Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỤLỌ NCHE Nke 1 n'Afọ 2018 | Baịbụl Ọ̀ Ka Bara Uru Taa

BAỊBỤL Ọ̀ KA BARA URU TAA?

Ebe ọ bụ na kọmputa na nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ emeela ka ọ dị mfe mmadụ ịmata ọtụtụ ihe ọ chọrọ ịma, Baịbụl ò meela ochie nke na ọ baghịzi uru taa? Baịbụl kwuru, sị::

“Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru.”​—2 Timoti 3:16.

Ụlọ Nche a kwuru ihe ndị gosiri na Baịbụl ga-enyeliri anyị aka n’ihe niile anyị na-eme ná ndụ.

 

Ihe Ndị E Dere na Baịbụl Ọ̀ Ka Bara Uru Taa?

Ebe e nwere ọtụtụ ụzọ e si amata ihe ndị kacha ọhụrụ taa, gịnị mere mmadụ ga-eji gụwa akwụkwọ e dechara ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga?

Ihe Baịbụl Kwuru, Oge Ha Ọ̀ Gafeela?

O nweghị otú ihe ọhụrụ ndị a chọpụtarala taa si gosi na ihe Baịbụl kwuru abaghịzi uru. Kama, ọtụtụ ihe o kwuru gosiri na ọ ka na-aba uru taa.

Oge Ya Ọ̀ Gafeela Ka Ò Kwuru Ihe Ndị Mmadụ Mechara Mata na Ha Bụ Eziokwu?

Baịbụl abụghị akwụkwọ sayensị, ma ihe ndị o kwuru gbasara sayensị nwere ike iju gị anya.

1 Baịbụl Ga-enyere Gị Aka Izere Nsogbu

Lee otú Baịbụl sirila nyere ndị mmadụ aka izere nsogbu ụfọdụ siri ike.

2 Baịbụl Ga-enyere Gị Aka Ịkwụsị Nsogbu

Baịbụl na-enyere mmadụ aka ịkwụsị nsogbu ndị siri ezigbo ike, ndị dị ka, nchekasị, iyigharịkarị ihe, na owu ịma mmadụ.

3 Baịbụl Ga-enyere Gị Aka Idi Nsogbu

Ọ bụrụkwanụ nsogbu a na-agaghị ezereli ma ọ bụ kwụsị ugbu a, dị ka ọrịa na-ekweghị ala ma ọ bụ ọnwụ?

Uru Ihe Baịbụl Kwuru Ga-abara Gị n’Ọdịnihu

Okwu Chineke ga-enyeliri anyị aka ná nsogbu ndị anyị na-enwe kwa ụbọchị n’ụwa ọjọọ a. Ma, ọ na-agwakwa anyị na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu.

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Lee ihe ụfọdụ ndị na-ekwu, nakwa ihe Baịbụl kwuru gbasara ajụjụ a.