Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 47

Otú Anyị Ga-esi Na-ahụkwu Ụmụnna Anyị n’Anya

Otú Anyị Ga-esi Na-ahụkwu Ụmụnna Anyị n’Anya

“Ka anyị na-ahụ ibe anyị n’anya, n’ihi na ịhụnanya si n’aka Chineke.”​—1 JỌN 4:7.

ABỤ NKE 109 Jirinụ Obi Unu Niile Hụ Ibe Unu n’Anya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU a

1-2. (a) Gịnị mere Pọl onyeozi ji sị na ịhụnanya bụ́ ‘àgwà kachanụ’? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

 MGBE Pọl onyeozi na-ekwu gbasara okwukwe, olileanya, na ịhụnanya, ihe o ji mechie okwu ya bụ: “Nke kacha [n’àgwà a] niile bụ ịhụnanya.” (1 Kọr. 13:13) Gịnị mere Pọl ji kwuo ihe ahụ? N’ọdịnihu, ọ gaghị adị mkpa ka anyị nwee okwukwe ná nkwa ndị Chineke kwere gbasara ụwa ọhụrụ ma ọ bụkwanụ nwee olileanya na nkwa ndị ahụ ga-emezu n’ihi na ha emezuola. Ma, anyị ka kwesịrị ịna-ahụ Jehova na ndị mmadụ n’anya mgbe niile. N’eziokwu, anyị ga na-ahụkwu ha n’anya ruo mgbe ebighị ebi.

2 Ebe ọ bụ na anyị kwesịrị ịna-ahụkwu ha n’anya mgbe niile, anyị ga-aza ajụjụ atọ. Nke mbụ, gịnị mere anyị ji kwesị ịhụ ụmụnna anyị n’anya? Nke abụọ, olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya? Nke atọ, olee otú anyị ga-esi na-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya?

GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊHỤ ỤMỤNNA ANYỊ N’ANYA?

3. Olee ihe ndị mere anyị ji kwesị ịhụ ụmụnna anyị n’anya?

3 Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya? Otu n’ime ihe ndị kpatara ya bụ na ọ bụ ịhụnanya ka e ji amata ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu hụrụ ibe unu n’anya, mmadụ niile ga-eji ya mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.” (Jọn 13:35) Ihe ọzọ bụ na ịhụ ibe anyị n’anya na-eme ka anyị dịrị n’otu. Pọl kpọrọ ịhụnanya ihe “na-eme ka mmadụ niile dịrị n’otu.” (Kọl. 3:14) Ma, e nwere ihe ọzọ dị mkpa mere anyị kwesịrị iji hụ ụmụnna anyị n’anya. Jọn onyeozi degaara Ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ ozi, sị: “Onye ọ bụla hụrụ Chineke n’anya kwesịkwara ịhụ nwanna ya n’anya.” (1 Jọn 4:21) Ọ bụrụ na anyị egosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya, ọ na-egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya.

4-5. Mee ihe atụ gosiri otú ịhụ Chineke n’anya si gbasa ịhụ ụmụnna anyị n’anya.

4 Olee otú ịhụ Chineke n’anya si gbasa ịhụ ụmụnna anyị n’anya? Iji maa atụ, ka anyị lee otú obi anyị si gbasa ebe ndị ọzọ n’ahụ́ anyị. Ọ bụrụ na dọkịta achọọ ịmata otú obi anyị si arụ ọrụ, o nwere ike ijide anyị aka n’akwara dị anyị n’aka. Ọ na-eme ka ọ mara ma obi anyị ọ̀ na-arụkwa ọrụ nke ọma. Olee otú ihe a si gbasa ịhụnanya?

