Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E JI ONYINYE I NYERE EME

Chanel Satelaịt E Si Enweta Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova Na-erute Ebe Ịntanet Na-anaghị Eru

Chanel Satelaịt E Si Enweta Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova Na-erute Ebe Ịntanet Na-anaghị Eru

EPREL 1, 2021

 N’ọnwa ọ bụla, ọ na-agụ anyị agụụ ile Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova nakwa vidio dị iche iche e ji akụziri anyị Baịbụl. Ma, ọtụtụ ụmụnna anyị n’Afrịka anaghị enwe ike isi n’Ịntanet ele ihe ndị a. N’ihi gịnị?

 Ịntanet adịghị n’ọtụtụ ebe n’Afrịka. E nwetakwanụ ya n’ebe ụfọdụ, ọ naghị esicha ike. O nwekwara ike iri nnukwu ego. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe otu onye nlekọta sekit na Madagaska chọrọ isi n’Ịntanet were otu Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova, ya agaa n’ebe a na-akwụ ụgwọ enweta Ịntanet, ma, naanị iwere Ihe Omume Tiivi ahụ furu ya ihe dị ka puku naịra asaa (₦7,000). Ego a karịrị ihe ụfọdụ ndị na-arụta n’otu izu.

 N’agbanyeghị ihe ndị a, ọtụtụ nde ụmụnna anyị nọ n’Afrịka nwere ike ile Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova ugbu a n’ejighị Ịntanet. Olee otú o si ekwe omume?

 Kemgbe afọ 2017, anyị na-esi n’otu chanel a na-enweta na satelaịt eme ka ndị nọ ná mba Afrịka ndị dị na ndịda Sahara nweta Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova. Ọ naghị efu ego iji lee ihe ọ bụla na chanel a. A na-egosi ihe na ya mgbe ọ bụla nakwa n’ụbọchị ọ bụla n’asụsụ iri na isii.

Ebe ụmụnna nwoke na Mozambik na-edozigharị ihe e tinyere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze e ji enweta chanel satelaịt anyị. Ọ bụ n’afọ 2018

 Iji hụ na ihe a kwere omume, Ndịàmà Jehova na-akwụ otu ụlọ ọrụ tiivi ụgwọ ka ha si na chanel satelaịt ha na-egosi ihe omume ha. Mba iri atọ na ise nọ na ndịda Sahara nke dị n’Afrịka na-esi na chanel satelaịt a enweta ihe omume a. A na-akwụ ụlọ ọrụ tiivii a ego karịrị nde naịra ise (₦5,000,000) n’ọnwa ọ bụla. A na-etinyekwa ego n’ego a na-akwụ ha mgbe ọ bụla anyị chọrọ igosi ihe omume pụrụ iche ka ha nwee ike isi na chanel satelaịt ọzọ gosi ihe omume ahụ. Ihe a na-eme ka ọtụtụ ndị nwee ike ile ihe omume mgbakọ ukwu anyị ma ọ bụ ihe omume pụrụ iche e si n’alaka ụlọ ọrụ anyị na-eme.

Ebe ụmụnna ndị na-arụrụ anyị Ụlọ Nzukọ Alaeze na Malawi na-ele ihe omume a na-egosi na chanel satelaịt anyị. Ọ bụ n’afọ 2018

 Ọtụtụ ndị, ma ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova, na-ele ihe omume ndị a na-egosi na chanel a n’ụlọ ha. Ma, ọtụtụ ụmụnna anyị enweghị ego ha ga-eji azụta ihe e ji enweta chanel satelaịt a n’ụlọ ha. Iji nyere ụmụnna anyị ndị a aka, e tinyere ihe ga-eme ka a na-enweta chanel satelaịt a n’Ụlọ Nzukọ Alaeze karịrị puku atọ, narị isii na iri asaa (₦3,670) ka ụmụnna nwee ike ịna-aga n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ele Ihe Omume Tiivi anyị. Ma ngwongwo ndị e ji rụọ ọrụ ahụ ma ibute ha furu ihe dị ka puku naịra iri atọ (₦30,000) ma ọ bụrụ na tiivii na ihe ọzọ ga-eme ka satelaịt ahụ rụọ ọrụ nke ọma dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ihe ndị a adịghị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, ego ọ na-efu bụ ihe dị ka narị puku naịra abụọ na iri puku atọ na puku atọ (₦233,000).

