Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe I Nwere Ike Ịmụ

Ihe I Nwere Ike Ịmụ

Bute “Abụ E Ji Eto Chineke” n’Isi

“Mgbe ọ bụla m na-eche na mụ abaghị uru, Jehova na-eji abụ anyị ndị na-agba n’Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova agba m ume.”​—Lorraine, AMERỊKA.

Ịbụ “abụ e ji eto Chineke so n’ụzọ Ndị Kraịst si efe Chineke kemgbe ụwa. (Kọl. 3:16) Ọ bụrụ na i buru abụ ndị a n’isi, o nwere ike inyere gị aka mgbe a na-enweghị akwụkwọ abụ ma ọ bụ ekwentị ị ga-eji abụ ha. Mee ihe ndị a ka o nyere gị aka ibute abụ anyị n’isi.

  • Gụọ mkpụrụ okwu abụ ahụ nke ọma ka ị ghọta ihe ọ na-ekwu. Ọ ga-adịrị gị mfe icheta ihe ị gụrụ ma ọ bụrụ na ị ghọta ya nke ọma. Ị ga-ahụ ebe e depụtara abụ anyị niile na jw.org, ma egwú ndị a gụrụ n’Ihe Omume Tiivi anyị, ma abụ ụmụaka. Ị gaa n’ebe e dere Ihe Ndị Anyị Nwere, gị apịa Abụ na Egwú.

  • Jiri aka gị depụta mkpụrụ okwu abụ ahụ. Ime otú a nwere ike ime ka ọ dịrị gị mfe ịna-echeta abụ ndị ahụ.​—Diut. 17:18.

  • Na-abụpụta ya abụpụta. Gụpụta mkpụrụ okwu abụ ahụ ma ọ bụkwanụ gị abụọ ya ugboro ugboro.

  • Lee ma ì butela ya n’isi. Gbalịa ka i cheta mkpụrụ okwu ndị dị n’abụ ahụ n’eleghị anya n’akwụkwọ abụ. Lezie anya n’akwụkwọ abụ ka ị mara ma ị̀ mụtala ya.