Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Njem Dị Ịtụnanya Nnụnụ Arctic Tern Na-eme

Njem Dị Ịtụnanya Nnụnụ Arctic Tern Na-eme

Ọ DỊLA anya ndị mmadụ chere na ogologo njem nnụnụ arctic tern na-eme iji si n’otu ngwụcha ụwa fere gaa ná ngwụcha ụwa nke ọzọ ma laghachi, bụ ihe dị ka puku kilomita iri atọ na ise na narị kilomita abụọ. Ma, nchọpụta ndị e mere na nso nso a gosiri na nnụnụ a na-eme njem dị ogologo karịa otú ahụ.

Njem nnụnụ Arctic Tern na-ahịgọ ahịgọ. Dị ka e gosiri n’ihe osise a

Mgbe ndị na-eme nchọpụta tinyere otu obere ngwá elektrọniks na-enye aka eme ka a mata ebe ihe nọ n’ahụ́ ụfọdụ n’ime nnụnụ ndị a, ha chọpụtara na nnụnụ a nwedịrị ike ife ihe dị ka puku kilomita iri itoolu, ma uje ma ụlọ. O nwedịrị otu n’ime nnụnụ ndị a fere ihe dị ka iri puku kilomita itoolu na isii. O nweghị anụmanụ ọ bụla ọzọ na-eme ogologo njem ha otú a. Gịnị mere ihe a chọpụtara ugbu a ji dị iche?

N’agbanyeghị ebe ha si bido njem ha, njem ha na-ahịgọ ahịgọ. Dị ka e gosiri n’ihe osise dị n’elu ebe aka nri nke peeji a, njem ha na-eme gafere n’Oké Osimiri Atlantik na-ahịgọkarị ahịgọ, na-achọ ịdị ka S. Gịnị kpatara ya? Ọ bụ n’ihi na ha na-efeba n’ebe ikuku dị ka o buru ha na-aga.

Nnụnụ a nwere ike ịnọ ndụ ruo ihe dị ka afọ iri atọ. N’ime afọ iri atọ ahụ, nnụnụ a nwere ife ihe dị ka nde kilomita abụọ na ọkara. Ọ ha ka isi ebe a gaa n’ọnwa laghachi ugboro atọ ma ọ bụ anọ. Otu nwoke na-eme nchọpụta, sịrị: “Ọ bụ ihe dị ezigbo ịtụnanya na obere nnụnụ hà otú a nwere ike ịna-eme ogologo njem ha otú a.” Njem nnụnụ ndị a mere ka ha na-anọ n’oge ọkọchị nke ebe ngwụcha ụwa abụọ a ha na-efega, akwụkwọ bụ́ Life on Earth: A Natural History kwuru na ha na-ahụ “ìhè anyanwụ karịa ihe ọ bụla dị ndụ.”