Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE ONYEÀMÀ JEHOVA NA ONYE AGBATA OBI YA NWERE IKE ỊKPARỊTA

Olee Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-echeta Ọnwụ Jizọs?

Olee Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-echeta Ọnwụ Jizọs?

N’ebe a, e dere ihe Onyeàmà Jehova na onye agbata obi ya nwere ike ịkparịta. Ka anyị were ya na Onyeàmà Jehova aha ya bụ Magret gara ozi ọma n’ụlọ otu nwaanyị aha ya bụ Sharon.

“NA-EMENỤ NKE A KA UNU WEE NA-ECHETA M”

Magret: Sharon ndaa? Ị gbalịala bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs ahụ anyị mere n’izu gara aga. * Olee otú i si hụ ya?

Sharon: Ọ dị mma. Mana aghọtachaghị m ihe niile e kwuru. Ama m na ndị mmadụ na-agba Krismas iji cheta ọmụmụ Jizọs, na-agbakwa Ista iji cheta mbilite n’ọnwụ ya, ma amaghị m na e nwere ndị na-echeta ọnwụ ya.

Magret: Ọọ eziokwu na ọtụtụ ndị na-agba Krismas na Ista taa, ma Ndịàmà Jehova chere na ọ dị mkpa icheta ọnwụ Jizọs. Ọ bụrụ na i nwetụrụ obere oge, m ga-achọ igosi gị ihe mere ha ji chee otú ahụ.

Sharon: Nsogbu adịghị. O nweghị ihe m na-eme ugbu a.

Magret: Ihe bụ́ isi mere Ndịàmà Jehova ji echeta ọnwụ Jizọs bụ na Jizọs nyere ụmụazụ ya iwu ka ha na-eme otú ahụ. Ka anyị lebatụ anya n’ihe mere n’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs. Ì chetara na ya na ndị na-eso ụzọ ya riri nri pụrụ iche n’abalị ahụ?

Sharon: Ị̀ na-ekwu Oriri Nsọ?

Magret: Ọọ ya. Baịbụl kpọrọ ya Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị. O nwere ihe Jizọs gwara ụmụazụ ya ka ha nọ na-eri nri anyasị ahụ. Gụtụnụ ya na Luk 22:19.

Sharon: Nsogbu adịghị. Ọ sịrị: “O wee were otu ogbe achịcha, kelee Chineke, nyawaa ya, ma were ya nye ha, sị: ‘Nke a pụtara ahụ́ m nke a gaje inye n’ihi unu. Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.’”

Magret: Ndeewo. Ọ̀ kwa ị hụrụ ihe Jizọs kwuru ná ngwụcha amaokwu ahụ? Ọ sịrị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” Ma, tupu Jizọs agwa ụmụazụ ya ihe a, ọ gwara ha ihe ha ga na-echeta banyere ya. Ọ gwara ha na ya gaje inye ndụ ya maka ha. Jizọs kwukwara ihe yiri ya na Matiu 20:28. Ebe ahụ sịrị: “Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” Ọ bụ ihe a mere Ndịàmà Jehova ji ezukọ n’afọ ọ bụla echeta àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ maka anyị. Ọnwụ ya a ga-emeli ka ndị ezi omume niile dị ndụ ebighị ebi.

GỊNỊ MERE O JI DỊ MKPA KA A GBAPỤTA ANYỊ?

Sharon: Anụla m ka ndị mmadụ na-ekwu na Jizọs nwụrụ ka anyị nwee ike ịdị ndụ. Ma, ịgwa gị eziokwu, aghọtachabeghị m otú o si bụrụ na ọ nwụrụ ka anyị nwee ike ịdị ndụ.

Magret: O nwekwara ndị ọzọ ọ dị otú a ọ dị gị. Ihe gbasara àjà mgbapụta Jizọs na-esitụ ike nghọta. Mana, o so n’ihe ndị kacha atọ ụtọ dị n’Okwu Chineke. Amaghị m ma ị̀ ka nwetụkwuru oge ka anyị kwutụkwuo gbasara ya.

Sharon: Nsogbu adịghị. Ka anyị kwutụkwuo.

Magret: I meela. Ọ dịbeghị anya m gụrụ ihe ụfọdụ gbasara àjà mgbapụta Jizọs. M ga-agbalị kọwaara gị ya otú ọ ga-adịrị gị mfe nghọta.

Sharon: Ngwanụ.

Magret: Otu ihe ga-enyere anyị aka ịghọta ya bụ ibugodị ụzọ ghọta nsogbu Adam na Iv kpatara mgbe ha mehiere Chineke n’ogige Iden. Ndị Rom 6:23 ga-enyere anyị aka ịghọta ya. Gụtụnụ ebe ahụ.

