Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Bụ Aha Chineke?

Gịnị Bụ Aha Chineke?

Ọ bụrụ na ị chọọ ịmata mmadụ, ihe mbụ i nwere ike ịjụ ya bụ, “Gịnị bụ aha gị?” Ọ bụrụ na ị jụọ Chineke ajụjụ ahụ, gịnị ka i chere ọ ga-aza gị?

“Abụ m Jehova. Ọ bụ ya bụ aha m.”Aịzaya 42:8.

Ị̀ nụtụla aha ahụ? Ọ bụrụ na ị nụtụbeghị ya, o nwere ike ịbụ n’ihi na ọtụtụ ndị sụgharịrị Baịbụl edeghị aha Chineke ọtụtụ ebe, ụfọdụ ededịghị ya ede. Ihe ha na-ejikarị edochi ya bụ “ONYENWE ANYỊ.” Ma, aha Chineke gbara ihe dị ka ugboro puku asaa na Baịbụl mbụ e dere. Aha ahụ nwere mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ, nke dabara ná mkpụrụ akwụkwọ bụ́ YHWH ma ọ bụ JHVH. Otú e si akpọ ya n’Igbo kemgbe ụwa bụ “Jehova.”

Aha Chineke pụtara ọtụtụ ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nakwa n’ọtụtụ nsụgharị ndị ọzọ

Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ nke Abụ Ọma n’agbata afọ 30 ruo n’afọ 50, n’asụsụ HIBRU

Akwụkwọ Nsọ nke Tindel sụgharịrị n’afọ 1530, n’asụsụ BEKEE

Nsụgharị Baịbụl Reina-Valera n’afọ 1602, n’asụsụ SPANISH

Union Version n’afọ 1919, n’asụsụ CHAỊNIIZ

IHE MERE AHA CHINEKE JI DỊ MKPA

Chineke ji aha ya kpọrọ ihe. O nweghị onye gụrụ Chineke aha ahụ. Ọ bụ yanwa gụrụ ya onwe ya. Jehova kwuru, sị: “Nke a bụ aha m ruo mgbe ebighị ebi, nke a bụkwa ihe ncheta m site n’otu ọgbọ ruo ọgbọ ọzọ.” (Ọpụpụ 3:15) Na Baịbụl, aha Chineke pụtara ọtụtụ ugboro karịa utu aha ya ndị dị ka, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, Nna, Onyenwe anyị, na Chineke. Ọ pụtakwara ọtụtụ ugboro karịa aha ndị mmadụ, ndị dị ka Ebreham, Mozis, Devid, na Jizọs. Ihe ọzọkwa bụ na Jehova chọrọ ka ndị mmadụ mara aha ya. Baịbụl kwuru, sị: “Ka ndị mmadụ wee mara na gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, Ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”—Abụ Ọma 83:18.

Jizọs ji aha Chineke kpọrọ ihe. N’ekpere a na-akpọ Nna Anyị nke Bi n’Eluigwe ma ọ bụ Ekpere Onyenwe Anyị, Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha rịọ Chineke, sị: “Ka e doo aha gị nsọ.” (Matiu 6:9) Jizọs gwakwara Chineke n’ekpere, sị: “Nna, mee ka aha gị dị ebube.” (Jọn 12:28) Ihe kacha Jizọs mkpa ná ndụ bụ ime ka aha Chineke dị ebube. Ọ bụ ihe mere o ji kpee ekpere, sị: “Emewokwa m ka ha mara aha gị, m ga-emekwa ka a mara ya.”—Jọn 17:26.

Ndị na-efe Chineke ji aha Chineke kpọrọ ihe. Ndị fere Chineke n’oge ochie ghọtara na aha Chineke nwere ike ichebe ha ma zọpụta ha. “Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike. N’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, e wee chebe ya.” (Ilu 18:10) “Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova ga-alanahụ.” (Joel 2:32) Baịbụl gosiri na a ga-eji aha Chineke mata ihe dị iche ná ndị na-efe ya na ndị na-anaghị efe ya. “N’ihi na ndị niile dị iche iche ga na-ejegharị, onye ọ bụla n’aha chi ya; ma anyị onwe anyị ga na-ejegharị n’aha Jehova bụ́ Chineke anyị ruo mgbe ebighị ebi, ọbụna ruo mgbe niile ebighị ebi.”—Maịka 4:5; Ọrụ Ndịozi 15:14.

IHE AHA AHỤ NA-EGOSI

Aha ahụ mere ka Chineke pụọ iche. Ọtụtụ ndị ọkà mmụta Baịbụl kwuru na ihe aha ahụ bụ́ Jehova pụtara bụ “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ.” Jehova mere ka a mata ihe aha ya pụtara mgbe ọ gwara Mozis gbasara onwe ya, sị: “M GA-ABỤ IHE M CHỌRỌ ỊBỤ.” (Ọpụpụ 3:14) Ma, ihe aha Chineke pụtara abụghị naanị na ọ bụ Onye kere ihe niile. Aha ya pụtakwara na o nwere ike ịghọ ma ọ bụ mee ka ihe ndị o kere eke ghọọ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo uche ya. Aha ndị a na-etu Chineke nwere ike igosi ọkwá ya ma ọ bụ otú ike ya hà. Ma, ọ bụ naanị aha ya na-egosi ihe niile gbasara ya na ihe ndị o nwere ike ime.

Aha ahụ na-egosi na Chineke nwere mmasị n’ebe anyị nọ. Ihe aha Chineke pụtara na-egosi na ihe banyere ihe niile o kere eke, ma anyịnwa, na-emetụ ya n’obi. A sị kwuwe, na Chineke gwara anyị aha ya na-egosi na ọ chọrọ ka anyị mara ya nke ọma. Ọ gwadịrị anyị aha ya tupu anyị echewe gbasara ịma aha ya. O doro anya na Chineke chọrọ ka anyị were ya ka Onye dị adị anyị nwere ike ịbịaru nso, ọ bụghị ka chi nọ ebe dị anya.—Abụ Ọma 73:28.

Anyị na-akpọ aha Chineke, o gosiri na anyị nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Iji maa atụ, ọ bụrụ na ị chọrọ ka mmadụ bụrụ enyi gị, ị ga agwa ya aha gị. Olee otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na ọ jụ ịna-akpọ gị aha gị? Ka oge na-aga, i nwedịrị ike ichewe ma onye ahụ ọ̀ chọkwara ka gị na ya bụrụ enyi. Otú ahụ ka ọ dịkwa Chineke. Ọ gwala anyị aha ya, gwakwa anyị ka anyị na-akpọ ya aha ya. Ọ bụrụ na anyị ana-akpọ ya aha ya, o gosiri na anyị chọrọ ka anyị na ya dịrị ná mma. Ọ madị “ndị na-echebara aha ya echiche.”—Malakaị 3:16.

Ihe mbụ anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata Chineke bụ ịmata aha ya. Ma, ọ bụghị ebe okwu biri. Anyị kwesịkwara ịmata ụdị onye ọ bụ nakwa àgwà ndị o nwere.

GỊNỊ BỤ AHA CHINEKE? Aha Chineke bụ Jehova. O mere ka Chineke pụọ iche, meekwa ka a mata na ọ na-emezu nkwa ya