Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | ỊZỤ ỤMỤ

Uru Ịrụ Ọrụ Dị n’Ụlọ Bara

Uru Ịrụ Ọrụ Dị n’Ụlọ Bara

IHE MERE O JI ESI IKE

N’ezinụlọ ụfọdụ, a na-atụ anya ka ụmụaka nyere nne na nna ha aka na-arụ ọrụ dị n’ụlọ. Ha na-ejikwa obi ha niile eme ya. N’ezinụlọ ndị ọzọ, ndị nne na nna anaghị atụ anya ka ụmụ ha na-arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ. N’ihi nke ahụ, ụmụ ha na-enwezi obi ụtọ na a gụpụla ha n’ọrụ dị n’ụlọ.

Ndị na-eme nchọpụta achọpụtala na ihe a kacha njọ n’obodo ndị ọcha, ebe ụmụaka na-aghọzi ndị a na-emere emere kama ịbụ ndị na-enye aka n’ọrụ. Otu nna aha ya bụ Steven kwuru, sị: “Taa, a na-ahapụzi ụmụaka ka ha nọrọ n’ụlọ na-egwu egwuregwu kọmputa, na-awagharị n’Ịntanet ma ọ bụ na-ele tiivi. Nne na nna ha anaghị atụ anya ka ha rụọ ọrụ ọ bụla n’ụlọ.”

Gịnị ka gịnwa chere? Ọ̀ dị mkpa ụmụaka ịrụ ọrụ dị n’ụlọ, ọ bụghị naanị iji mee ka ụlọ dị ọcha, kama ka ha jiri ya mụta ezigbo àgwà?

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Ụfọdụ ndị nne na nna anaghị enwecha mmasị ikenye ụmụ ha ọrụ ha ga-arụ, karịchaa, ma ọ bụrụ na ụmụ ha nwere ọtụtụ ihe omume onye nkụzi ha nyere ha mee. Ma, legodị uru ịrụ ọrụ dị n’ụlọ bara.

Ịrụ ọrụ ndị dị n’ụlọ na-eme ka nwatakịrị bụrụ nwa a zụrụ nke ọma. Ọ bụghị ihe iju anya na ụmụaka ndị na-arụ ọrụ dị n’ụlọ na-aka eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Ịrụ ọrụ ndị dị n’ụlọ na-eme ka nwatakịrị na-adị uchu n’ihe ọ bụla ọ na-eme, na-akatakwa obi eme ihe. Ihe ndị a bụkwanụ ihe ndị ga-enyere ya aka ịmụta ihe n’ụlọ akwụkwọ.

Ịrụ ọrụ ndị dị n’ụlọ na-eme ka nwatakịrị mụta ijere ndị ọzọ ozi. A chọpụtala na ọtụtụ mgbe, ụmụaka ndị na-arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ na-emecha bụrụ ndị na-arụ ọrụ na-abara obodo uru. Ọ bụghị ihe iju anya n’ihi na ọ na-eme ka ha na-ebute ọdịmma ndị ọzọ ụzọ. Steven anyị kwuburu okwu ya ná mmalite sịrị: “Ma ụmụaka anaghị eme ihe ọ bụla n’ụlọ, ọ na-eme ka ha na-atụ anya ka ndị ọzọ na-ejere ha ozi. Ọ ga-emekwa ka o siere ha ike ịma ihe ha kwesịrị ime ma o ruo mgbe ha kwesịrị igboro onwe ha mkpa ma ọ bụ ịrụsi ọrụ ike.”

Ịrụ ọrụ ndị dị n’ụlọ na-eme ka ezinụlọ dịrị n’otu. Ọ bụrụ na ụmụaka na-arụ ọrụ ndị dị n’ụlọ, ọ ga-eme ka ha mata na ndị mụrụ ha ji ha kpọrọ ihe, nakwa na ha kwesịrị iso na-enye aka n’ezinụlọ. Ma, ụmụaka nwere ike ịghara ịmụta ihe a ma ọ bụrụ na nne na nna ha ejiri egwuregwu a haziri ka ụmụaka na-egwu ma a gbasa akwụkwọ kpọrọ ihe karịa ịrụ ọrụ dị n’ụlọ. Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee uru ọ ga-abara m ma nwa m na-akwado ndị òtù egwu bọl ụlọ akwụkwọ ha ma hapụ ịna-akwado ndị ezinụlọ ya?’