5 Otú ahụ dọkịta na-esi n’ihe ọ chọpụtara mgbe o jidere anyị aka n’akwara amara ihe ụfọdụ gbasara otú obi anyị si arụ ọrụ, anyị nwekwara ike iji otú anyị hụruru ụmụnna anyị n’anya chọpụta otú anyị si hụ Chineke n’anya. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị ahụchaghịzi ụmụnna anyị n’anya otú anyị hụburu ha, o nwere ike igosi na anyị ahụchaghịkwa Chineke n’anya. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-ahụ ụmụnna anyị n’anya mgbe niile, o gosiri na anyị hụrụ Chineke n’anya n’eziokwu.

6. Olee ihe mere o ji bụrụ na ezigbo nsogbu dị ma ọ bụrụ na anyị ahụchaghịzi ụmụnna anyị n’anya? (1 Jọn 4:7-9, 11)

6 Ọ bụrụ na anyị ahụchaghịzi ụmụnna anyị n’anya, o gosiri na nsogbu dị. Maka gịnị? Ọ bụ maka na o nwere ike ịpụta na anyị na Jehova adịchaghịzi ná mma. Jọn onyeozi mere ka ihe a doo anya mgbe o chetaara anyị, sị: “Onye na-ahụghị nwanna ya n’anya, bụ́ onye ọ na-ahụ anya, agaghị ahụli Chineke n’anya, bụ́ onye ọ na-anaghị ahụ anya.” (1 Jọn 4:20) Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Ihe ga-eme ka anyị na Jehova dị ná mma bụ ma anyị “na-ahụ ibe anyị n’anya.”​—Gụọ 1 Jọn 4:7-9, 11.

OLEE OTÚ ANYỊ SI EGOSI NA ANYỊ HỤRỤ ỤMỤNNA ANYỊ N’ANYA?

7-8. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya?

7 Na Baịbụl, e nyere anyị iwu ugboro ugboro ka anyị ‘hụ ibe anyị n’anya.’ (Jọn 15:12, 17; Rom 13:8; 1 Tesa. 4:9; 1 Pita 1:22; 1 Jọn 4:11) Ma, ọ bụ obi anyị ka anyị na-eji ahụ mmadụ n’anya. Ndị mmadụ anaghịkwa ahụ ihe dị n’obi anyị. N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi eme ka ndị ọzọ mata na anyị hụrụ ha n’anya? Ọ bụ n’okwu ọnụ anyị na n’omume anyị.

8 E nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi gosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya. Ụfọdụ n’ime ha bụ: “Na-agwanụ ibe unu eziokwu.” (Zek. 8:16) “Unu na ibe unu na-adị n’udo.” (Mak 9:50) “Na-ebunụ ụzọ asọpụrụ ndị ọzọ.” (Rom 12:10) “Na-anabatanụ ibe unu.” (Rom 15:7) ‘Na-agbagharanụ ibe unu.’ (Kọl. 3:13) “Na-eburịtanụ ibu arọ ibe unu.” (Gal. 6:2) ‘Na-akasinụ ibe unu obi.’ (1 Tesa. 4:18) “Na-emenụ ka ibe unu dị ike.” (1 Tesa. 5:11) “Na-ekpekwaranụ ibe unu ekpere.”​—Jems 5:16.

Olee otú anyị nwere ike isi nyere nwanna nọ ná nsogbu aka? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7 ruo na nke 9)

9. Gịnị mere ịkasi ụmụnna anyị obi ji bụrụ ụzọ dị mkpa anyị si egosi na anyị hụrụ ha n’anya? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

9 Ka anyị leba anya n’otu n’ime ụzọ ndị anyị si egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya e kwuru na paragraf bu nke a ụzọ. Pọl sịrị: ‘Na-akasinụ ibe unu obi.’ Olee otú ịkasi ndị mmadụ obi si bụrụ otu ụzọ dị mkpa anyị si egosi na anyị hụrụ ha n’anya? Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru na okwu Pọl kwuru a sụgharịrị ‘ịkasi obi’ pụtara “iguzo n’akụkụ mmadụ na-agba ya ume mgbe ọnwụnwa siri ike bịaara ya.” N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị akasie nwanna na-ata ahụhụ obi, anyị na-enyere ya aka ka ọ ghara ịda mbà n’ife Jehova. N’oge ọ bụla anyị kasiri nwanna anyị obi, anyị na-egosi ya na anyị hụrụ ya n’anya.​—2 Kọr. 7:6, 7, 13.

