Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Chineke ọ̀ na-anụ ekpere niile ndị mmadụ na-ekpe?

Chineke na-anụ ekpere ndị mmadụ na-ekpegara ya n’agbanyeghị ebe ha si. (Abụ Ọma 145:18, 19) Okwu ya, bụ́ Baịbụl, gwara anyị ka anyị kọọrọ ya ihe ọ bụla na-echegbu anyị. (Ndị Filipaị 4:6, 7) Ma, e nwere ekpere ndị na-anaghị adị Chineke mma. Dị ka ihe atụ, ekpere ndị mmadụ bu n’isi na-ekpe ugboro ugboro anaghị amasị Chineke.—Gụọ Matiu 6:7.

Ihe ọzọkwa bụ na Jehova anaghị anụ ekpere nke ndị kpachaara anya na-enupụrụ ya isi. (Ilu 28:9) Dị ka ihe atụ, n’oge Baịbụl, Chineke ekweghị aza ekpere ndị Izrel gburu ọchụ. O doro anya na o nwere ihe ndị anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-anụ ekpere anyị.—Gụọ Aịzaya 1:15.

Gịnị ka anyị kwesịrị ime ka Chineke na-anụ ekpere anyị?

Anyị kwesịrị inwe okwukwe na Chineke ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọ nụ ekpere anyị. (Jems 1:5, 6) Anyị ga-ekwetasi ike na Chineke dị nakwa na ọ hụrụ anyị n’anya. Anyị nwekwara ike ime ka okwukwe anyị sie ike. Otú anyị ga-esi eme ya bụ na anyị ga na-amụ Baịbụl n’ihi na ọ bụ ihe ndị anyị na-amụta na ya ga-eme ka anyị nwee ezigbo okwukwe.—Gụọ Ndị Hibru 11:1, 6.

Anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma jiri obi anyị niile na-ekpegara Chineke ekpere. Ekpere Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs, kpegaara Chineke gosiri na ọ dị umeala n’obi. (Luk 22:41, 42) N’ihi ya, anyị kwesịrị ibu ụzọ mata uche Chineke tupu anyị agwawa ya ihe anyị chọrọ ka o meere anyị. Otú anyị ga-esi amata uche Chineke bụ ịmụ Baịbụl. Anyị mee otú ahụ, ekpere anyị ga na-adaba n’uche Chineke.—Gụọ 1 Jọn 5:14.