Gaa n'Isiokwu

Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Enweta Ego Ha Ji Arụ Ọrụ Ha?

Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Enweta Ego Ha Ji Arụ Ọrụ Ha?

 Ebe kachanụ anyị si enweta ego anyị ji arụ ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile bụ n’onyinye Ndịàmà Jehova a na-enye. A na-edowe igbe i nwere ike itinye onyinye gị n’ebe ndị anyị na-anọ amụ ihe, e depụtakwara ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi nye onyinye gị na peeji ebe i nwere ike ịnọ nye onyinye. E nwere ụzọ dị iche iche onye chọrọ inye onyinye nwere ike isi nye onyinye maka ọrụ zuru ụwa ọnụ anyị na-arụ, nakwa maka ego ndị a na-emefu n’ọgbakọ, ma ọ bụkwanụ maka ha abụọ.

 O nweghị ego ole a na-atụ anya ka Onyeàmà Jehova ọ bụla na-enye, o nweghịkwa onye a na-asị weta otu ụzọ n’ụzọ iri. (2 Ndị Kọrịnt 9:⁠7) Anyị anaghị ebugharị efere onyinye n’ọmụmụ ihe anyị ma ọ bụ sị mmadụ kwụọ ụgwọ tupu o soro n’ọmụmụ ihe anyị. Anyị anaghịkwa ana ego maka baptizim, olili ozu, agbamakwụkwọ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. Anyị anaghị eme bazaa, ma ọ bụ ịgba chaa chaa ma ọ bụ ihe ndị yiri ya e ji achụ nta ego. Anyị anaghịkwanụ arịọ ndị mmadụ ka ha bịa nye onyinye. Anaghị akpọ aha onye nyere onyinye ma ọ bụ mee ka ọhaneze mara ndị nyere onyinye. (Matiu 6:​2-4) Anyị anaghị esi n’ebe anyị na-agbasa ozi n’Ịntanet ma ọ bụ n’akwụkwọ anyị akpọsara ndị mmadụ ngwá ahịa ha ka ha nwee ike kwụọ anyị ụgwọ.

 N’ọgbakọ Ndịàmà Jehova ọ bụla, a na-akọrọ ndị bịara ọmụmụ ihe otú ego ndị e nwetara n’ọgbakọ ha si gaa n’ọnwa ọ bụla. Onye ọ bụla nwere ike ịbịa ọmụmụ ihe ahụ. A na-elebakwa anya n’otú e si mefuo ego ndị e nyere n’onyinye mgbe mgbe ka e nwee ike hụ na e ji ego ndị a natara na-eme ihe otú kwesịrị ekwesị.​—⁠2 Ndị Kọrịnt 8:​20, 21.

Ụzọ Ndị I Nwere Ike Isi Nye Onyinye

  •   Igbe onyinye: I nwere ike itinye ego ma ọ bụ akwụkwọ e ji adọrọ ego n’igbe onyinye ndị dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị na n’Ụlọ Mgbakọ anyị ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ anyị na-anọ enwe ọmụmụ ihe.

  •   Isi n’Ịntanet enye onyinye: N’ọtụtụ mba, i nwere ike isi n’adres Ịntanet anyị nye onyinye. Ebe ị ga-aga bụ n’ebe e dere “Donate to Jehovah’s Witnesses” ka i nye onyinye gị ebe ahụ. I nwere ike isi n’otu ụlọ akụ̀ wefee ego n’ụlọ akụ̀ ọzọ. I nwekwara ike iji kaadị ATM, ma ọ bụ si n’ụzọ ọ bụla ọzọ e si ezigara onye ọzọ ego. b Ụfọdụ Ndịàmà Jehova na-ekpebi inwe ego ha ‘wepụtara’ ha ga na-enye kwa ọnwa. Ha na-esi n’otu n’ime ụzọ ndị a e kwuru e si enye onyinye n’Ịntanet enye ya.​—⁠1 Ndị Kọrịnt 16:⁠2.

  •   Onyinye a na-ebu ụzọ haziere ihe ụfọdụ: E nwere ụdị ihe ọ ga-abụ ị chọọ inye, ya abụrụ na ị ga-ebugodị ụzọ hazie ihe ụfọdụ ma ọ bụdị ya adị mkpa ka ọkàiwu nye aka. Ụdị onyinye a nwere ike ime ka e sepụrụ gị ego n’ụtụ isi i kwesịrị ịkwụ n’obodo unu. Ọ baarala ọtụtụ ndị uru mgbe ha ghọtakwuru otú e nwere ike isi nye onyinye mgbe onye na-enye ya ka dị ndụ ma ọ bụ ndị nke onye ahụ kwuru ka e were ma ọ nwụọ. Biko jụọ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị nso ebe i bi ma ọ bụrụ na ị chọrọ inye onyinye ndị gbasara:

    •   ego e dowere n’ụlọ akụ̀

    •   ịnshọransị na ego ezumike nká

    •   ala na ụlọ

    •   aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego

    •   ike ékpé na ihe e nyere mmadụ ka o jide

Ị chọọ ịmatakwu ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi nye onyinye n’ebe i bi, gaa n’ebe e dere “Donate to Jehovah’s Witnesses.”

a Ụfọdụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-enyekwa onyinye ha ji akwado ọrụ anyị.

b Kirie vidio Otú E Si Esi na Kọmputa ma Ọ Bụ n’Ekwentị Enye Onyinye ka ị ghọtakwuo otú e si eme ya.