10. Olee otú inwe ọmịiko si gbasa ịkasi mmadụ obi?

10 E nwere ike ikwu na inwe ọmịiko na ịkasi mmadụ obi bụ nwanne. Olee otú ọ bụ? Onye na-enwere mmadụ ọmịiko hụ onye na-ata ahụhụ, ọ na-akasi ya obi, gbaakwa mbọ inyere ya aka. N’ihi ya, ihe mbụ anyị na-emere onye na-ata ahụhụ bụ inwere ya ọmịiko, anyị akasizie ya obi. Pọl kọwara na otú Jehova si enwere ndị mmadụ ọmịiko na-eme ka ọ kasie ha obi. Ọ kpọrọ Jehova “Nna na-emetere ndị mmadụ ebere, Chineke nke na-akasi ndị mmadụ obi n’ụdị ọnọdụ niile ha nọ.” (2 Kọr. 1:3) N’ebe a, Pọl ji okwu bụ́ “na-emetere mmadụ ebere” kọwaa inwere ndị ọzọ ọmịiko. N’ihi ya, ọ kpọrọ Chineke “Nna na-emetere ndị mmadụ ebere” ma ọ bụ Onye ebere si n’aka ya n’ihi na ọ na-enwere ndị mmadụ ezigbo ọmịiko. Ọmịiko ahụ na-emekwa ka ọ kasie anyị obi “n’ọnwụnwa niile na-abịara anyị.” (2 Kọr. 1:4) Otú ahụ mmiri dị ọcha nke si n’isi mmiri gbapụta na-eme ka ndị akpịrị na-akpọ nkụ nweta onwe ha, Jehova na-akasi ndị nsogbu bịaara obi, meekwa ka ha nweta onwe ha. Olee otú anyị nwere ike isi na-enwere ndị mmadụ ọmịiko ma na-akasi ha obi ka Jehova? Otu ụzọ anyị nwere ike isi mee ya bụ ịmụta ịna-akpa àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịna-enwere ndị mmadụ ọmịiko ma na-akasi ha obi. Olee ụfọdụ n’ime àgwà ndị ahụ?

11. Dị ka e kwuru ná Ndị Kọlọsi 3:12 na 1 Pita 3:8, olee àgwà ndị ọzọ ga-enyere anyị aka ịna-ahụ ụmụnna anyị n’anya otú ga-eme ka anyị na-akasi ha obi?

11 Olee ihe ga-enyere anyị aka inwe ịhụnanya nke ga-eme ka anyị nwee ike ‘ịna-akasi ibe anyị obi’ kwa ụbọchị? Anyị kwesịrị ịmụta ịkpa àgwà ndị dị ka ihe gbasara ndị ọzọ imetụ anyị n’obi, ịhụ ụmụnna anyị n’anya, na inwere ha obiọma. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:12; 1 Pita 3:8.) Olee otú àgwà ndị a nwere ike isi nyere anyị aka? Ọ bụrụ na anyị amụta inwere ndị mmadụ ọmịiko, mụtakwa àgwà ndị yiri ya, ọ ga-enyere anyị aka ịkasi ndị nọ ná nsogbu obi. Jizọs sịrị: “Ihe juru mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu. Ezigbo mmadụ na-esi n’ezigbo akụ̀ ya ewepụta ihe ọma.” (Mat. 12:34, 35) Ịkasi ụmụnna anyị obi bụ ụzọ dị ezigbo mkpa anyị si egosi na anyị hụrụ ha n’anya.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-AHỤKWU ỤMỤNNA ANYỊ N’ANYA?

12. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya ka anyị ghara ịkwụsị ịhụ ụmụnna anyị n’anya? (b) Olee ajụjụ anyị ga-aza ugbu a?

12 Anyị niile chọrọ ‘ịna-ahụ ibe anyị n’anya.’ (1 Jọn 4:7) Ma, ọ dị mkpa ka anyị cheta na Jizọs dọrọ aka ná ntị na ‘ịhụnanya ọtụtụ ndị ga-ajụ oyi.’ (Mat. 24:12) Jizọs anaghị ekwu na ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya ga-akwụsị ịhụ ibe ha n’anya. N’agbanyeghị ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịmụta otú ndị mmadụ si egosi na ha ahụghị ibe ha n’anya. Ka anyị leba anya n’ajụjụ a dị mkpa: Olee ihe ga-enyere anyị aka ịmata ma ànyị ji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya?

13. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịmara ma ànyị ji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya?

13 Otu ụzọ anyị ga-esi amata ma ànyị ji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya bụ ileba anya n’ihe anyị na-eme ma ihe ụfọdụ mee. (2 Kọr. 8:8) Pita onyeozi kwuru otu n’ime ha. Ọ sịrị: “Nke ka nke, jirinụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya, n’ihi na onye hụrụ ndị ọzọ n’anya na-adị njikere mgbe niile ịgbaghara ha ma ha mejọọ ya.” (1 Pita 4:8) N’ihi ya, ihe anyị na-eme mgbe ụmụnna anyị mejọrọ ihe ma ọ bụ mgbe ha mere ihe wutere anyị ga-enyere anyị aka ịmara ma ànyị ji obi anyị niile hụ ha n’anya.

14. Dị ka e kwuru na 1 Pita 4:8, olee otú anyị kwesịrị isi hụ ụmụnna anyị n’anya? Nye ihe atụ.

14 Ka anyị chebara ihe Pita kwuru echiche. Ihe mbụ o kwuru n’amaokwu nke 8 kọwara ụdị ịhụnanya anyị kwesịrị inwe. Ọ bụ ‘iji obi anyị niile hụ ibe anyị n’anya.’ Okwu Grik Pita ji kọwaa ‘iji obi anyị niile’ pụtara “ịgbasa ihe.” Ihe ọzọ e kwuru n’amaokwu ahụ kọwara ihe ga-eme ma anyị jiri obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya. Ọ ga-ekpuchi mmehie ụmụnna anyị. Anyị nwere ike iji ihe atụ a kọwaa ya. Ka e were ya na ihe kawasịchara elu tebụl anyị. Anyị nwere ike were ákwà gbasaa n’elu tebụl ahụ. Ákwà ahụ ga-ekpuchi ọtụtụ ihe na-adịghị mma na tebụl ahụ, ọ bụghị ihe ole na ole. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya. Anyị ga-adị njikere ịgbaghara ha ma ha mejọọ anyị.

15. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya, gịnị ka anyị ga-enwe ike ime? (Ndị Kọlọsi 3:13)

15 Otú anyị si hụ ụmụnna anyị n’anya kwesịrị isi ike nke na anyị ga na-agbaghara ha mmehie ha ọ bụrụgodị na o siiri anyị ike mgbe ụfọdụ. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13.) Anyị gbaghara ndị ọzọ, ọ na-egosi na anyị ji obi anyị niile hụ ha n’anya nakwa na anyị chọrọ ime Jehova obi ụtọ. Olee ihe ọzọ nwere ike inyere anyị aka ileghara ihe ụmụnna anyị na-emejọ ma ọ bụ ihe ha na-eme na-ewe anyị iwe anya?

