Gaa n'Isiokwu

Okpukpe Ndịàmà Jehova Ọ̀ Bụ Okpukpe Ndị Amerịka?

Okpukpe Ndịàmà Jehova Ọ̀ Bụ Okpukpe Ndị Amerịka?

 Isi ụlọ ọrụ anyị dị n’Amerịka. Ma, ọ pụtaghị na okpukpe anyị bụ okpukpe ndị Amerịka. Lee ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ:

  •   O nweghị chọọchị okpukpe Ndịàmà Jehova si na ya pụta. Kama Ndịàmà Jehova bidoghachiri otú Ndị Kraịst si efe Chineke n’oge ndịozi Jizọs.

  •   Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma ná mba karịrị narị abụọ na iri atọ. N’agbanyeghị mba anyị bi, mkpa anyị bụ irubere Jehova Chineke na Jizọs Kraịst isi, ọ bụghị ọchịchị mba Amerịka ma ọ bụkwanụ ọchịchị mba ọ bụla ọzọ.—Jọn 15:19; 17:15, 16.

  •   Ihe niile anyị na-akụzi si na Baịbụl, ọ bụghị ihe nwoke onye Amerịka dere.​—1 Ndị Tesalonaịka 2:13.

  •   O nweghị mmadụ ọ bụla bụ onye isi anyị. Ọ bụ Jizọs Kraịst bụ onye isi anyị.​—Matiu 23:8-10.