Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke 2016

Gụọ gbasara ozi ọma Ndịàmà Jehova ziri n’ụwa niile n’afọ 2015 nakwa otú ha si malite izi ozi ọma n’Indoneshia.

Isiokwu Afọ 2016

Ná Ndị Hibru 13:1, a gbara Ndị Kraịst ume, jaakwa ha mma.

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Ihe a kọrọ ebe a gosiri otú jw.org, Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova, idosa akwụkwọ anyị n’ebe na-ekwo ekwo, nakwa Mgbakọ Ukwu nke afọ 2015 siri baara anyị ezigbo uru.

“Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova Na-atọgbu Anyị Atọgbu”

Olee ihe ndị e megasịrị tupu Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova enwee isi?

Otú A Ga-esi Na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze Ngwa Ngwa

A hazigharịala otú a ga na-esi arụ ụlọ Nzukọ Alaeze ka e nwee ike ịrụ ha ọtụtụ puku.

Olee Otú Ọrụ Si Na-aga na Wọwik?

Gụọ ihe a ka ị hụ otú ọrụ si na-aga n’ike n’ike n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova.

Izi Ndị Ọ Na-esi Ike Inweta n’Ụlọ Ozi Ọma

Olee ihe mere Terry ji kwere na ihe Ndịàmà Jehova gwara ya bụ otú Chineke si za ya ekpere?

Ìhè Na-enwusikwu Ike

N’ebe a, ị ga-ahụ otú Jehova si eme ka ìhè nwukwuo n’okporo ụzọ ndị na-efe ya.

Alaka Ụlọ Ọrụ Ndị E Nyefere Jehova

Ihe ọma meere Ndịàmà Jehova nọ na Madagaska na Indoneshia ná mmalite afọ 2015.

Asụsụ Ndị Ọhụrụ E Nwere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

E wepụtakwuru ya n’asụsụ iri na isii n’afọ ije ozi 2015.

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova

A ka na-emeso Ndịàmà Jehova mmeso ọjọọ n’ụwa niile.

Ihe Ndị Mere n’Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa

Ego a hụrụ n’igbe Ken nyere aka mgbe a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze.

Afrịka

Olee ụzọ ọhụrụ Ndịàmà Jehova ji na-ezi ndị mmadụ ozi ọma?

Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu

Gịnị mere otu nwaanyị ji jiri kandụl na-amụ Baịbụl n’ọhịa? Gịnị mere otu nwoke na-eme na-akpa ike ji na-eche Ndịàmà Jehova? Gịnị mere otu onye na-emesibu Ndịàmà Jehova ike ji bee ákwá?

Eshia

O nweghị ihe nwere ike igbochi Ndịàmà Jehova izi ozi ọma, ma ọrịa ma ịtụ ha mkpụrụ.

Yurop

Ahụ́ bịara ruo otu nwoke onye Roma ala mgbe e ziri ya ozi ọma, ruokwa otu onye mkpọrọ, nakwa otu nwaanyị chọrọ igbu onwe ya.

Mba Ndị Dị n’Oké Osimiri Pasifik

E ji tebụl e dosara akwụkwọ anyị na ya, ihe a na-akwagharị akwagharị, jw.org na vidio anyị akụ mkpụrụ eziokwu n’obi narị mmadụ, nakwa n’obi ọtụtụ puku mmadụ.

Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Indoneshia

Indoneshia bụ obodo kacha nwee agwaetiti n’ụwa. Gụọ gbasara otú ala ya dị, ndị bi na ya, na omenala ha.

Ịzụ na Ire Ihe Ndị Na-eme Ka Nri Tọọ Ụtọ

N’ihe dị ka narị afọ ise gara aga, ihe na-eme ka nri tọọ ụtọ a na-azụ ma na-ere n’ebe dị iche iche n’ụwa mere ka ọtụtụ mba nwee ego.

Ọ Bụ Ebe A Ka M Chọrọ Ibido

Ndị kọpọtụa ole na ole na-anaghị atụ egwu sí Ọstrelia diri nsogbu ndị bịaara ha mgbe ha na-ezi ozi ọma.

Ụzọ Ndị E Si Kwusaa Ozi Ọma n’Oge Mbụ

Ozi ọma anyị ji redio zie na nke anyị ziri n’ọdụ ụgbọ mmiri gbawara ndị Indoneshia ọnụ na-eru n’okwu na-achọghị iji anya ahụ anyị obi.

Ndị Bibelkring

Ndị malitere òtù okpukpe a ji ihe ha gụtara n’akwụkwọ Ndịàmà Jehova malite ya, ma o mechara daa n’ihi na ha ji echiche mmadụ eduzi ya.

O Ji Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe

Ndị na-eme ara ara wabatara n’ụlọ Nwanna Thio Seng Bie buru ngwongwo ya ma o nweghị ihe o mere ha. Ma e nwere ihe kacha ya mkpa ha na-ewereghị.

Ọtụtụ Ndị Abata n’Ọgbakọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Java

Ndịàmà Jehova ji akọ na-ezi ozi ọma mgbe ndị ọchịchị ji nwayọọ nwayọọ machibido akwụkwọ ha iwu.

Mgbe Ndị Agha Japan Weghaara Indoneshia

N’oge a na-alụ Agha Ụwa nke Abụọ, ụfọdụ Ndịàmà Jehova chepụtara otú ha ga-esi edeba aha n’akwụkwọ ndị ọchịchị Japan ma ya abụrụ na ha etinyeghị aka n’agha.

