Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebe ụmụnna anyị na-enwe mgbakọ n’oge a machibidoro ha iwu. Ụfọdụ nọ n’ụgbọ mmiri na-ege ihe a na-ekwu

INDONESHIA

Ụmụnna Anyị Kpebisiri Ike Ịna-ekwusa Ozi Ọma

Ụmụnna Anyị Kpebisiri Ike Ịna-ekwusa Ozi Ọma

Mgbe ụmụnna anyị nụrụ na a machibidola anyị iwu, ha mere ihe. Nwanna Ronald Jacka kwuru ihe ha mere. Ọ sịrị: “Anyị zoro akwụkwọ alaka ụlọ ọrụ dere ihe ndị dị mkpa na ha n’ebe dị iche iche na Jakata. Anyị zokwara akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Baịbụl nakwa ego alaka ụlọ ọrụ. Anyị kwapụziri n’alaka ụlọ ọrụ ahụ kwaga ebe ndị ọzọ na-amaghị. Anyị rekwara alaka ụlọ ọrụ anyị na nzuzo.”

Ọtụtụ ụmụnna anyị ndị Indoneshia nọgidere na-ekwusa ozi ọma n’atụghị ụjọ. Ha ediela ọtụtụ nsogbu bịaara ha tupu a machibido anyị iwu. Ha akwụsịghịkwa ịtụkwasị Jehova obi. Ma, e nwere ụfọdụ ụmụnna anyị iwu ahụ a machibidoro anyị kpara aka ọjọọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị okenye tụrụ ụjọ ma bịanye aka n’akwụkwọ ha ji kweta ịkwụsị ikwusa ozi ọma. Ndị ọzọ gwara ndị ọchịchị aha ụmụnna ha na ha nọ n’ọgbakọ. Alaka ụlọ ọrụ zigara ụmụnna anyị ụfọdụ ka ha gaa n’ọgbakọ dị iche iche mee ka okwukwe ụmụnna anyị sikwuo ike, nyekwara ndị nke kwuru na ha agakwaghị na-ekwusa ozi ọma aka. Nwanna John Booth, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, bịakwara n’Indoneshia gbaa ụmụnna anyị ume otú nna si agba ụmụ ya ume.

O doro anya na Jehova, bụ́ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu anyị, na-akasi ndị na-efe ya obi, na-emekwa ka okwukwe ha sikwuo ike. (Ezik. 34:15) Ndị okenye malitere inyekwuru ụmụnna anyị aka. Ndị nkwusa chọpụtakwara ụzọ ọhụrụ ha ga-esi na-ezi ozi ọma na nzuzo. (Mat. 10:16) Ọtụtụ ụmụnna anyị gara n’ụlọ ọrụ na-ebipụta Baịbụl n’Indoneshia zụrụ Baịbụl na-adịghị oké ọnụ ma nye ha ndị ha gara na nke ha. Ha na-ejikwa akọ ezi ha ozi ọma Alaeze Chineke mgbe ọ bụla o kwere ha mee. Ndị ọzọ na-ewere akwụkwọ anyị dọkapụ peeji e dere aha ndị bipụtara ya ma nye ha ndị nwere mmasị. Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ nọgidere na-aga n’ụlọ ndị mmadụ ezi ha ozi ọma. Otú ha si eme ya bụ na ha bịa n’ụlọ mmadụ, ha emee ka hà chọrọ iresị onye ahụ ihe ma si otú ahụ zie ya ozi ọma. Ọ bụkwa ihe a ka ụmụnna anyị mere n’oge ahụ ndị agha Japan weghaara Indoneshia.