IHE I NWERE IKE IME

Bido mgbe ọ dị obere. Ụfọdụ ndị ekwuola na ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ibido mgbe nwa ha dị afọ atọ nyewe ya ọrụ ọ ga-arụ n’ụlọ. Ndị ọzọ na-asị na e kwesịrị ibido mgbe ọ dị afọ abụọ ma ọ bụ mgbe ọ na-erubeghị ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na ụmụaka na-enwe mmasị iso nne na nna ha na-arụ ọrụ ma na-eṅomi ha.​—⁠Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 22:⁠6.

Nye ya ọrụ ya na ya hà. Dị ka ihe atụ, nwa afọ atọ nwere ike ịtụtụkọta ihe o ji egwu egwu, ihicha ihe wụfuru n’ala, ma ọ bụ ịchịpụta ákwà a ga-asụ. Ndị nke karịrị afọ atọ nwere ike ịza ụlọ, zaa èzí, ma ọ bụ sie nri. Na-enye ya ọrụ ọ ga-arụli. Otú ọ ga-esi jiri obi ya niile na-arụ ọrụ ndị ahụ nwere ike ịtụ gị n’anya.

Mee ka ọ mata na ọrụ ụlọ ka mkpa. Nke ahụ nwere ike isi ike ma ọ bụrụ na ndị nkụzi na-enyekarị nwa gị ọtụtụ ihe omume ọ ga-eme n’ụlọ kwa ụbọchị. Ma, akwụkwọ aha ya bụ The Price of Privilege kwuru na ịgwa nwatakịrị ka ọ hapụ ọrụ ụlọ tinye uche n’agụmakwụkwọ ya n’ihi na ị chọrọ ka ọ na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ bụ “amaghị nke ka ibe ya mkpa.” Dị ka anyị kwuru na mbụ, ịrụ ọrụ ụlọ na-eme ka ụmụaka na-amụta ihe. Ihe ndị ha mụtara ga-enyekwara ha aka mgbe ha ga-enwe ezinụlọ nke ha.​—⁠Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Filipaị 1:⁠10.

Lekwasị anya n’ihe mere i ji nye ya ọrụ ahụ, ọ bụghị n’otú o si rụọ ya. Nwa gị nwere ike igbu oge n’ịrụcha ọrụ i nyere ya. O nwekwara ike ịbụ na ọ rụtachaghị ya otú ị chọrọ. Ụdị ihe a mee, anarakwala ya ọrụ ahụ rụọ. Cheta na ihe i bu n’obi nye ya ọrụ ahụ abụghị ka ọ rụọ ya ka dimkpa, kama, ọ bụ ka inyere ya aka ịma uru ịrụ ọrụ bara na obi ụtọ ọ na-enye.​—⁠Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ekliziastis 3:⁠22.

Akwụla ya ụgwọ maka ọrụ ọ rụrụ n’ụlọ. Ụfọdụ ndị na-asị na ịkwụ ụmụaka ụgwọ maka ọrụ ha rụrụ na-eme ka ha mụta ịdị uchu. Ma, ndị ọzọ na-ekwu na ọ na-eme ka uche ụmụaka dịrịzie n’ihe ha ga-enweta n’aka ezinụlọ ha kama ihe hanwa ga-emere ezinụlọ ha. Ha na-ekwukwa na nwa ahụ nweziri ike ịkwụsị ịrụ ọrụ dị n’ụlọ ma o nweta ego. Nke a na-egosi na ọ maghị uru ịrụ ọrụ ụlọ bara. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe a? Ọ gaghị adị mma ka a na-akwụ nwatakịrị ụgwọ n’ihi ọrụ ọ rụrụ n’ụlọ.