 Obi na-atọ ụmụnna anyị ezigbo ụtọ maka chanel a. Otu okenye na Kameruun kwuru, sị: “Ọ dị ka mana e dosaara ezinụlọ anyị n’ọzara.” Otu nwanna nwoke onye Naịjirịa aha ya bụ Odebode kwuru, sị: “Ugboro atọ n’izu ọ bụla, anyị na-anọkọ ọnụ n’ezinụlọ anyị ele ihe ndị a na-eme na chanel a. Ọ na-adị ụmụ m atọ ka oge ndị anyị wepụtara anyị ji ele ya ruwe eru. Ha na-achọdị ka a na-agbanye chanel ahụ n’oge ndị ọzọ.” Nwanna ọzọ bikwa na Naịjirịa aha ya bụ Rose, kwuru, sị: “Kama ịna-ele akụkọ ụwa na tiivii mgbe niile, ihe na-atọzi m ụtọ bụ ile Ihe Omume Tiivii Ndịàmà Jehova a na-egosi na chanel satelaịt a. Ihe ndị m na-ahụ mgbe m na-ele akụkọ ụwa na tiivii na-eme ka obi na-ajọ m njọ, na-emekwa ka m na-enwe ọbara mgbali elu. Ma, Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova na-agba m ume, na-emekwa ka obi ruo m ala. Ọ bụ chanel ihe omume tiivii a kacha atọ m ụtọ. N’eziokwu, Jehova ejirila ya gọzie anyị.”

Ebe otu ezinụlọ na Malawi na-ele vidio e ji akụziri ụmụaka ihe na chanel satelaịt anyị

 Otu onye nlekọta sekit na Mozambik kwuru na e nweela ihe ahụ e ji enweta chanel ihe omume tiivii anyị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị na sekit ha. Ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ndị ahụ na-abịa ọmụmụ ihe ma ọ fọ otu awa ma ọ bụ karịa tupu ọmụmụ ihe amalite ka ha nwee ike lee Ihe Omume Tiivi anyị na chanel satelaịt a. 

Ebe obi na-atọ ndị nọ n’otu ọgbakọ dị n’Itiopia ụtọ na ha lere Ihe Omume Tiivi anyị n’ọnwa ahụ n’ejighị Ịntanet. Ọ bụ n’afọ 2018

 N’afọ 2019, ọ bụ chanel satelaịt a ka e ji gbasaara ndị nọ n’ebe itoolu ndị ọzọ okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ e kwuru ná mgbakọ mba niile e nwere na Johanesbọg dị na Saụt Afrịka, ma nke ndị So n’Òtù Na-achị Isi kwuru. Otu nwanna na-arụ ná Ngalaba Na-ahụ Maka Ịgbasa Ihe Omume n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Saụt Afrịka kwuru, sị: “Mgbe mbụ, ọ bụ n’Ịntanet ka anyị na-esi agbasa ihe omume anyị. Ma, ọ na-achọ Ịntanet siri ezigbo ike, ọ na-efukwa ezigbo ego. Chanel satelaịt a anyị si na ya agbasa ihe omume anyị na-aka adị ọnụ ala, na-erukwa n’ọtụtụ ebe.”

 Anyị na-ekele gị maka onyinye ndị i si n’obi gị na-enye iji kwado ọrụ zuru ụwa ọnụ. O meela ka ọtụtụ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị nọ n’Afrịka nwee ike ịna-ele Ihe Omume Tiivi anyị na chanel satelaịt. Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka onyinye i si na donate.dan124.com enye, bụ́ ebe anyị nwere ụzọ dị iche iche e si enye onyinye na ya.