Nwanna Nwaanyị Margarete na di ya Norbert Häusler

N’afọ 1977, Ngalaba Na-ahụ Maka Okpukpe mekwara ihe ọzọ iji mesie Ndịàmà Jehova ike. Ha jụrụ ịgbatịkwu oge e nyere ndị ozi ala ọzọ anyị ịnọ n’Indoneshia. Nke a mere ka e si n’Indoneshia zipụ ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ ná mba ndị ọzọ. * Nwanna Norbert Häusler, bụ́ onye ya na nwunye ya Margarete, jere ozi ala ọzọ na Mando, nke dị n’Ebe Ugwu Sulawesi, kwuru ihe merenụ. Ọ sịrị: “Ọtụtụ narị ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwaanyị bịara n’ọdụ ụgbọelu iji sị anyị gaa nke ọma. Mgbe anyị rutere na steepụ ụgbọelu ahụ lee anya n’azụ, anyị hụrụ ka ọtụtụ ìgwè mmadụ na-efere anyị aka ma jiri olu ákwá na-asị anyị, ‘Unu emeela. Unu emeela bịa n’obodo anyị.’ Anyị banyere ụgbọelu ahụ ma bee ezigbo ákwá.”

Ọgba Aghara E Nwere na Sumba

Mgbe ozi bịara ruo ebe niile na a machibidola Ndịàmà Jehova iwu, Òtù Chọọchị Niile E Nwere n’Indoneshia gwara ndị òtù ha na ha hụ ebe Onyeàmà Jehova na-ezi mmadụ ozi ọma, ha mee ka ndị ọchịchị mara. Nke a mere ka a nwụchiwe ụmụnna anyị aghara aghara n’ọtụtụ agwaetiti ma na-agba ha ajụjụ.

Na Waịngapu, bụ́ nke dị n’agwaetiti Sumba, onyeisi ndị amị kpọrọ ụmụnna iri abụọ na atọ ka ha wụchaa n’ogige ndị amị. Mgbe ha bịara, ọ gwara ha bịanye aka n’akwụkwọ ha ga-eji ekweta na ha abụkwaghị Ndịàmà Jehova. Mgbe ha jụrụ ịbịanye aka, ọ gwara ha lawa ma bịaghachi echi ya n’agbanyeghị na ha ga-eji ụkwụ gaa kilomita iri na anọ uje na ụla.

Mgbe ụmụnna anyị laghachiri n’isi ụtụtụ echi ya, a kpọrọ ha otu otu ma gwa ha bịanye aka n’akwụkwọ ahụ. Ọ bụrụ na nwanna a kpọrọ ajụ, ndị amị na-eji osisi bụ́ ogwu ogwu kụọ ya. Ndị amị ahụ kụrụ ụmụnna anyị ezigbo ihe, kụọkwa ụfọdụ n’ime ha ihe, ha atụbọọ. A kụwa otu onye ihe, ụmụnna anyị ndị ọzọ na-anọ chere ka a kpọọ ha bịa bịanye aka n’akwụkwọ. N’ikpeazụ, otu nwanna nwoke na-eto eto aha ya bụ Mone Kele pụtara dee ihe n’akwụkwọ ahụ. Obi wụnyere ụmụnna anyị n’afọ mgbe ọ na-ede ihe ahụ. Mgbe o dechara, obi gbawara onyeisi ndị amị ahụ n’ihi na o dere na ya chọrọ ịbụ Onyeàmà Jehova ruo mgbe ebighị ebi. A kụrụ Mone ihe, merụọkwa ya ahụ́ nke na e bu ya ebu gaa ụlọ ọgwụ. N’agbanyeghị ihe a e mere ya, ọ kwụsịghị ịbụ Onyeàmà Jehova.

Onyeisi ndị amị ahụ mere ihe niile o nwere ike ime ruo abalị iri na otu ka ụmụnna anyị kwuo na ha abụkwaghị Ndịàmà Jehova. Ọ gwara ha guzoro n’oké anwụ si n’ụtụtụ ruo ná mgbede. Ọ manyere ha ka ha gbere igbe gaa ọtụtụ kilomita. Ọ gwakwara ha buru ihe na-anyị arọ n’isi gbaa ọsọ. Ọ mịpụtara mma tụgide ha ya n’akpịrị ma gwa ha kelee ọkọlọtọ. Ma, ụmụnna anyị ekweghị. N’ihi ya, ọ gwara ndị amị ya ka ha kụkwuo ha ihe.

