Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

INDONESHIA

M Bụ Ọsụ Ụzọ Pụrụ Iche Afọ Iri Ise

Alisten Lumare

M Bụ Ọsụ Ụzọ Pụrụ Iche Afọ Iri Ise
  • A MỤRỤ YA N’AFỌ 1927

  • E MERE YA BAPTIZIM N’AFỌ 1962

  • ONYE Ọ BỤ Ọ bụbụ onyeisi ndị uwe ojii ma mechaa bụrụ ọsụ ụzọ pụrụ iche ruo ihe karịrị afọ iri ise.

N’AFỌ 1964, aghọrọ m ọsụ ụzọ pụrụ iche. E zigakwara m na Manokwarị nke dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Papụa ka m na-eje ozi. E nwere obere ọgbakọ n’ebe ahụ. Ndị ụkọchukwu nọ́ ebe ahụ na-enyekwa ụmụnna anyị nsogbu. Obere oge m kwatara na Manokwarị, onyeisi chọọchị Protestant ji iwe bịa n’ụlọ m, sị m:

“M na-aga ịkụtu ụlọ a, meekwa ka a ghara ịhụ otu mkpụrụ Onyeàmà Jehova n’obodo a.”

Ebe m bụbu onye uwe ojii, mba ahụ ọ bara atụghị m ụjọ. Ma, m medara obi gwa ya okwu, ya ejiri nwayọọ laa.—1 Pita 3:15.

N’oge ahụ, e nwere naanị ndị nkwusa asatọ na Manokwarị. Ugbu a ihe dị ka afọ iri ise gacharala, e nwere ọgbakọ asaa na ya. Ihe karịrị otu puku mmadụ na narị abụọ bịara mgbakọ ukwu anyị n’afọ 2014. Mgbe m hụrụ otú Jehova sirila gọzie anyị n’ebe a bụ ime obodo, obi na-abụ m sọ aṅụrị.