Sharon: Ọ dị mma. Ọ sịrị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.”

Magret: I meela. Ka anyị leruo ihe a amaokwu a kwuru anya nke ọma. I lee anya, ị ga-ahụ na ihe mbụ o kwuru bụ na “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ.” Mgbe Chineke kere mmadụ, o kwukwara na o mee mmehie na ọ ga-anwụ. Ma, o nweghị onye bụ́ onye mmehie mgbe ahụ. Mgbe e kere Adam na Iv, ha zuru okè, ụmụ ha gakwaara ezu okè. N’ihi ya, o nweghị ihe gaara eme ka hanwa ma ọ bụ ụmụ ha nwụọ. Ha na ụmụ ha gaara adịrị ndụ na-aga, na-enwe obi ụtọ. Ma, ị manụ na ihe niile bịara ghịghaa.

Sharon: Ọọ eziokwu. Adam na Iv gara rie mkpụrụ osisi a sịrị ha erila.

Magret: Ọọ ya. Ha si otú ahụ nupụrụ Chineke isi ma mee mmehie. Ọ pụtara na ha ji aka ha kpebie ịghọ ndị mmehie na ndị na-ezughị okè. Ihe a ha kpebiri ime ga-ewetara ma ha ma ụmụ ha ezigbo nsogbu.

Sharon: Olee otú ọ ga-esi ewetara ụmụ ha nsogbu?

Magret: O nwere ihe atụ ga-enyere anyị aka ịghọta ya. Ị̀ na-esi maị maị?

Sharon: Ọ dị ka ị̀ ma. M na-esi ya mgbe ụfọdụ.

Magret: Ka e were ya na o nwere kom kom ndị ọhụrụ i nwetara ị ga-eji na-esi maị maị. Ma, tupu gị ejiri ha sie maị maị, otu n’ime ha adaa n’ala kụkpọọ. I jiri nke ahụ kụkpọrọ akụkpọ na-esi maị maị, olee otú maị maị i ji ya sie ga-adị? Ọ̀ọ na ọ gaghị enwe ebe bara n’ime?

Sharon: Ọ ga-enwe.

Magret: Ọọ otú ahụ ka ọ dị n’ihe gbasara Adam na Iv. Mgbe ahụ ha họọrọ inupụrụ Chineke isi, e nwere ike ịsị na ha bịara nwee ntụpọ ma ọ bụ ebe kụkpọrọ akụkpọ n’ahụ́ ha, ya emezie ka ha bụrụ ndị mmehie na ndị na-ezughị okè. Ebe ọ bụkwa na ha emehiela tupu ha amụwa ụmụ, ụmụ ha niile ga-abụkwa ndị na-ezughị okè otú ha bụ. Ha niile ga-abụ ndị mmehie. Onye Baịbụl kpọrọ onye mmehie abụghị naanị onye mere mmehie n’onwe ya, kamakwa, onye butere mmehie n’ọmụmụ. Ihe a niile pụtara na n’agbanyeghị na mụ na gị emebeghị mmehie ọ bụla tupu a mụọ anyị, anyị abụrụlarị ndị mmehie. Adam na Iv bufeere ụmụ niile ha ga-amụta, ma mụ na gị, ezughị okè na mmehie nke ya na ọnwụ so aga. Ọ bụ ya mere Ndị Rom 6:23 ji sị na ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.

Sharon: Ma, ọ dịghịnụ mma. Olee otú ndị mmadụ ga-esi na-anwụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe Adam na Iv metere?

Magret: Ihe i kwuru bụ eziokwu, o nwechara otú ọ dị. Ma, Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi, o nwekwara ihe ọma o meere anyị. Ọ mara Adam na Iv ikpe ọnwụ maka njọ ha. Ma, o mere ka anyịnwa bụ́ ụmụ ha nwee olileanya. Ọ haziri otú anyị ga-esi pụta ná nsogbu a anyị nọ na ya. Ọ bụ àjà mgbapụta Jizọs ka o ji mee ya. Legodị anya ọzọ ná Ndị Rom 6:23. Mgbe e kwuchara na “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ,” e kwuziri, sị: “Ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” Ihe a gosiri na ọ bụ ọnwụ Jizọs mere ka anyị nwee olileanya isi n’aka mmehie na ọnwụ pụta. *

IHE MGBAPỤTA AHỤ BỤ ONYINYE KACHA MMA CHINEKE NYERE ANYỊ

Magret: E nwere ihe ọzọ e kwuru n’amaokwu a m ga-achọ igosi gị.

Sharon: Olee ihe ọọ?

