Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ọ bụrụ na a kpọgburu mmadụ n’osisi otú ahụ e mere Jizọs, ndị Rom hà na-ekwe ka e lie ya nke ọma?

ỌTỤTỤ ndị ma na Baịbụl kwuru na a kpọgburu Jizọs na ndị omekome abụọ n’elu osisi. (Mat. 27:​35-38) Ma, ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe ahụ Baịbụl kwuru na e buuru ozu Jizọs, kwadebe ya maka olili ma lie ya abụghị eziokwu.​—Mak 15:​42-46.

Ụfọdụ ndị na-agba ihe e kwuru na Matiu, Mak, Luk, na Jọn ụkwụ kwuru na ndị Rom anaghị ekwe ka e lie onye ọ bụla a kpọgburu n’osisi nke ọma. Kama, ha na-ekwu na e nwere ike inwe otú ọzọ e si eme ozu onye ọ bụla a kpọgburu n’osisi. Na magazin a kpọrọ Smithsonian, otu onye nta akụkọ aha ya bụ Ariel Sabar kwuru ihe mere ndị ụfọdụ ji chee otú ahụ. Ọ sịrị: “Ndị a na-akpọgbu n’osisi bụ ndị rụrụ ala. Ụfọdụ ndị ọkachamara kwukwara na o nweghị mgbe ndị Rom ga-ekwe ka e lie ndị dị otú ahụ nke ọma.” Ndị Rom na-achọ imenye ndị omekome a mara ikpe ọnwụ ezigbo ihere. N’ihi ya, ha na-ahapụkarị ozu ha ka ụmụ anụmanụ rie ha. E nweziri ike igwu ala tụba ihe ọ bụla ha rifọrọ.

Ma, ndị na-egwupụta ihe ndị mgbe ochie chọpụtara na e nwere ụfọdụ ndị Juu a kpọgburu n’osisi otú e mere ozu ha dị iche. N’afọ 1968, e gwupụtara ọkpụkpụ otu nwoke aha ya bụ Yehochanan, onye a kpọgburu n’osisi n’ihe dị ka oge ahụ Jizọs nọ n’ụwa. A hụrụ ọkpụkpụ ndị ahụ n’ime igbe dị n’ili dị nso na Jeruselem. Ọkpụkpụ ụkwụ nwoke ahụ dị ebe ahụ. E ji ntu dị inch anọ na ọkara kụgide ya n’osisi dị mbadamba. Sabar sịrị: “Ụkwụ Yehochanan a hụrụ mere ka a mata na ihe e kwuru n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn gbasara ili Jizọs nwere ike ịbụ eziokwu. Ụkwụ Yehochanan na-egosi na e nwere ndị a kpọgburu n’osisi n’oge Jizọs ndị Juu kwere ka e lie ha nke ọma.”

Ndị mmadụ na-ekwu ihe dị iche iche gbasara otú e si kpọgbuo Jizọs n’ihi ihe ọkpụkpụ nwoke a a hụrụ na-egosi. Ma, ihe doro anya bụ na a na-eli ụfọdụ ndị omekome a kpọgburu n’osisi nke ọma, ọ bụghị ịtụfu ha atụfu. O doro anya na ihe Baịbụl kwuru gbasara otú e si lie Jizọs bụ eziokwu. Ihe ndị a chọpụtara gosiri na ihe a Baịbụl kwuru bụ eziokwu.

Ihe ka mkpa bụ na Jehova buru amụma na a ga-eli Jizọs n’ili ndị ọgaranya. E nweghịkwa onye ga-egbochili ihe Jehova kwuru imezu.​—Aịza. 53:9; 55:11.