Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA! A

Otú Ị Ga-esi Akwụsị Àgwà Ririla Gị Ahụ́

Otú Ị Ga-esi Akwụsị Àgwà Ririla Gị Ahụ́
  • OZUGBO elekere Austin kụrụ mgbịrịmgba n’ụtụtụ, o biliri n’agbanyeghị na ụra ka na-atụ ya. O yiiri ákwà ọ ga-eji emega ahụ́ ọ chịpụtara n’abalị, gaa gbatụ obere ọsọ. Ọ na-eme ihe a ugboro atọ n’izu ọ bụla kemgbe otu afọ.

  • Mgbe Laurie na di ya sere okwu, o ji iwe pụọ, gaa n’usekwu ya, mepee ebe ọ na-ekposa swiit ma rachaa ha niile. Ọ bụ ihe a ka ọ na-eme mgbe ọ bụla iwe ji ya.

E nwere ike ikwu na Austin na-eme ka Laurie. Onye nke ọ bụla n’ime ha nwere àgwà marala ya ahụ́. O nwedịrị ike ịbụ na ha amaghị na ọ marala ha ahụ́.

Oleekwanụ maka gịnwa? Ò nwere àgwà ọma ndị ị chọrọ ibido kpawa? O nwere ike ịbụ na ị chọrọ ịna-emegakwu ahụ́, chọọ ịna-ehikwu ụra, ma ọ bụkwanụ chọọ ịna-akpọkwu ndị ikwu na ibe gị n’ekwentị.

O nwekwara ike ịbụ na ị chọrọ ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị dị ka ịṅụ sịga, iri nri ndị na-anaghị edozi ahụ́ ma ọ bụkwanụ ịnọ n’Ịntanet mgbe niile.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ịkwụsị àgwà ọjọọ adịghị mfe. Ọtụtụ ndị achọpụtala na ịmụta àgwà ọjọọ dị mfe, ma ịkwụsị ya akwụsị na-ara ahụ́.

Olee otú mmadụ ga-esi akwụsị àgwà ọjọọ ririla ya ahụ́ ma kpawa àgwà ọma ga-abara ya uru? Lee ihe atọ nwere ike inyere mmadụ aka. E si n’ihe Baịbụl kwuru nweta ha.