Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA! A | OLEE IHE GOSIRI NA BAỊBỤL SI N’AKA CHINEKE?

Baịbụl Ò Si “n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke” n’Eziokwu?

Baịbụl Ò Si “n’Ike Mmụọ Nsọ Chineke” n’Eziokwu?

Ì KWEERE na Baịbụl si n’aka Chineke? Ka ì chere na ihe e dere na ya si n’uche mmadụ?

Ihe ahụ ka ọtụtụ ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst na-arụrịta ụka gbasara ya. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2014, ajụjụ ọnụ a gbara ndị mmadụ n’Amerịka gosiri na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị kpọrọ onwe ha Ndị Kraịst sịrị na “o nwere ike ịbụ na Baịbụl si n’aka Chineke.” Ma, ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ ise ná ndị a a gbara ajụjụ ọnụ weere Baịbụl ka akwụkwọ “akụkọ ifo, akụkọ mgbe ochie, nakwa akwụkwọ iwu ndị mmadụ dere.” Arụmụka a emeela ka o doo anya na e kwesịrị ime ka a mata ihe okwu ahụ bụ́ “n’ike mmụọ nsọ” pụtara n’eziokwu.​—⁠2 Timoti 3:⁠16.

A SỊ NA IHE “SI N’IKE MMỤỌ NSỌ,” GỊNỊ KA Ọ PỤTARA?

E nwere akwụkwọ iri isii na isii dị na Baịbụl. Ọ bụ ihe dị ka mmadụ iri anọ dere ha, o wekwara ha ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ isii iji dechaa ha. Ma, ọ bụrụ na ọ bụ ndị mmadụ dere Baịbụl, oleezi otú o si bụrụ na o si “n’ike mmụọ nsọ Chineke”? Ikwu ya n’ụzọ dị mfe, okwu ahụ bụ́ “n’ike mmụọ nsọ Chineke” pụtara na ihe ndị e dere n’ime ya si n’aka Chineke. Baịbụl n’onwe ya kwuru, sị: “Ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.” (2 Pita 1:21) Ya bụ, Chineke ji ike mmụọ nsọ ya gwa ndị dere Baịbụl ihe ha dere. Ọ dị ka ebe onye ọchụnta ego gwara odeakwụkwọ ya ihe ọ ga-edere ya n’akwụkwọ ozi. Ònye ka a ga-asị na ọ bụ ya nwe akwụkwọ ozi ahụ? Ọ bụ onye ọchụnta ego ahụ gwara ya ihe ọ ga-ede, ọ bụghị odeakwụkwọ ahụ nyeere ya aka dee ya.

Ụfọdụ ndị dere Baịbụl ji ntị ha nụ mgbe mmụọ ozi Chineke gwara ha ihe ha ga-ede. Ndị ọzọ hụrụ ihe ha dere n’ọhụụ Chineke gosiri ha. O nwekwara mgbe ụfọdụ Chineke ji nrọ gwa ụfọdụ n’ime ha ihe ha dere. Mgbe ụfọdụ, Chineke hapụrụ ndị a dere Baịbụl ka ha dee ihe ụfọdụ n’okwu nke aka ha, nweekwa mgbe ọ gwara ha ka ha dee kpọmkwem ihe o kwuru. Otú ọ bụla o si mee ya, ihe ha dere na Baịbụl bụ uche Chineke, ọ bụghị nke ha.

Ma, olee otú anyị ga-esi jide n’aka na ọ bụ ike mmụọ nsọ Chineke ka e ji dee Baịbụl? Ka anyị leba anya n’ihe atọ ga-eme ka obi sie gị ike na Baịbụl si n’aka Chineke.