Otú ahụ anyị na-edosa foto ndị dị mma anyị sere ma wepụ ndị nke ọzọ, anyị kwesịrị ịna-echeta ihe ọma ụmụnna anyị mere, ma na-echefu ndị nke na-adịghị mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17)

16-17. Olee ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịna-eleghara obere ihe ụmụnna anyị na-emejọ anya? Nye ihe atụ. (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

16 Lekwasị anya n’ihe ọma ụmụnna gị na-eme, ọ bụghị n’ihe ha na-anaghị emeta. Iji maa atụ, ka e were ya na gị na ụmụnna gara nnọkọ. Unu kporiri ndụ ná nnọkọ ahụ. Mgbe unu mechakwara, unu niile sere foto. Unu sedịrị foto abụọ ọzọ, a dịghị ama ama ya abụrụ na nke mbụ ahụ adịghị mma. Ugbu a, unu enweela foto atọ. Ma, n’otu n’ime ha, e nwere otu nwanna ihu ya gbarụrụ agbarụ. Olee ihe ị ga-eme foto ahụ? Ị ga-ewepụ ya n’ihi na ị ka nwere foto abụọ ọzọ ebe ụmụnna niile na-achị ọchị, ma nwanna ahụ.

17 Anyị nwere ike iji foto ahụ tụnyere ụdị ihe anyị na-echeta gbasara ụmụnna anyị. A na-enwekarị oge anyị na ụmụnna anyị ji nọrịa, mee ihe ndị tọrọ anyị ụtọ. Ma, ka e were ya na e nwere otu oge nwanna kwuru ma ọ bụ mee ihe na-adịghị mma. Gịnị ka anyị kwesịrị ime gbasara ya? Anyị kwesịrị ịgbalị chefuo ya n’ihi na e nwere ihe ndị ọzọ dị mma gbasara onye ahụ anyị kwesịrị ịna-echeta. (Ilu 19:11; Efe. 4:32) Anyị ga-echefuli ihe ahụ na-adịghị mma nwanna ahụ mere anyị n’ihi na e nwere oge ndị ọzọ dị mma anyị na ya nọrịrị. Ọ bụ ụdị ihe ndị a ka anyị kwesịrị ịna-echeta ma jiri ha kpọrọ ihe.

IHE MERE ỊHỤNANYA JI DỊ EZIGBO MKPA TAA

18. Olee ihe ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ gbasara ịhụnanya anyị kwuru okwu ha n’isiokwu a?

18 Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya? Dị ka anyị mụtarala, ịhụ ụmụnna anyị n’anya na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya? Otu ụzọ bụ ịkasi ha obi. Ihe ga-eme ka anyị nwee ike ‘ịna-ahụ ibe anyị n’anya’ bụ ịna-enwere ha ọmịiko. Olee otú anyị ga-esi na-ahụkwu ibe anyị n’anya? Ọ bụ ma anyị mee ike anyị niile ịna-agbaghara ha.

19. Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa taa ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya?

19 Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa taa ka anyị gosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya? Legodị ihe Pita kwuru mere o ji dị ezigbo mkpa. Ọ sịrị: “Ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. N’ihi ya, . . . jirinụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya.” (1 Pita 4:7, 8) Ka ọgwụgwụ ụwa ochie a ji ọsọ na-eru, olee ihe anyị kwesịrị ịtụ anya ya? Jizọs kwuru gbasara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mba niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Mat. 24:9) Ọ bụrụ na anyị chọrọ idi ụdị ịkpọasị ahụ ha kpọrọ anyị, anyị na ụmụnna anyị kwesịrị ịdị n’otu. Ọ bụrụ na anyị adịrị n’otu, mbọ Setan na-agba ikewa anyị ga-akụ afọ n’ala n’ihi na ihe jikọtara anyị bụ “ịhụnanya na-eme ka mmadụ niile dịrị n’otu.​—Kọl. 3:14; Fil. 2:1, 2.

ABỤ NKE 130 Na-agbaghara Ndị Ọzọ

a Ọ dị mkpa taa karịa mgbe ọ bụla ọzọ ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya. Gịnị mere o ji dị mkpa, oleekwa otú anyị ga-esi gosi na anyị ji obi anyị niile hụ ụmụnna anyị n’anya?