Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bolivia: Ebe a na-arụrụ ndị nsụgharị Aymara ọfis ndị nsụgharị n’El Alto

Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga

Ihe Ndị E Mere n’Afọ Gara Aga

MGBE Aịzaya na-akọwa ihe Chineke ga-eji Alaeze ya mezuo, o kwuru n’Aịzaya 9:7, sị: “Ekworo Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-emezu ihe a.” Jizọs Kraịst, bụ́ Eze nke Alaeze ahụ, kwokwara ekworo maka ofufe Chineke n’oge niile o jere ozi n’ụwa. Nke a pụtara na o ji ịnụ ọkụ n’obi jeere Jehova ozi. (Jọn 2:17) Ihe ndị anyị na-aga ịkọ ugbu a na-egosi otú Ndịàmà Jehova n’ụwa niile si anụ ọkụ n’obi ka Jehova na Jizọs. Otú ha si eme ya bụ inyere ndị mmadụ aka ka ha mara na Nna ha nke eluigwe hụrụ ha n’anya.

El Salvadọ: Mgbakọ ukwu nke afọ 2015

NÁ NKEBI A

“Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova Na-atọgbu Anyị Atọgbu”

Olee ihe ndị e megasịrị tupu Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova enwee isi?

Otú A Ga-esi Na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze Ngwa Ngwa

A hazigharịala otú a ga na-esi arụ ụlọ Nzukọ Alaeze ka e nwee ike ịrụ ha ọtụtụ puku.

Olee Otú Ọrụ Si Na-aga na Wọwik?

Gụọ ihe a ka ị hụ otú ọrụ si na-aga n’ike n’ike n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova.

Izi Ndị Ọ Na-esi Ike Inweta n’Ụlọ Ozi Ọma

Olee ihe mere Terry ji kwere na ihe Ndịàmà Jehova gwara ya bụ otú Chineke si za ya ekpere?

Ìhè Na-enwusikwu Ike

N’ebe a, ị ga-ahụ otú Jehova si eme ka ìhè nwukwuo n’okporo ụzọ ndị na-efe ya.

Alaka Ụlọ Ọrụ Ndị E Nyefere Jehova

Ihe ọma meere Ndịàmà Jehova nọ na Madagaska na Indoneshia ná mmalite afọ 2015.

Asụsụ Ndị Ọhụrụ E Nwere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

E wepụtakwuru ya n’asụsụ iri na isii n’afọ ije ozi 2015.

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova

A ka na-emeso Ndịàmà Jehova mmeso ọjọọ n’ụwa niile.

Ihe Ndị Mere n’Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa

Ego a hụrụ n’igbe Ken nyere aka mgbe a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze.