Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ị̀ GA-ACHỌ ỊMỤ BAỊBỤL?

Otú Ndịàmà Jehova na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl

Otú Ndịàmà Jehova na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl

E ji ịgbasa ozi ọma mara Ndịàmà Jehova. Ma, ị̀ ma na n’ebe niile n’ụwa, anyị na ndị mmadụ na-amụ Baịbụl?

N’afọ 2014, Ndịàmà Jehova dị ihe karịrị nde mmadụ asatọ, ha bikwa n’ihe karịrị narị mba abụọ na iri anọ. Ha na ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ nde mmadụ itoolu na narị puku mmadụ ise mụrụ Baịbụl kwa ọnwa. * E nwere ihe dị ka otu narị mba na iri anọ ọnụ ọgụgụ ndị anyị na ha na-amụ Baịbụl karịrị ndị bi na nke ọ bụla n’ime ha.

N’afọ ọ bụla, Ndịàmà Jehova na-ebipụta Baịbụl, akwụkwọ, magazin, na ihe ndị ọzọ ha ji akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ha na-ebipụta ihe ndị a ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu ijeri na narị nde ise. Ha na-ebipụtakwa ha n’ihe dị ka narị asụsụ asaa. Otú a ha si agba mbọ ebipụta ọtụtụ akwụkwọ n’ọtụtụ asụsụ na-eme ka ọ dịrị ọtụtụ ndị mfe ịmụ Baịbụl n’asụsụ ọ bụla ha chọrọ.

AZỊZA AJỤJỤ NDỊ MMADỤ NA-AJỤKARỊ GBASARA OTÚ NDỊÀMÀ JEHOVA SI AMỤ BAỊBỤL

Olee otú unu na ndị mmadụ si amụ Baịbụl?

Anyị na-ahọrọ otu isiokwu ma leba anya n’amaokwu Baịbụl ndị kwuru gbasara isiokwu ahụ. Iji maa atụ, Baịbụl zara ajụjụ ndị dị ka: Ònye bụ Chineke? Olee ụdị onye ọ bụ? Ò nwere aha? Ebee ka o bi? Anyị na Chineke ò nwere ike ịdị ná mma? Ihe na-esiri ụfọdụ ndị ike bụ ịmata ebe azịza ajụjụ ndị a dị na Baịbụl.

Anyị na-ejikarị akwụkwọ a na-akpọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? enyere ndị mmadụ aka ịmata azịza ajụjụ ndị a na Baịbụl. * A haziri akwụkwọ a otú ọ ga-enyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe ndị dị na Baịbụl. E dere ihe gbasara Chineke, Jizọs Kraịst, mbilite n’ọnwụ, ihe mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ, otú e si ekpe ekpere, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ n’akwụkwọ a.

Olee ebe a na-anọ amụ ihe a, oleekwa oge a na-amụ ya?

A ga-anọ n’ebe ọ bụla dị gị mma nakwa n’oge ị chọrọ.

Awa ole ka ọmụmụ ihe a na-ewe?

Anyị na ọtụtụ ndị na-eji ihe dị ka otu awa amụ Baịbụl kwa izu. Ma, ọ bụghị iwu na ọ ga-eru otu awa. Ọ bụ mgbe ị chọrọ ka a mụruo ya ka anyị ga-amụru ya. Anyị na ụfọdụ ndị na-amụ ihe naanị nkeji iri ma ọ bụ nkeji iri na ise kwa izu.

Ego ole ka a na-akwụ maka ọmụmụ ihe a?

Anyị anaghị ana mmadụ ego maka ịmụrụ ya ihe, o nweghịkwa onye anyị na-asị kwụọ ụgwọ akwụkwọ anyị na ya ji amụ ihe. Ihe a anyị na-eme dabara n’ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya. Ọ gwara ha, sị: “Unu natara n’efu, na-enyenụ n’efu.”—Matiu 10:8.

Afọ ole ka ọmụmụ ihe a na-ewe?

E nweghị afọ ole a kapịrị ọnụ. Ọ bụ gịnwa ga-ekpebi mgbe ị chọrọ ka anyị na gị mụruo ya. E nwere isiokwu iri na itoolu n’akwụkwọ anyị bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ị chọọ, i nwere ike ịmụcha isiokwu ahụ niile ma ọ bụkwanụ gị amụọ ụfọdụ n’ime ha. Anyị na gị ga-eji nwayọọ nwayọọ na-amụ isiokwu nke ọ bụla otú ọ na-agaghị enye gị nsogbu.

Ọ̀ bụ iwu na m ga-ekweta ịghọ Onyeàmà Jehova?

Mba. Anyị anaghị amanye onye ọ bụla ikweta n’ihe anyị na ya na-amụ. Ma, ọ bụrụ na mmadụ aghọta ihe Baịbụl na-akụzi, ọ ga-enyere onye ahụ aka ịma ihe o kwesịrị ime.

Olee otú m ga-esi matakwuo ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi?

Ị gaa na www.dan124.com/ig, ị ga-ahụ ọtụtụ ihe Ndịàmà Jehova kweere nakwa ihe dị iche iche ha na-eme.

Olee otú m ga-esi agwa unu na m chọrọ ka unu bịa mụwara m Baịbụl?

  • Gaa na www.dan124.com/ig. I lee anya n’ala ala, ị ga-ahụ ebe e dere “Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl.” Ị pịa ya, ị ga-ahụ fọm ị ga-eji gwa anyị ka anyị na gị mụwa Baịbụl.

  •  
  • I nwekwara ike ịgwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ na ị ga-achọ ka a bịa mụwara gị Baịbụl.

^ para. 4 Anyị na-amụrụ ndị mmadụ ihe n’otu n’otu. Ma, o nwekwara mgbe anyị na-amụrụ mmadụ abụọ ma ọ bụ karịa ihe n’otu mgbe.

^ para. 9 Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. E bipụtala ya ihe karịrị narị nde abụọ na nde iri atọ nakwa n’asụsụ narị abụọ na iri isii.