Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe a na-akụziri ụmụ akwụkwọ Gilied ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied e nwere n’afọ 2017

IHE NDỊ E JI ONYINYE I NYERE EME

Ụlọ Akwụkwọ Gilied Na-azụ Ndị Si Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa

Ụlọ Akwụkwọ Gilied Na-azụ Ndị Si Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa

DISEMBA 1, 2020

 N’afọ ọ bụla, a na-akpọ ụfọdụ ndị ozi oge niile pụrụ iche nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa ka ha gaa Ụlọ Akwụkwọ Gilied n’Ogige Ụlọ Akwụkwọ Watchtower dị na Patasịn, nke dị na Niu Yọk. a N’ụlọ akwụkwọ a, a na-akụziri ụmụ akwụkwọ otú ha ga-esi na-emekwu nke ọma n’ọrụ ndị ha na-arụ ná nzukọ Jehova. Ihe a na-akụziri ha na-enyere ha aka ime ka ọgbakọ na alaka ụlọ ọrụ dị n’ebe dị iche iche n’ụwa sikwuo ike ma kwụrụ chịm.

 N’eziokwu, Ụlọ Akwụkwọ Gilied bụ ụlọ akwụkwọ ndị si n’ebe dị iche iche n’ụwa na-aga. Dị ka ihe atụ, na klas nke otu narị na iri anọ na asaa, nke e nwere n’afọ 2019, ndị gara ya dị mmadụ iri ise na isii. Ha si mba iri abụọ na itoolu. Ụmụ akwụkwọ ndị na-aga Ụlọ Akwụkwọ Gilied bụ ndị ozi oge niile pụrụ iche, dị ka ndị ozi Betel, ndị nlekọta sekit, ndị ozi ala ọzọ, ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche.

 A na-akwadebe maka klas nke ọ bụla ogologo oge tupu oge ọ ga-amalite eruo. Dị ka ihe atụ, ngalaba na-ahụ maka ime njem n’isi ụlọ ọrụ anyị na-agbatara ndị ga-aga ụlọ akwụkwọ a tiketi ụgbọelu. Na klas nke otu narị na iri anọ na asaa, ihe e mefuru maka nwa akwụkwọ nke ọ bụla iji bịa Patasịn laakwa bụ ihe dị ka $1,075 (nke Amerịka). Ụmụ akwụkwọ ndị si Solomọn Aịlandz gbara ụgbọelu ugboro anọ iji rute Patasịn, gbaakwa ụgbọelu ugboro atọ iji laghachi. Ihe niile ha gbara karịrị kilomita puku iri atọ na ise na narị anọ. Ihe e mefuru n’ego ụgbọelu n’isi onye nke ọ bụla n’ime ha ruru $2,300 (nke Amerịka). Iji belata ego a na-emefu, ngalaba ahụ na-ahụ maka ime njem n’isi ụlọ ọrụ anyị na-eji ngwá ọrụ kọmputa e ji agbata tiketi ụgbọelu achọta tiketi ndị dị ọnụ ala. Ha chọtagodị tiketi ụfọdụ, ngwá ọrụ kọmputa ahụ ka ga na-elekwa ọnụ ego tiketi ndị ahụ ruo ọtụtụ izu ma ọ bụ ọtụtụ ọnwa iji mara ma hà agbadaala. E nwekwara ndị na-eji ihe ndị ha ritere n’ime njem n’ụgbọelu enye onyinye. Ngalaba a na-ejikwa ihe ndị a agbata tiketi ụgbọelu.

 Ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ ga-enwekwa visa tupu ha abata n’Amerịka. N’ihi ya, ngalaba na-ahụ maka okwu iwu n’isi ụlọ ọrụ anyị na-enyere ha aka inweta visa. Ego a na-emefu n’inwetara nwa akwụkwọ nke ọ bụla visa na-eru ihe dị ka $510 (nke Amerịka).

 Olee otú ọzụzụ a na-enye ụmụ akwụkwọ ndị a si abara anyị uru? Otu okenye na-eje ozi n’ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia aha ya bụ Hendra Gunawan nọ n’ọgbakọ e nwere di na nwunye gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied. O kwuru, sị: “Na mbụ, anyị enweghị ndị ọsụ ụzọ oge niile n’ọgbakọ anyị. Ma, mgbe di na nwunye ahụ gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied batara n’ọgbakọ anyị, otú ha si anụ ọkụ n’obi n’ozi Chineke mere ka ụmụnna ụfọdụ kpebie ịmalite ọrụ ọsụ ụzọ oge niile. Otu nwanna nwaanyị n’ọgbakọ anyị mechadịrị gaa Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze.”

 Nwanna Sergio Panjaitan na ụmụnna ụfọdụ gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied na-arụkọ ọrụ na Betel dị n’ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Eshia. O kwuru, sị: “Ọ bụghị naanị ha ka ọzụzụ ha nwetara n’ụlọ akwụkwọ ahụ baara uru, ọ baakwara anyịnwa uru. A kụziiri ha ọtụtụ ihe. Ma, o meghị ka ha chewe na ha ka ndị ọzọ, kama, ha na-akụziri ndị ọzọ ihe ndị ha mụtara. Ihe a ha na-eme na-agba anyị ume, anyịnwa esikwa otú ahụ gbaa ndị ọzọ ume.”

 Olee otú anyị si enweta ego maka ụlọ akwụkwọ a? Anyị na-esi n’onyinye ndị a na-enye maka ọrụ anyị na-arụ n’ụwa niile enweta ya. A na-esi n’otu n’ime ụzọ ndị e kwuru banyere ha na donate.dan124.com. enye ọtụtụ n’ime onyinye ndị a. Anyị na-ekele gị maka onyinye ndị ị na-enye iji kwado ụlọ akwụkwọ a.

a Ndị na-ahazi ihe a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ a bụ ndị nọ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova, nke Kọmitii Izi Ihe nke Òtù Na-achị Isi na-elekọta. Ọ bụ ndị nọ ná ngalaba a na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ a. Ma, a na-akpọkwa ndị ọzọ, dị ka ndị So n’Òtù Na-achị Isi, ka ha kụzie ihe mgbe ụfọdụ.