Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Agbanweela Ihe E Dere na Baịbụl Ka Ọ Daba n’Ihe Ha Kweere

Ndịàmà Jehova Hà Agbanweela Ihe E Dere na Baịbụl Ka Ọ Daba n’Ihe Ha Kweere

 Mba. Anyị emetụbeghị ụdị ihe ahụ. Kama ime otú ahụ, ihe anyị na-eme bụ ịgbanwe ihe anyị kweere ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na ọ dabachaghị n’ihe e dere na Baịbụl.

 Tupudị anyị ebido ibipụta Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’afọ 1950, anyị na-agụ Baịbụl ndị ọzọ. Anyị lebara anya ná nsụgharị Baịbụl ọ bụla ruru anyị aka ma si na ha nweta ihe ndị anyị kweere. Lee ihe ụfọdụ Ndịàmà Jehova kweere kemgbe ọtụtụ afọ. Jirizie aka gị chọpụta ma hà dabara n’ihe Baịbụl na-akụzi.

  1.   Ihe anyị kweere: Chineke abụghị Atọ n’Ime Otu. Ụlọ Nche bekee nke July 1882 kwuru, sị: “Ndị na-agụ akwụkwọ anyị maara na anyị kweere na Jehova, kwerekwa na Jizọs nakwa ná Mmụọ nsọ. Ma, ha ma na anyị ekweghị na ha bụ Chi atọ dị n’ime otu onye, ma ọ bụkwanụ, dị ka ụfọdụ si ekwu ya, otu Chi nwere ụdị atọ n’ihi na ọ dịghị n’Akwụkwọ Nsọ.”

      Ihe Baịbụl kwuru: “Jehova, bụ́ Chineke anyị, Jehova bụ otù.” (Diuterọnọmi 6:4, Bible Nsọ nke Union Version) “Ma n’ebe ayi nọ otù Chineke di, bú Nna, onye ihe nile sitere na Ya; Onye ayi onwe-ayi di-kwa-ra Ya; otù Onye-nwe-ayi di kwa, bú Jisus Kraist, Onye ihe niile sitere n’aka-Ya, ayi onwe-ayi site-kwa-ra n’aka-Ya.” (1 Ndị Kọrịnt 8:6, Bible Nsọ nke Union Version) Jizọs n’onwe ya kwukwara, sị: “Nna m dị ukwu karịa m.”​—Jọn 14:28, Bible Nsọ Ọhụụ.

  2.   Ihe anyị kweere: O nweghị ihe dị ka ọkụ ala mmụọ ebe a na-ata ndị mmehie ahụhụ ebighị ebi. Isiokwu Ụlọ Nche Bekee June 1882 bụ “Ụgwọ Ọrụ nke Mmehie Bụ Ọnwụ.” O si ná Ndị Rom 6:​23 na Bible King James. Ụlọ Nche ahụ sịrị: “Ihe a bụ okwu doro anya dịkwa mfe nghọta. Ma, ọ dị ịtụnanya na ọtụtụ ndị sị́ na ha were Baịbụl ka Okwu Chineke na-ekwu ihe megidere ihe a Baịbụl kwuru. Ha kweere ma na-ekwusi ike na Baịbụl na-akụzi na ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ntaramahụhụ ebighi ebi.”

      Ihe Baịbụl kwuru: “Mkpụrụ obi ọbụla meghierenụ ga-anwụ.” (Ezikiel 18:​4, 20, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Ihe Chineke ga-eme ndị nupụụrụ ya isi abụghị inye ha ntaramahụhụ ebighị ebi. Kama ọ bụ “mbibi ebighị ebi.”​—2 Ndị Tesalonaịka 1:9, Bible Nsọ Ọhụu.

  3.   Ihe anyị kweere: Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị. Ọ bụghị ihe dị mmadụ n’obi. Ụlọ Nche Bekee Disemba 1881 kwuru banyere Alaeze Chineke, sị: “Nguzobe nke ala-eze nka gabu nkwatu nke ala-eze nile nke uwa.”

      Ihe Baịbụl kwuru: “N’oge ndị ọchịchị ndị a, Chineke nke elu igwé ga-eme ka otu ala eze bilie, nke na-agaghị emebi emebi rue mgbe ebighị ebi. Ọ dịghịkwa mba ga-emeri ya, nara ya ọbụbụ-eze ya. Ọ ga-etipịa ala eze ndị a nile, mee ka ha ghara ịdị. Ala eze ahụ n’onwe ya ga-eguzosikwa ike rue mgbe ebighị ebi.”​—Daniel 2:​44, Bible Nsọ Ọhụụ.

Ọ̀ bụ naanị Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ka Ndịàmà Jehova ji akwado ihe ndị ha kweere?

 Mba. Anyị ka na-eji nsụgharị Baịbụl ndị ọzọ ekwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ọ bụ eziokwu na anyị na-enye ndị anyị na ha na-amụ Baịbụl Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’efu, ma mmadụ chọọ ka anyị jiri Baịbụl ọzọ mụọrọ ya ihe, anyị na-eme otú ahụ.