwere ọtụtụ nsogbu ndị na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma na-enwe. Ma Chineke na-agọzikwa ha.

Na-achọ Alaeze Chineke, Ọ Bụghị Ihe Onwunwe

Jizọs kọwara ihe mere anyị ji kwesị ịna-agba mbọ ka anyị ghara ịna-achọ inwetakwu ihe.

Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị ‘Ịna-eche Nche’?

E nwere ihe atọ nwere ike ime ka anyị ghara ịmụrụ anya ma anyị akpacharaghị anya.

“Atụla Egwu. Mụ Onwe M Ga-enyere Gị Aka”

Jehova egosila na ya bụ ezigbo enyi anyị ma mgbe anyị na-echegbu onwe anyị ma mgbe nsogbu bịaara anyị.

Obi Dị Anyị Ụtọ na Chineke Na-egosi Anyị Obiọma Ya Na-erughịrị Mmadụ

Olee otú kachanụ Jehova si gosi ụmụ mmadụ obiọma ya na-erughịrị ha?

Na-ekwusa Ozi Ọma Gbasara Obiọma Chineke nke Na-erughịrị Mmadụ

Olee otú ‘ozi ọma alaeze’ Chineke si eme ka anyị mata na Chineke na-egosi anyị obiọma ya na-erughịrị mmadụ?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ezikiel isi 37 kwuru na e jikọtara osisi abụọ ka ha bụrụ otu osisi. Gịnị ka ọ pụtara?