Magret: Legodị ebe ahụ sịrị na “Onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” Ka m jụgodị gị, ebe ọ bụ Jizọs tara ahụhụ ma nwụchitere anyị ọnwụ, oleezi ihe mere amaokwu a ji sị na àjà a Jizọs chụrụ bụ “onyinye nke Chineke na-enye”? Gịnị mere ọ sịghị na ọ bụ “onyinye nke Jizọs na-enye”? *

Sharon: Hmm. Amaghịkwa m oo.

Magret: Ị manụ na ọ bụ Chineke kere Adam na Iv, ọ bụkwa ya ka ha mehiere mgbe ahụ ha riri mkpụrụ osisi ọ sịrị ha erila. Ọ ga-abụrịrị na o wutere ya nke ukwuu mgbe mmadụ abụọ mbụ o kere nupụụrụ ya isi. Ma, Jehova kwukwara ozugbo ahụ otú ọ ga-esi edozi nsogbu ahụ. * Ọ haziri ka otu n’ime ndị mmụọ ozi ya bịa n’ụwa, bie ndụ ka mmadụ zuru okè, ma mechaa jiri ndụ ya gbapụta anyị. Ọ bụ ya mere ihe mgbapụta ahụ ji bụrụ onyinye si n’aka Chineke. O nwekwara ihe ọzọ mere o ji bụrụ onyinye si n’aka Chineke. Ì chetụla otú obi dị Chineke mgbe ahụ e gburu Jizọs?

Sharon: Mba, echetụbeghị m ya.

Magret: Ihe ụmụaka ji egwu egwu juru ebe a. Ọ dị ka ì nwere ụmụaka.

Sharon: Ee, eji m ụmụ abụọ, otu nwoke na otu nwaanyị.

Magret: Otú a i nwere ụmụ, chegodị otú obi ga-adị Jehova ka ọ nọ n’eluigwe na-ele ka e jidere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, jiri ya na-eme ihe ọchị, na-eti ya ihe, ma mechaa kpọgide ya n’elu osisi ka ọ nọrọ ebe ahụ nwụọ.

Sharon: Chaị, ọ ga-abụrịrị na o wutere ya.

Magret: Ọọ ya. Ma, o nweghị onye n’ime anyị nwere ike ikwu kpọmkwem otú obi dị Chineke n’ụbọchị ahụ. Ma, anyị ma na o wutere ya, anyị makwa ihe mere o ji gba nkịtị ka e mee Ọkpara ya ụdị ihe ahụ. E kwuru ihe mere o ji gba nkịtị na Jọn 3:16. Gụtụnụ ebe ahụ.

Sharon: Ọ dị mma. Ebe ahụ sịrị: “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”

Ihe mgbapụta ahụ bụ otú kachanụ Chineke si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya

Magret: I meela. Leekwa anya ọzọ ná mbido amaokwu ahụ. Ọ sịrị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya.” Ọ bụ ịhụnanya mere Chineke ji gba nkịtị ka e gbuo Ọkpara ya. Ọ bụ ịhụnanya mere Chineke ji zite Ọkpara ya ka ọ bịa n’ụwa nwụọ maka anyị. N’eziokwu, ihe mgbapụta ahụ bụ otú kachanụ Chineke si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụ ihe ọma a Chineke meere anyị ka Ndịàmà Jehova na-ezukọ kwa afọ na-echeta n’ụbọchị dabara n’ụbọchị ahụ Jizọs nwụrụ. Amaghị m ma ihe ndị a ò doola gị anya ugbu a.

Sharon: Ee, o doola m anya. I meela maka iwepụta oge kọwaara m ha nke ọma.

Ò nwere ihe gbara gị gharịị ị na-achọ ịma ihe Baịbụl kwuru gbasara ya? Ò nwere ihe Ndịàmà Jehova na-eme ma ọ bụ ihe ha na-akụzi ị chọrọ ịmatakwu gbasara ya? Ọ bụrụ na e nwere, biko, gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ gbasara ya. Obi ga-adị ya ụtọ ka gị na ya kwurịta ihe ahụ.

^ para. 5 Ndịàmà Jehova na-ezukọ kwa afọ echeta ọnwụ Jizọs. N’afọ a, ha ga-echeta ọnwụ Jizọs na Fraịdee, abalị atọ n’ọnwa Eprel.

^ para. 32 N’isiokwu ọzọ ga-agba n’isiokwu a bụ́ “Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Nwere Ike Ịkparịta,” anyị ga-akọwa otú àjà mgbapụta Jizọs si mee ka anyị nwee olileanya isi n’aka mmehie pụta, nakwa ihe anyị ga-emerịrị ka àjà mgbapụta Jizọs baara anyị uru.

^ para. 36 Baịbụl gwara anyị na Chineke na Jizọs abụghị otu onye. Ị chọọ ịmatakwu gbasara nke a, gụọ isi nke 4 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.