Onye Ọsụ Ụzọ Na-anaghị Atụ Egwu

N’afọ iri isii o ji jeere Jehova ozi, Nwanna André Elias kwụsiri ike n’okwukwe ya mgbe a na-agba ya ajụjụ na mgbe e yiri ya egwu ọnwụ.

Ndị Ozi Ala Ọzọ Gara Ụlọ Akwụkwọ Gilied Abịa n’Indoneshia

Ndị ozi ala ọzọ mbụ bịara n’Indoneshia mere ka e kwusaa ozi ọma n’ebe niile n’Indoneshia ngwa ngwa.

E Kwusaa Ozi Ọma Ruo n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Indoneshia

Ndị ụkọchukwu hà ga-emecha mee ka anyị kwụsị ikwusa ozi ọma?

E Zitekwuru Ndị Ozi Ala Ọzọ

N’agbata afọ 1971 na afọ 1979, izi ndị mmadụ ozi ọma bịara sikwuo ike.

Ezigbo Nwa Sera

Otú Nwanna Nwaanyị Titi Koetin si nọrọ n’okpuru di ya mere ka di ya bata n’ọgbakọ.

Mgbakọ A Na-agaghị Echefu Echefu

Mgbakọ “Ozi Ọma Ebighị Ebi” e mere n’afọ 1963 gara nke ọma n’agbanyeghị ihe ndị gaara egbochi ya.

Tigbuo Zọgbuo Ndị Kọmunist Kpatara Ataghị Isi M

E gwuru ili Nwanna Ronald Jacka mgbe ọ ka dị ndụ.

M Bụ Ọsụ Ụzọ Pụrụ Iche Afọ Iri Ise

N’afọ 1964, onyeisi chọọchị Protestant ji iwe kwuo, sị, ‘M na-aga ime ka a ghara ịhụ otu mkpụrụ Onyeàmà Jehova n’obodo a!’ Ò meliri ihe a o kwuru?

Abụbu M Onyeisi Ndị Omempụ, Ma Abụzi M Ezigbo Nwa Amaala

Otu onye ọnụ na-eru n’okwu jụrụ otu nwanna, sị: “Gịnị n’eziokwu ka Ndịàmà Jehova na-eme n’Indoneshia?”

Ụmụnna Anyị Kpebisiri Ike Ịna-ekwusa Ozi Ọma

Olee ihe mere ụfọdụ ndị ji kwuo, sị, “Ndịàmà Jehova dị ka ntu”?

Ha Akwụsịghị Ịna-enwe Ọmụmụ Ihe

Mgbe e wepụrụ iwu ahụ a machibidoro Ndịàmà Jehova, otu onye ọnụ na-eru n’okwu na gọọmentị, sịrị: “Ọ bụghị akwụkwọ a e debanyere aha okpukpe unu na ya nyere unu ikike ikpe okpukpe unu.”

Ha Gbataara Ụmụnna Ha Ọsọ Enyemaka n’Oge Ọdachi

Ndịàmà Jehova gbataara ụmụnna ha ọsọ enyemaka ozugbo ala ọma jijiji kpara ike ọjọọ n’obodo Gunungsitoli, nke dị n’Indoneshia.

Anyị Ekweghị Emebi Iwu Chineke

Nwanna Daniel Lokollo chetara otú ndị na-eche ya nche n’ụlọ mkpọrọ si mesie ya ike.

Anyị Mere Ihe A Gwara Anyị ma Dịrị Ndụ

Esemokwu ndị Alakụba na Ndị Kraịst mere ka Ndịàmà Jehova gbaa ọsọ ndụ.

Ozi Ọma Ebiri Ọkụ

E nwere ihe atọ baara ụmụnna anyị uru mgbe e wepụrụ iwu ahụ a machibidoro ha.

Ịgwa Ndị Mmadụ Aha Jehova n’Atụghị Egwu

Olee otú Ndịàmà Jehova nọ n’Indoneshia si mụta iji obi ike na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị ihe ndị mere ka o siere ha ike ime otú ahụ?

Alaka Ụlọ Ọrụ Dị́ ná Nnukwu Ụlọ Elu

Ndị na-achọ ebe ha ga-aga zie ozi ọma achọtala ya.

Jehova Gọziri Anyị Karịa Ka Anyị Tụrụ Anya Ya

Jehova gọziri ọgbakọ dị na Tugala, nke dị n’Indoneshia, otú ha na-atụghị anya ya.

Mụ na Nwanne M Mechara Mata

E kegara ụmụnne abụọ bụ́ ndị ogbi mgbe ha ka na-eto eto. A kpọnyere otu n’ime ha onye ọzọ ka o jiri ya mere nwa, ma eziokwu mere ka ha bikọta ọnụ.

Ihe Ndị Mere n’Otu Narị Afọ Gara Aga, Ya Bụ, n’Afọ 1916

Ihe ndị mere ná ngwụcha afọ 1916 dị Ndị Mmụta Baịbụl mkpa.

Ngụkọta Ọnụ Ọgụgụ Niile E Nwere n’Afọ 2015

Olee mbọ anyị gbara na ego ole anyị mefuru iji kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke?

E Mere Ncheta Ọnwụ Jizọs na Fraịdee, Eprel 3, 2015

Òkù e ji izu anọ kpọọ ndị mmadụ mere ka ọtụtụ ndị bịa.