Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mmadụ Ịda Ogbenye Ọ̀ Na-egosi na Chineke Ahụghị Ya n’Anya?

Mmadụ Ịda Ogbenye Ọ̀ Na-egosi na Chineke Ahụghị Ya n’Anya?

Mmadụ Ịda Ogbenye Ọ̀ Na-egosi na Chineke Ahụghị Ya n’Anya?

CHINEKE gwara ụmụ Izrel oge ochie, sị: “Ọ dịghị onye kwesịrị ịda ogbenye n’etiti unu.” Nke a bụ n’ihi na n’Iwu o nyere ha, ọ gwara ha ka ha na-elekọta ndị ogbenye, gwakwa ha ka onye e ji ụgwọ kagbuo ụgwọ e ji ya kwa afọ asaa. (Diuterọnọmi 15:1-4, 7-10) N’ihi ya, e kwesịghị inwe ndị dara ogbenye n’etiti ụmụ Izrel, n’ihi na Jehova kwere nkwa ịgọzi ha. Ma, ngọzi ahụ ga-eru ụmụ Izrel aka naanị ma ọ bụrụ na ha erubere Iwu ahụ isi, bụ́kwanụ nke ha na-emeghị.

Ma, nke a apụtaghị na mmadụ daa ogbenye ya abụrụ na Chineke kpọrọ ya asị, otú ahụ ọ na-apụtaghị na mmadụ nwee ego ya abụrụ na Chineke hụrụ ya n’anya. Ọtụtụ ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi bụ ndị ogbenye. Emọs onye amụma bụ ogbenye nke na-akpa atụrụ ma na-arụrụ ndị mmadụ ọrụ n’ubi ha. (Emọs 1:1; 7:14) N’oge Ịlaịja onye amụma, mgbe ụnwụ dara n’Izrel, onye nọ na-enye Ịlaịja nri bụ otu ogbenye di ya nwụrụ, bụ́ onye Chineke mere ka obere ntụ ọka na mmanụ o nwere ghara ịgwụ agwụ n’oge ahụ. Ma Ịlaịja ma nwaanyị ahụ di ya nwụrụ enweghị nke bara ọgaranya; Jehova nyere ha naanị ihe ndị kacha ha mkpa.—1 Ndị Eze 17:8-16.

Ọdachi nwere ike ime ka ndị mmadụ daa ogbenye. Ihe ọghọm na ọrịa nwere ike ịkwụsịtụ mmadụ ọrụ ma ọ bụ mee ka onye ahụ kwụsịchaa ịrụ ọrụ. Ọnwụ nwekwara ike ịgbawa ụmụaka aka nne na nna, gbawakwa ụmụ nwaanyị aka di. Oké ọdachi ndị dị otú ahụ anadịghị egosi na Chineke kpọrọ mmadụ asị. Akụkọ Neomi na Rut gosiri nnọọ na Jehova na-eji ịhụnanya elekọta ndị nọ ná mkpa. N’agbanyeghị na ọnwụ di Neomi na nke di Rut mere ka ha nọrọ n’ụkọ, Jehova Chineke gọziri ha ma nye ha ihe ndị na-akpa ha.—Rut 1:1-6; 2:2-12; 4:13-17.

O doro anya na ịda ogbenye anaghị egosi na Chineke ahụghị mmadụ n’anya. Ihe a Eze Devid kwuru nwere ike ime ka obi sie ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ebe Jehova Chineke nọ ike: “Ọ dị mgbe m bụ nwata, emewokwa m agadi, ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ọ bụla bụ́ onye ezi omume kpamkpam, ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.”—Abụ Ọma 37:25.

[Foto dị na peeji nke 8]

Ọ bụ ezie na Neomi na Rut bụ ndị ogbenye nọ n’ụkọ, Chineke gọziri ha ma jiri ịhụnanya lekọta ha