Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

2 Baịbụl Ga-enyere Gị Aka Ịkwụsị Nsogbu

2 Baịbụl Ga-enyere Gị Aka Ịkwụsị Nsogbu

E nwere nsogbu ndị mmadụ na-enwe, ya esiere ha ezigbo ike ịkwụsị ya. Ha nwere ike ịma mmadụ ahụ́ tupu ọ mata banyere ha. Baịbụl ò kwuru ihe ndị nwere ike inyere anyị aka ịkwụsị ụfọdụ n’ime nsogbu ndị a? Legodị ihe ụfọdụ ndị kwurula.

MMADỤ ỊNA-ECHEGBU ONWE YA

E nwere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Rosie. O kwuru, sị: “M na-echegbukarị onwe m gbasara ụfọdụ ihe ọjọọ ndị nwere ike ime echi. M na-eche ha karịa otú ha dị.” Olee amaokwu Baịbụl ndị nyeere ya aka? Otu n’ime ha bụ Matiu 6:34. Ebe ahụ sịrị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.” Rosie sịrị na ihe ahụ Jizọs kwuru nyeere ya aka ịkwụsị ichegbu onwe ya maka echi. O kwukwara, sị: “E nwere ọtụtụ nsogbu mụ na ha na-alụ, ma anaghịzi m echegbu onwe m gbasara ihe ndị na-emebeghị, ndị o nwekwara ike bụrụ na ha agaghị eme.”

Onye ọzọ aha ya bụ Yasmine chọpụtakwara na ya na-echegbukarị onwe ya. O kwuru, sị: “N’abalị ụfọdụ, m na-ebe ákwá, anaghịkwa m ehi ụra. M na-echegbu onwe m maka ihe nwere ike ime echi.” Olee amaokwu Baịbụl nyeere ya aka? O kwuru na ọ bụ ihe e dere na 1 Pita 5:7. Ebe ahụ sịrị: “Na-atụkwasịnụ [Chineke] nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.” Yasmine kwuru, sị: “Ka oge na-aga, m nọgidere na-arịọ Jehova ka o nyere m aka. Ọ zakwara ekpere m. Ọ bịaziri dị m ka e bupụrụ ibu na-anyịgbu m. Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, m na-amalitekwa chegbuwe onwe m, ma ugbu a, amatala m ihe m ga na-eme gbasara ya.”

IYIGHARỊ IHE

O nwere otu nwaanyị aha ya bụ Isabella. O kwuru, sị: “Ọ dị m ka mmadụ ịna-eyigharịkarị ihe o kwesịrị ime, na-esi n’ọbara n’ihi na papa m na-eyigharịkarị ihe. M na-eyigharịkarị ihe ndị m kwesịrị ime, naanị iji zuo ike ma ọ bụ lee tiivi. Omume a adịghị mma n’ihi na ọ na-eme ka mmadụ nwee ọtụtụ ihe ọ ga-eme otu mgbe, meekwa ka onye ahụ ghara ime ihe ahụ otú dị mma.” Ihe nyeere ya aka bụ ihe e kwuru na 2 Timoti 2:15. Ebe ahụ sịrị: “Gbalịsie ike ka i chee onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye ihe ya dị ya mma, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere.” Isabella kwuru, sị: “Achọghị m ka ọrụ m na-eme Jehova ihere n’ihi emeghị ihe mgbe m kwesịrị ime ya.” Ugbu a, Isabella na-emezi ihe mgbe o kwesịrị ime ya.

Kelsey kwuru na ya nwekwara ụdị nsogbu a. O kwuru, sị: “E nye m ihe m ga-eme, m na-eyigharịkarị oge m kwesịrị iji mee ya ruo mgbe oge gwụrụla agwụ. Ọ na-eme ka m na-ebe ákwá, na-echegbu onwe m, ụra anaghịkwa aga m n’anya. Ihe a dịghị mụ mma n’ahụ́.” Ihe Chineke kwuru n’Ilu 13:16 nyeere ya aka. Ebe ahụ sịrị: “Onye ọ bụla nke maara ihe ga-eji ihe ọmụma mee ihe, ma onye nzuzu ga-agbasa nzuzu ya ebe niile.” Kelsey kwuru ihe ọ mụtara mgbe ọ tụgharịrị uche n’ihe amaokwu Baịbụl a kwuru. Ọ sịrị: “Ọ dị mma mmadụ ịma ihe ndị ọ ga-emeli, nakwa ịhazi oge ọ ga-eji eme ihe ụfọdụ. Ugbu a, enwere m akwụkwọ m na-eji ede oge m kwesịrị iji rụọ ọrụ ndị m nwere. Ihe a emeela ka m na-enwe oge m kwesịrị iji eme ihe ọ bụla, gharakwa ịna-ahapụ ha ruo mgbe oge gwụrụ.”

OWU ỊMA MMADỤ

Otu nwaanyị aha ya bụ Kirsten kwuru, sị: “Di m hapụrụ m, hapụkwara m ụmụaka anọ.” Olee amaokwu Baịbụl nyeere ya aka? Ọ bụ Ilu 17:17. Ebe ahụ sịrị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” Kirsten gakwuuru ndị ya na ha so efe Jehova ka ha nyere ya aka. Olee otú ha si nyere ya aka? Ọ sịrị: “Ndị enyi m si ụzọ dị iche iche gbatara m ọsọ enyemaka. Ụfọdụ zụtaara anyị ihe e ji esi nri, ndị ọzọ ewetara anyị okooko osisi. Ọtụtụ n’ime ha bịara nyere mụ na ụmụ m aka ugboro atọ anyị akwafee n’ụlọ ọzọ. Otu onye chọtaara m ọrụ. Ha nyeere m aka n’oge niile ahụ.”

E nwekwara mgbe owu mara Delphine anyị kwuru gbasara ya ná mmalite. Mgbe nwa ya nwụrụ, di ya ahapụkwa ya, ọ sịrị: “M na-ahụ ndị ọzọ ka ha na ndị ezinụlọ ha bi ma na-enwe obi ụtọ. Ma, owu na-ama m, anaghịkwa m enwe obi ụtọ.” Otu n’ime amaokwu Baịbụl nyeere ya aka bụ Abụ Ọma 68:6. Ebe ahụ sịrị: “Chineke na-eme ka ndị nọ naanị ha biri n’ụlọ.” Delphine kwuru, sị: “Ama m na ụlọ ebe a na-ekwu abụghị naanị ụlọ nkịtị ma ọ bụ ezinụlọ. Kama m ghọtara na Chineke nyere anyị ezinụlọ Ndị Kraịst, ya bụ, ndị anyị na ha na-efekọ Jehova ọnụ. Obi na-eru anyị ala n’ezinụlọ a n’ihi na anyị na ndị ọzọ hụrụ Jehova n’anya na-abịa bụrụ ezigbo ndị enyi. Mana, ama m na mụ na ha agaghị adị ná mma ma ọ bụrụ na mụ ebughị ụzọ mee ka mụ na Jehova dịrị ná mma. Abụ Ọma 37:4 nyeere m aka ime ihe a. Ebe ahụ sịrị: ‘Ka ihe Jehova na-atọkwa gị ụtọ nke ukwuu, ọ ga-enyekwa gị ihe niile obi gị na-arịọ.’”

N’ikpeazụ Delphine kwuru, sị: “M chọpụtara na m kwesịrị ime ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma. E nweghị enyi dị ka Jehova. M bịaziri depụta ihe mụ na ndị ọzọ hụkwara Jehova n’anya nwere ike ịna-emekọ ọnụ, n’ihi na ọ ga-eme ka mụ na ha bụrụ enyi. M mụtara ịna-elekwasị anya ebe ndị ọzọ na-emeta, na-elegharakwa ebe ha na-anaghị emeta anya.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị na-efe Jehova ka bụ ndị na-ezughị okè. Ndịàmà Jehova na-enwekwa nsogbu otú ndị ọzọ na-enwe. Ma, ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru na-enyere ndị ọzọ aka mgbe ọ bụla o kwere ha mee. Ọ dị mma imeta ndị dị otú a enyi. Mana, ihe Baịbụl kwuru ò nwere ike inyere mmadụ aka ná nsogbu ndị ọ na-agaghị akwụsịli ugbu a, dị ka ọrịa na-ekweghị ala ala ma ọ bụ na mmadụ nwụnahụrụ ya?

Ime ihe Baịbụl kwuru ga-enyeliri gị aka imeta ezigbo ndị enyi