N’ụtụtụ ọ bụla, n’agbanyeghị na ike gwụchara ụmụnna anyị, ha na-aga n’ogige ndị amị ahụ. Mgbe ha na-aga, ha na-eche ihe e nwere ike ime ha n’ụbọchị ahụ. Ha na-ekpekwa ekpere n’ụzọ ma gbaa ibe ha ume ka ha nọsie ike n’okwukwe. Kwa abalị ha na-ala, ahụ́ na-abụ ha ọbara ọbara. Ma, obi na-atọ ha ụtọ n’ihi na ha ahapụghị Jehova.

Mgbe ụmụnna anyị nọ n’alaka ụlọ ọrụ anyị nụrụ na onyeisi ndị amị ahụ na-emekpọ ụmụnna anyị ọnụ, ha zigaara onyeisi ndị amị nọ na Waịngapu ozi, zigakwara onye nke nọ na Timọ na onye nke nọ na Bali. Ha zigakwaara onyeisi ha kachanụ nọ na Jakata na ndị ọzọ ọnụ na-eru n’okwu na gọọmenti ozi. Mgbe onyeisi ndị amị ahụ matara na akụkọ ihe ọ na-eme agazuola ebe niile n’Indoneshia, ọ kwụsịrị imekpọ ụmụnna anyị ọnụ.

“Ndịàmà Jehova Dị Ka Ntu”

N’afọ ndị na-esonụ, a nwụchiri ọtụtụ ụmụnna anyị n’ebe niile n’Indoneshia, gbaa ha ajụjụ, ma kụọ ha ihe. Onye ozi ala ọzọ aha ya bụ Bill Perrie kwuru, sị: “N’otu obodo, a kụpụrụ ọtụtụ ụmụnna anyị ezé ihu. Mgbe ụmụnna anyị hụrụ nwanna ka nwere ezé ihu, ha na-ajụ ya, sị, ‘Ị̀ bụ onye ọhụrụ ka ị̀ na-ekweta na ị bụkwaghị Onyeàmà Jehova?’ N’agbanyeghị ihe ndị a na-eme ụmụnna anyị, ha ka na-enwe obi ụtọ, jirikwa obi ha niile na-ejere Jehova ozi.”

“Mkpọrọ m nọrọ akụzierela m ịtụkwasikwu Jehova obi. O meekwala ka okwukwe m sikwuo ike”

A gụkọta ụmụnna anyị ndị a tụrụ mkpọrọ n’ime afọ iri na atọ, ha dị iri itoolu na atọ. Ụfọdụ nọrọ ọnwa abụọ, ụfọdụ anọọ karịa, nweekwa ndị nọrọ afọ anọ. Ihe ndị e mere ha mere ka ha kpebisikwuo ike na ha agaghị ahapụ Jehova. Mgbe otu nwanna aha ya bụ Musa Rade nọchara mkpọrọ ọnwa asatọ, ọ gakwuuru ụmụnna ndị nọ n’obodo ya gbaa ha ume ka ha nọgide na-ekwusa ozi ọma. O kwuru, sị: “Mkpọrọ m nọrọ akụzierela m ịtụkwasikwu Jehova obi. O meekwala ka okwukwe m sikwuo ike.” Ka a sịkwa ihe mere ndị mmadụ ji kwuo, sị: “Ndịàmà Jehova dị ka ntu. Ị na-akụ ntu n’ihe, ntu ahụ ana-abakwu n’ime. Ị na-emekpọ Ndịàmà Jehova ọnụ, ha ana-esikwu ike n’okwukwe.”

Ebe ndị nkwusa ji ụgbọ mmiri na-aga ikwusa ozi ọma n’Ambọn dị́ na Maluku

^ para. 1 Ndị ozi ala ọzọ jerela ozi ọtụtụ afọ aha ha bụ Peter Vanderhaegen na Len Davis akarịala afọ iri isii mgbe ahụ, n’ihi ya, e zipụghị ha. E zipụghịkwa Nwanna Nwaanyị Marian Tambunan (onye a na-akpọbu Stoove) n’ihi na ọ lụrụ onye Indoneshia. Ha atọ kwụsiri ike n’ọgbakọ, nọgidekwa na-eje ozi n’Indoneshia n’oge niile ahụ a machibidoro anyị iwu.