Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

HA MERIRI NSOGBU AHỤ

Akụkọ Ndụ Ricardo na Andres

Akụkọ Ndụ Ricardo na Andres

Ihe Baịbụl na-akụzi na-akpa ezigbo ike ná ndụ ndị mmadụ, na-eme ka ndụ ha ka mma. Legodi ihe mere ná ndụ Ricardo na Andres.

RICARDO: Mgbe m ka dị afọ iri na ise ka m banyere òtù ọjọọ. Àgwà ọjọọ ndị enyi m na-akpa mere ka m bido kpawa àgwà ọjọọ. Ọ bịara na-agụsi m agụụ ike ka a tụọ m kpọrọ afọ iri. Ihe a m kwuru nwere ike ịdị ka ọ̀ bụ okwu onye iberiibe. Ma, n’ebe anyị bị, a na-akwanyere onye ọ bụla nọrọla ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ ùgwù. M chọkwara ịdị ka ha.

O nweghị ihe ndị nọ n’òtù ọjọọ na-eme m na-emeghị. A ṅụrụ m ọgwụ ike, kwaa iko, meekwa ihe ike. N’otu abalị, ndị òtù anyị na ndị òtù ọzọ kwarịtara mgbọ. M chere na m gaara anwụ n’abalị ahụ, mana m gbapụrụ, n’enweghị ọkọ kọrọ m. Mgbe ihe ahụ mechara, m bịara chesiwe echiche ike banyere ndụ m na ihe m chọrọ iji ya eme. N’ihi ya, m kpebiri na m ga-agbanwe otú m si ebi ndụ. Ma, olee otú m ga-esi eme ya? Olee otú m ga-esi enweta enyemaka?

Ọtụtụ ndị ikwu m anaghị enwe obi ụtọ n’ihi nsogbu zuru ha ahụ́. Ma, ọ dịghị otú ahụ n’ezinụlọ otu deede m bụ́ nwanne mama m. Ama m na ha bụ́ ndị ezigbo mmadụ, marakwa na ha na-eme ihe Baịbụl kwuru n’ezinụlọ ha. O nwere mgbe ha kụziiri m na aha Chineke bụ Jehova. O teghị aka anyị kwarịtachara mgbọ ahụ, m kpere ekpere, kpọọ Jehova aha, na-arịọ ya ka o nyere m aka. N’echi ya, ọ tụrụ m n’anya na otu Onyeàmà Jehova kụrụ aka n’ọnụ ụzọ m. O mechara bụrụ ya mụụrụ m Baịbụl.

M bịara nwee nsogbu ọzọ. Ọtụtụ mgbe, ndị enyi m na-akpọ m n’ekwentị ka mụ na ha soro pụọ. N’agbanyeghị na ọ dịghịrị m mfe, m jụrụ iso ha. M kpebiri na m ga-anọgide na-amụ Baịbụl. Obi dị m ụtọ na akwụsịghị m ịmụ Baịbụl. Ndụ m gbanwere n’egbughị oge, mụ ebidokwa na-enwe ezigbo obi ụtọ.

M chetara na o nwere mgbe m kpere ekpere gwa Chineke na o nwere mgbe m chọrọ ka a tụọ m mkpọrọ afọ iri, ka e nwee ike ịna-akwanyere m ùgwù. N’ihi ya, m rịọziri Chineke ka o kwe ka m jiri oge m niile jeere ya ozi afọ iri ka m nwee ike inyere ndị ọzọ aka otú a e nyeere m. Chineke zara ekpere m. N’ihi na ejirila m oge m niile jeere ya ozi ruo afọ iri na asaa. M chọkwara ka unu mara na agaghịzi m mkpọrọ.

Ọtụtụ ndị enyi m nwoke anọọla ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ, ụfọdụ n’ime ha anwụọkwala. M cheta otú ndụ m dịbu, mụ ana-ekele ndị ikwu m ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova maka enyemaka ha. Ha dị njikere ịdị iche ná ndị ọzọ na ime ihe Baịbụl kwuru. M malitere ịkwanyere ha ùgwù karịa otú m kwanyetụụrụla onye ọ bụla so n’òtù ọjọọ ahụ. M na-ekele Chineke karịchaa maka ịkụziri m otú kacha mma m ga-esi na-ebi ndụ.

ANDRES: A mụrụ m, mụ etoo n’obodo ebe e nwere ọtụtụ ndị dara ogbenye. O nweghị ihe e ji ịṅụ ọgwụ ike, ịnapụ ndị mmadụ ihe n’ike kpọrọ n’ebe ahụ, ma ya fọdụziekwa igbu ọchụ na ịgba akwụna. Ịṅụ mmanya na koken riri papa m ahụ́. Ya na mama m na-esekarị okwu, na-alụkarịkwa ọgụ.

M malitere ịṅụ mmanya na-aba n’anya na ọgwụ ike mgbe m ka dị ezigbo obere. M na-anọkarị n’okporo ụzọ na-ezu ohi ma na-ere ihe m zutere. Ka m na-etolite, papa m gbalịrị ime ka m kpawa ya nso. Ọ kụziiri m otú e si esi ná mba ọzọ ebubata ọgwụ ike na ịzụ ahịa iwu. Ọ dịghị anya mụ enwee ezigbo ego. Otu ụbọchị, ndị uwe ojii bịara n’ụlọ m kpụrụ m. Mgbe e mechara, a tụrụ m mkpọrọ afọ ise maka na m chọrọ igbu mmadụ.

N’otu ụtụtụ, a mara ọkwa n’ụlọ mkpọrọ ahụ ka ndị mkpọrọ niile bịa gere okwu si na Baịbụl Ndịàmà Jehova ga-ekwu. M kpebiri na m ga-aga. Ihe m nụrụ ụbọchị ahụ tọrọ m ụtọ, n’ihi ya, mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Ha anaghị agwa m ihe ndị ha ma ga-amasị m, kama, ha gwara m hoo haa ụdị àgwà Chineke chọrọ ka m na-akpa.

M chọpụtara na agaghị m agbanweli otú m si ebi ndụ n’ike aka m, nke ka nke mgbe ndị mkpọrọ ibe m na-enweghị mmasị n’ihe m na-eme bidoro iyi m egwu. N’ihi ya, m rịọrọ Jehova n’ekpere ka o nye m ike na amamihe. O nyekwaara m aka, n’ihi na kama ịtụwa ha ụjọ, m katara obi na-ezi ndi mkpọrọ ndị ọzọ ozi ọma.

Mgbe oge a ga-atọhapụ m ruru, ụjọ ịpụ tụrụ m, nke mere ka m chọọ ịnọtụkwu n’ụlọ mkpọrọ ahụ. Ka m na-ala, ụfọdụ ndị mkpọrọ nọ na-efere m aka na-asị m gaa nke ọma. O metụrụ ụfọdụ n’obi ha asị m “Obere Pastọ, gaa nke ọma.”

Ụjọ na-abịa m ma m chee otú ndụ m gaara adị ma a sị na mụ ekweghị ka Chineke kụziere m ihe. M na-ekele Chineke maka na ọ hụrụ m n’anya nakwa na o wereghị m ka onye furu efu. a

a Ị chọọ ịgụ gbasara akụkọ ndị ọzọ ihe Baịbụl kwuru nyeere aka ha agbanwee ndụ ha, gaa na jw.org/ig. Pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa Isiokwu Dị Iche Iche, gị achọzie isiokwu bụ́, “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ.”